7 Ihe mere ọnwụnwa ndị a ji bịara unu bụ ka a mara na okwukwe unu siri ezigbo ike.+ Ụdị okwukwe a bara uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya. Ọ ga-emekwa ka e too unu, sọpụrụ unu, unu adịkwa ebube mgbe a ga-ekpughe Jizọs Kraịst.+