50 Nnu dị mma. Ma, ọ bụrụ na nnu anaghịzi atọ ka nnu, gịnị ka unu ga-eji mee ka ọ tọwakwa ka nnu?+ Nweenụ nnu n’ime onwe unu.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.”+
11 N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-emezikwanụ ebe ndị unu na-anaghị emetecha.* Na-ekwenụ ka a kasie unu obi.+ Nweenụ otu obi,+ na-ebikwanụ n’udo.+ Chineke nke udo,+ onye hụrụ anyị n’anya, ga-anọnyere unu.