Ndị Rom 12:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Kwụsịkwanụ ịna-eme omume otú ndị oge a* si eme, kama gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche,+ ka unu wee chọpụta+ ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ. 1 Ndị Tesalonaịka 4:3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 N’ihi na ihe Chineke chọrọ bụ ka unu na-adị nsọ+ ma ghara ịna-akwa iko.*+ 1 Pita 4:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Ọ ga-eme ka onye ahụ na-eme uche Chineke+ mgbe ọ dị ndụ, ma kwụsị ịna-eme ihe na-agụ mmadụ agụụ.+
2 Kwụsịkwanụ ịna-eme omume otú ndị oge a* si eme, kama gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche,+ ka unu wee chọpụta+ ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.