Mach
Tọzdee, Mach 1
Ha chụpụrụ Jefta.—Ikpe 11:2.
Anyaụfụ ụmụnne Jefta na-emere ya na asị ha kpọrọ ya mere ka ha chụpụ ya n’ala o kwesịrị iketa. (Ikpe 11:1-3) Ma, mgbe ha rịọrọ ya ka ọ bịa nyere ha aka, o mere otú ahụ. (Ikpe 11:4-11) Ịlụrụ aha Jehova na ndị ya ọgụ dị Jefta mkpa karịa otú obi dị ya. O kpebisiri ike ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ ya mere Jehova ji gọzie ya na ndị Izrel. (Hib. 11:32, 33) Ànyị ga-amụta ihe n’ihe Jefta mere? Gịnị ka anyị ga-eme ma ụmụnna anyị mee ihe wutere anyị, ma ọ bụ ma anyị chee na ihe ha mere anyị adịghị mma? Anyị ekwesịghị ikwe ka iwe na-ewe anyị mee ka anyị kwụsị ife Jehova. Akwụsịla ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ iso ọgbakọ na-akpakọrịta. Ka anyị mee ka Jefta ma rubere Jehova isi. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka imeri nsogbu ndị siri ike, ka anyị nwee ike ịbụ ndị e ji ama atụ.—Rom 12:20, 21; Kọl. 3:13. w16.04 1:7, 9, 10
Fraịdee, Mach 2
Anyị adịghị ada mbà.—2 Kọr. 4:1.
Anyị kwesịrị ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, ọ bụghị ruo naanị obere oge. Chegodị banyere ụgbọ mmiri ji nwayọọ nwayọọ na-ekpu. Ọ bụrụ na ndị nọ n’ime ya achọghị ịnwụ, ha ga-egwuru mmiri ruo n’akụkụ osimiri ahụ. Mmadụ daa mbà ozugbo o bidoro igwu mmiri ahụ, mmiri ga-eri ya. Ọ bụrụkwa na ike agwụ mmadụ ma ọ fọ obere ka o gwuruo n’akụkụ osimiri ahụ, mmiri ga-erikwa ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ, anyị kwesịrị ịna-atachi obi. Ka anyị nwee ụdị obi ahụ Pọl onyeozi nwere. Ọ sịrị: “Anyị adịghị ada mbà.” (2 Kọr. 4:16) Obi siri anyị ike otú o siri Pọl na Jehova ga-enyere anyị aka ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. Pọl dere, sị: “Anyị na-enwe mmeri n’ụzọ zuru ezu site n’aka onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya. N’ihi na ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Rom 8:37-39. w16.04 2:17, 18
Satọdee, Mach 3
Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, . . . ọ ga-enye onye ahụ amamihe.—Jems 1:5.
Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe ga-eme ka ị mata ihe nwere ike ime ka i tinyewe aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Rịọ ya ka o nyere gị aka ime ihe i kwesịrị ime ma ụdị ihe ahụ mee. E nwere ike ịtụ gị mkpọrọ ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ taa gị ahụhụ n’ihi na ị na-erubere Jehova isi. Ụdị ihe ahụ mee, rịọ Jehova ka o mee ka i nwee obi ike, ka i nwee ike ime ka ndị ọzọ ghọta ihe mere na ị gaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ịtachi obi. (Ọrụ 4:27-31) Jehova nyere anyị Baịbụl iji mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Na-atụgharị uche n’amaokwu ndị ga-enyere gị aka ka ị ghara itinye aka n’esemokwu ụwa a. Gbalịa ka i buru amaokwu ndị ahụ n’isi n’ihi na ha ga-enyere gị aka mgbe ị na-ejighị Baịbụl. Baịbụl nwekwara ike ime ka olileanya i nwere n’ihe Chineke kwere nkwa ime n’ọdịnihu sikwuo ike. Olileanya a na-enyere anyị aka ịna-atachi obi mgbe a na-emegide anyị. (Rom 8:25) Họrọ amaokwu ndị na-akọwa ihe ndị ị kacha atụ anya ime n’ụwa ọhụrụ, cheekwa otú ọ ga-adị gị ma ị nọrọ n’ụwa ọhụrụ. w16.04 4:14, 15
Sọnde, Mach 4
Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.—Mat. 10:8.
Ndị ụkọchukwu Krisendọm anaghị ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha kwuo banyere Alaeze Chineke, ọtụtụ n’ime ha na-asị na ọ bụ ihe dị n’obi Onye Kraịst. (Luk 17:21) Ha anaghị enyere ndị mmadụ aka ịghọta na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe, na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze ya, na ọ bụ ọchịchị ahụ ga-ewepụ nsogbu ụmụ mmadụ niile, nakwa na ọ ga-ewepụ ihe ọjọọ niile n’ụwa n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 19:11-21) Kama ime otú ahụ, ha na-ewere Jizọs ka nwa ọhụrụ n’oge Krismas, werekwa ya ka onye na-aga ịnwụ anwụ n’oge Ista. Ọ dị ka ha amaghị ihe Jizọs ga-arụ mgbe ọ ga na-achị ụwa. Ha amaghị ihe e kwesịrị ibu n’obi na-ekwusa ozi ọma a. O kwesịghị ịbụ ka e jiri ya kpatawa ego ma rụọ nnukwu ụlọ dị iche iche. E kwesịghị iji Okwu Chineke na-akpa ego. (2 Kọr. 2:17) Ndị na-ekwusa ozi ọma ekwesịghị ịna-achọ irite uru ego n’ozi ọma ha na-ekwusa.—Ọrụ 20:33-35. w16.05 2:7, 8
Mọnde, Mach 5
Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.—1 Kọr. 10:24.
Ka e were ya na e nwere otu ụdị uwe masịrị gị, ma ya abụrụ na ọ ga-akpasu ụfọdụ ndị nọ́ n’ọgbakọ iwe. Ma, o nwere ike ịbụ na o nweghị ebe ị ma Baịbụl kwuru ka a ghara iyi ụdị uwe ahụ. Olee otú ị ga-esi mata ihe Jehova chere? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Achọrọ m ka ụmụ nwaanyị jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị ịkpa ụdị isi dị iche iche na iji ọlaedo ma ọ bụ nkume pel chọọ onwe ha mma, ma ọ̀ bụ iji ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwaanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.” (1 Tim. 2:9, 10) Ihe a Pọl kwuru gbasakwara ụmụ nwoke bụ́ Ndị Kraịst. Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị na-achọ ịma ihe ndị ọzọ na-eche banyere uwe anyị, ọ bụghị naanị ihe dị́ anyị mma. Imeru ihe n’ókè na ịhụnanya ga-eme ka anyị na-echebara ihe na-amasị ụmụnna anyị echiche ka anyị ghara ịkpasu ha iwe ma ọ bụ mee ihe ga-ewute ha.—1 Kọr. 10:23; Fil. 3:17. w16.05 3:14
Tuzdee, Mach 6
Jehova, ị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ọ bụ gị kpụrụ anyị; anyị niile bụkwa ọrụ aka gị.—Aịza. 64:8.
Mgbe Adam nupụụrụ Onye kere ya isi, ọ bụghịzi nwa Chineke. Ma, kemgbe ọtụtụ afọ, e nweela “oké ìgwè ndị àmà,” bụ́ ụmụ Adam, ndị kpebiri ịna-erubere ọchịchị Chineke isi. (Hib. 12:1) Otú ha si na-erubere Chineke isi gosiri na ọ bụ ya ka ha chọrọ ka ọ bụrụ Nna ha na Onye na-akpụzi ha, ọ bụghị Setan. (Jọn 8:44) Isi ha na-erubere Chineke na-echetara anyị ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. N’oge anyị a, ndị niile na-efe Jehova n’ime mmụọ na eziokwu na-agbalịsi ike ịdị umeala n’obi, na-erubekwara Chineke isi otú ahụ. Ha ghọtara na ọ bụ ihe ùgwù ịna-akpọ Jehova Nna ha. Ha chọkwara ka ọ bụrụ ya na-akpụzi ha. Ị̀ na-ekwe ka Chineke na-akpụzi gị ka i nwee ike ịbụ arịa bara ezigbo uru? Ị̀ ghọtara na nwanna nke ọ bụla bụ arịa Chineke ka na-akpụzi? w16.06 1:2, 3
Wenezdee, Mach 7
Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ.—2 Kọr. 13:5.
Ugbu a ọ fọrọ obere ka anyị banye n’ụwa ọhụrụ, ihe ndị na-eme ga-egosi ma ànyị nwere okwukwe. Anyị kwesịrị ịchọpụta ma okwukwe anyị ò sikwara ike. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ileru onwe anyị anya ma mata otú anyị si ele ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33 anya. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m weere ka ihe kacha mkpa na ihe ndị m na-ekpebi ime hà na-egosi na m kwetara ihe ahụ Jizọs kwuru? M̀ ga-ekpebi ịhapụ ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma n’ihi na m chọrọ ịkpatakwu ego? Gịnị ka m ga-eme ma ọ bụrụ na onye m na-arụrụ ọrụ agwa m ka m tinyekwuo oge m na ike m n’ọrụ m? M̀ ga-ekwe ka ụwa a na-agwa m ihe m ga-eme, ma ọ bụdị mee ka m kwụsị ife Jehova?’ Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Chegodị banyere onye na-efe Jehova nke na-anaghị emecha ihe Baịbụl kwuru. O nwere ike ịbụ ihe gbasara ndị ya na ha na-akpa, onye a chụrụ n’ọgbakọ, ma ọ bụ ntụrụndụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ò nwere ike ịbụ na m na-eme otú ahụ?’ Anyị chọpụta na obi anyị amalitela ịkpọchi, anyị kwesịrị inyocha okwukwe anyị ozugbo. Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị nọtụ, anyị ejiri Okwu Chineke leruo onwe anyị anya ma gwa onwe anyị eziokwu. w16.06 2:8, 9
Tọzdee, Mach 8
Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike.—Aịza. 60:22.
Nzukọ Jehova pụrụ ezigbo iche. Ndị nọ na ya bụ Ndịàmà ya ji obi ha niile na-efe ya n’ụwa niile. Ọ bụ eziokwu na ha niile ezughị okè, na-emejọkwa ihe, ma mmụọ nsọ Chineke na-eme ka ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ na-amụba ma na-aga n’ihu. Chegodị banyere ụfọdụ n’ime ihe dị́ egwu Jehova jirila ndị ya rụọ n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Mgbe oge ikpeazụ malitere n’afọ 1914, ndị ohu Chineke nọ n’ụwa ebughị ibu. Ma Jehova gọziri ozi ọma ha nọ na-ekwusa. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ nde mmadụ amụtala eziokwu Baịbụl, ghọọkwa Ndịàmà Jehova. Jehova kwuru na ụdị ihe a ga-eme n’ihe o kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ọ sịkwara: “Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” Amụma a na-emezu n’oge ikpeazụ a. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ mba ndị bi na nke ọ bụla n’ime ha na-aharughị ka mmadụ ole bụ́ ndị Jehova n’ụwa niile. w16.06 4:1, 2
Fraịdee, Mach 9
Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa [anụ ufe nke eluigwe]?—Mat. 6:26.
O meghị Jizọs obi abụọ na Nna ya ga na-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha ebe ọ bụ na ọ na-enye ụmụ nnụnụ nri. (1 Pita 5:6, 7) Ọ gaghị etinye anyị nri n’ọnụ. Ma, o nwere ike ịgọzi mbọ anyị na-agba ịkọpụta nri anyị ga-eri ma ọ bụ ịkpata ego anyị ga-eji na-azụ ihe anyị ga-eri n’ụbọchị. Anyị nwee mkpa, o nwere ike imetụ ndị ọzọ aka n’obi ka ha nye anyị ihe ha nwere. N’agbanyeghị na Jizọs ekwughị banyere inye ụmụ nnụnụ akwụ́ ha ga-ebi, Jehova enyela ha amamihe, nkà, na ahịhịa ha ga-eji na-akpa akwụ́ ha. Jehova nwekwara ike inyere anyị aka ka anyị nweta ebe anyị na ezinụlọ anyị ga-ebi. Mgbe Jizọs na-ekwu ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa, o doro anya na o bu n’obi na ya ga-eji ndụ ya chụọ àjà n’oge na-adịghị anya iji zọpụta ụmụ mmadụ. (Tụlee Luk 12:6, 7.) Jizọs anwụghị maka ụmụ nnụnụ, kama ọ nwụrụ maka anyị ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.—Mat. 20:28. w16.07 1:11-13
Satọdee, Mach 10
Mmehie agaghị abụ nna unu ukwu, ebe unu maara na unu anọghị n’okpuru iwu kama n’okpuru obiọma na-erughịrị mmadụ.—Rom 6:14.
Gịnị mere anyị ji emehie, na-anwụkwa anwụ? Baịbụl kwuru banyere Adam, sị: “Ọnwụ si n’aka otu onye ahụ chịa” ụmụ Adam niile dị́ ka eze. (Rom 5:12, 14, 17) Ma, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ike ikpebi na mmehie agaghịzi na-achị anyị. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ, ọ pụtara na anyị chọrọ ka Jehova jiri obiọma ya na-erughịrị mmadụ na-achị anyị. (Rom 5:20, 21) N’agbanyeghị na anyị ka bụ ndị mmehie, anyị ekwesịghị ikwe ka mmehie na-achị anyị. Anyị mee mmehie, anyị na-arịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị. N’ihi ya, ọ bụ obiọma na-erughịrị mmadụ na-achị anyị. Olee uru ọ baara anyị? Pọl kwuru, sị: “Obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ . . . na-akụziri anyị ka anyị jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, ka anyị na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.”—Taị. 2:11, 12. w16.07 3:5, 6
Sọnde, Mach 11
[Chineke kpọọrọ] ya kpọtara nwoke ahụ.—Jen. 2:22.
Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, si otú ahụ mee ka nsogbu dịzie n’alụmdi na nwunye ha. “Agwọ mbụ ahụ,” bụ́ Ekwensu, ghọgburu Iv, mee ka o kweta na ọ ga-amata ihe ọ na-amabughị ma o rie mkpụrụ si ‘n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.’ Setan kwuru na o rie mkpụrụ osisi ahụ, ọ ga-enyere ya aka ịna-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Iv akwanyeghịrị di ya bụ́ onyeisi ezinụlọ ùgwù. O riri mkpụrụ osisi ahụ n’ebughị ụzọ jụọ ya. Kama irubere Chineke isi, Adam naara Iv mkpụrụ osisi ahụ rie. (Mkpu. 12:9; Jen. 2:9, 16, 17; 3:1-6) Mgbe Chineke jụrụ Adam ihe merenụ, Adam boro ya nwunye ya. Ọ sịrị: “Nwaanyị ahụ i nyere m ka mụ na ya biri, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, m wee rie.” Iv kwuru na ọ bụ agwọ duhiere ya. (Jen. 3:12, 13) Ihe ahụ ha kwuru enweghị isi na ọdụ. Isi ha nupụụrụ Jehova mere ka ọ maa ha ikpe. Anyị kwesịrị ịmụta ihe na ya. Ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ịna-ebi n’udo, ha kwesịrị ịna-erubere Jehova isi. Ha mejọọ, ha ekwesịghị ibo ya onye ọzọ. w16.08 1:1, 4, 5
Mọnde, Mach 12
Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.—Mat. 19:6.
Ọ bụrụ na di na nwunye na-arọ nrọ ihe na-agaghị ekwe omume, ha nwere ike ịna-ese ezigbo okwu. Ma ihe ha tụrụ anya ya emeghị, obi ụtọ ha nwere ike ịla ka naị, ọsụkọsụ ana-asụ ha mgbe ọ bụla. Ọtụtụ mgbe, otú e si zụọ ha na ihe nwere ike ịkpasu ha iwe na-adị iche iche. Ihe gbasara ndị ọgọ, otú e si emefu ego ma ọ bụ otú e si azụ ụmụ nwekwara ike ịkpata esemokwu. Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye see ezigbo okwu, ha kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ha aka. Ụmụnna ndị ahụ ma nke a na-akọ ga-enyere di na nwunye aka ime ihe Baịbụl kwuru. Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, nke ga-enyere anyị aka ime ihe Baịbụl kwuru nakwa ịna-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Gal. 5:22, 23. w16.08 2:11-13
Tuzdee, Mach 13
Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.—Luk 5:10.
Oge Jizọs nwere ije ozi ya ebughị ibu. Ma, o wepụtara oge na-akụziri ndị chọrọ ịmụtakwu ihe ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, ìgwè mmadụ gbakọrọ n’akụkụ osimiri ka ha nụ okwu Jizọs. Ọ rụrụ ọrụ ebube, mee ka Pita gbute azụ̀ buru ibu, kwuokwa ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Gịnị ka Pita na ndị só ya mere n’ihi ihe Jizọs kwuru na ihe o mere? ‘Ha kwọọrọ ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’elu ala, gbahapụkwa ihe niile ma soro Jizọs.’ (Luk 5:1-11) Ihe Jizọs na-akụzi masịrị Nikọdimọs, bụ́ onye só n’òtù Sanhedrin. Ọ chọrọ ịmụtakwu ihe, ma ọ nọ na-atụ ụjọ ihe ndị mmadụ ga-ekwu ma ha hụ ka ya na Jizọs na-akparịta ụka. Ọ bụ ya mere o ji bịakwute Jizọs n’abalị. Jizọs achụpụghị ya, kama o wepụtara oge kụziere ya ihe. (Jọn 3:1, 2) Ọkpara Chineke wepụtara oge kụziere ndị mmadụ ihe ga-eme ka ha nwee okwukwe. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-agba mbọ na-agara ndị nwere mmasị nletaghachi, na-amụkwara ha ihe? w16.08 4:10, 11
Wenezdee, Mach 14
Soro Chineke gị na-eje ije.—Maị. 6:8.
Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghọta na Jehova dị ọcha, dịkwa nsọ nakwa na ihe ọ chọrọ ka anyị mee bụ ihe ga-akacha baara anyị uru. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị umeala n’obi, anyị ga na-eme ihe o kwuru. Ịdị umeala n’obi ga-enyekwara anyị aka ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma ghara iji ejiji ga-akpasu ha iwe. Uwe anyị na-eyi kwesịrị igosi n’eziokwu na anyị na-efe Jehova. O kwesịrị ime ka ụmụnna anyị na ọhaneze ghọta na anyị na-anọchite anya Chineke anyị bụ́ onye ezi omume. Ọ gwara anyị ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme. Obi dịkwa anyị ụtọ ịna-eme ha. E kwesịrị ịna-aja ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị mma maka otú ha si eji ejiji dị mma na otú ha si akpa àgwà ọma. Ha na-eme ka ndị nwere ezi obi na-enwe mmasị n’ozi ọma na-enye ndụ, nke si na Baịbụl. Ha na-emekwa ka e too Jehova, obi adịkwa ya ụtọ. w16.09 3:18-20
Tọzdee, Mach 15
Gị na Chineke na mmadụ agbawo mgba, i wee merie n’ikpeazụ.—Jen. 32:28.
Jekọb kpebisiri ike na ọ ga-enweta ihe ọ na-achọ. Ihe o mere gosiri na ọ bụghị onye ụjọ. (Jen. 32:24-26) O doro anya na Chineke gọziri ya maka otú o si tachie obi. A gụrụ ya aha dabara adaba, bụ́ Izrel, (nke pụtara “Onye Ya na Chineke Gbara Mgba” ma ọ bụ “Chineke Na-agba Mgba”). Jekọb nwetara ihe anyịnwa na-achụ taa, ya bụ, ka anyị mee ihe dị Jehova mma ka ọ gọzie anyị. Rechel bụ́ nwunye Jekọb hụrụ n’anya gbalịsiri ike ka ọ hụ otú Jehova ga-esi mezuo nkwa o kwere di ya na ọ ga-agọzi nwa ya. Ma, Rechel amụtabeghị nwa. Ụdị ihe ahụ na-agbawa ụmụ nwaanyị obi n’oge ochie. Gịnị nyeere Rechel aka idi nsogbu ahụ ma na-agbasi mgba ike n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ga-emeli banyere ya? Ọ kwụsịghị inwe olileanya. Kama, ọ gbasiri mbọ ike ma na-ekpesikwu ekpere ike. Jehova nụrụ arịrịọ Rechel ji obi ya niile na-arịọ. O mechara mee ka ọ mụta ụmụ.—Jen. 30:8, 20-24. w16.09 2:6, 7
Fraịdee, Mach 16
Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla.—Hib. 4:12.
Ọ dị ezigbo mkpa ka i mee ka ụmụ gị ghọta na ime ihe Baịbụl kwuru na-aba uru. (Ọma 1:1-3) E nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi eme ya. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ụmụ gị ka ha were ya na ha na-aga n’otu obere obodo dịpụrụ adịpụ, ọ bụkwa ha ga-ekpebi mmadụ ole ha na ha ga-ebi ebe ahụ. Jụzie ha, sị: “Olee ụdị àgwà onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na ha niile chọrọ ịna-ebi n’udo?” I nwere ike ịgụrụ ha Ndị Galeshia 5:19-23 ka ha hụ ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha biri n’ụwa ọhụrụ. E nwere ihe abụọ dị mkpa ụmụ gị ga-amụta n’ihe atụ ahụ. Nke mbụ bụ na iwu Chineke na-eme ka e nwee ezigbo udo na ịdị n’otu. Nke abụọ abụrụ na ihe Jehova na-akụziri anyị na-eme ka anyị jikere ibi n’ụwa ọhụrụ ya. (Aịza. 54:13; Jọn 17:3) I nwere ike iji ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ anyị mee ka ha ghọta ya nke ọma. O nwere ike ịbụ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke na-agba n’Ụlọ Nche. w16.09 5:13, 14
Satọdee, Mach 17
[Zụtara] onwe unu oge kwesịrị ekwesị.—Efe. 5:16.
Ọ bụ eziokwu na ọrụ nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe efe, anyị niile kwesịrị ịna-ewepụta oge na-amụ ihe nke onwe anyị, na-enwekwa ofufe ezinụlọ. (Efe. 5:15) Ma, ihe bụ́ mkpa anyị ekwesịghị ịbụ ka anyị gụchaa ihe niile ma ọ bụ kwado ihe anyị ga-aza n’ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka Okwu Chineke ruo anyị n’obi nakwa ka okwukwe anyị sie ike. Ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ abụghị naanị iche otú anyị ga-esi jiri ihe anyị na-amụ nyere ndị ọzọ aka, kama anyị kwesịkwara ịna-eche otú ọ ga-esi baara anyị uru. (Fil. 1:9, 10) Anyị kwesịrị ịghọta na mgbe anyị na-akwado ihe omume, ozi ọma, ma ọ bụ ọmụmụ ihe, o nwere ike anyị agaghị echecha otú o si gbasa anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na osi nri kwesịrị iritụ ihe o siri tupu ya ebupụta ya, ọ bụghị nke ahụ o ritụrụ ga-eme ka afọ ju ya. Ọ chọọ ka ahụ́ gbasie ya ike, o kwesịrị isi ezigbo nri ọ ga-eri. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị chọọ ka okwukwe anyị na-esi ike, anyị kwesịrị ịna-amụchi Baịbụl anya. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata ebe anyị ga-emekwu nke ọma. w16.10 2:10, 11
Sọnde, Mach 18
Ọ bụ okwukwe ka anyị ji ghọta na e doro usoro ihe dị iche iche n’usoro site n’okwu Chineke, nke mere na ihe a na-ahụ anya si n’ihe na-apụtaghị ìhè.—Hib. 11:3.
Baịbụl kọwara okwukwe ná Ndị Hibru 11:1. Ihe abụọ amaokwu a kwuru banyere okwukwe bụ ihe ndị anyị na-anaghị ahụ anya. Nke mbụ bụ “ihe ndị a na-ele anya ha,” nke nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke kwere ná nkwa ga-eme n’ọdịnihu, ma ha emebeghị. Dị ka ihe atụ, Chineke kwuru na ya ga-ewepụ ihe ọjọọ niile, meekwa ka ụwa ọhụrụ bịa. Nke abụọ bụ “ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” Okwu Grik e si sụgharịta “ihe àmà doro anya” pụtara ihe na-egosi na ihe a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ Jehova Chineke, Jizọs Kraịst, ndị mmụọ ozi, na ihe dị iche iche Alaeze Chineke merela. Olee otú anyị ga-esi gosi na olileanya anyị siri ike nakwa na anyị kwetasiri ike n’ihe ndị a na-anaghị ahụ anya Baịbụl kwuru banyere ha? Ọ bụ okwu ọnụ anyị na omume anyị ka anyị ga-eji egosi ya n’ihi na ma anyị emeghị otú ahụ, okwukwe anyị agaghị ezu ezu. w16.10 4:6
Mọnde, Mach 19
Na-agbanụ ibe unu ume.—Hib. 3:13.
Jehova na Jizọs anaghị eji mbọ anyị niile na-agba ịkwado ihe gbasara Alaeze egwu egwu, ọ bụrụgodị na mbọ anyị gbara ma ọ bụ ihe anyị nyere ebughị ibu n’ihi otú ihe si dịrị anyị. (Luk 21:1-4; 2 Kọr. 8:12) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna merela agadi na-agbalịsi ike ịbịachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-aja ha mma, na-agbakwa ha ume? Anyị hụ ihe kwesịrị ime ka anyị jaa ndị ọzọ mma, anyị ekwesịghị ịgbachi nkịtị. Chegodị banyere ihe mere mgbe Pọl na Banabas nọ n’Antiọk dị na Pisidia. Ndị isi oche ụlọ nzukọ ndị Juu gwara ha, sị: “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu agbamume ọ bụla unu ga-agwa ndị a, kwuonụ ya.” (Ọrụ 13:13-16, 42-44) Ọ bụrụ na anyị ga-agbali mmadụ ume, ànyị kwesịrị imechi ọnụ? Anyị nwere ike ịchọpụta na ọ bụrụ na anyị na-agbakarị ndị mmadụ ume, ndị ọzọ ga na-agba anyị ume.—Luk 6:38. w16.11 1:3, 15, 16
Tuzdee, Mach 20
Anya Jehova dị n’ebe niile, na-elegide ndị ọjọọ na ndị ọma.—Ilu 15:3.
Jehova meere anyị ihe ọma kpọbata anyị ná nzukọ ya. Ebe ọ bụ na Chineke akụzierela anyị ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme, anyị kwesịrị ịna-erubere ya isi ma na-eme ihe ziri ezi. Ka ọtụtụ ndị na-aṅụkwu omume ọjọọ ka mmiri, anyị kwesịrị ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị’ otú ahụ Jehova kpọrọ ya. (Ọma 97:10) Anyị anaghị eso ndị na-amaghị Chineke na-asị na “ihe ọma bụ ihe ọjọọ, na ihe ọjọọ bụ ihe ọma.” (Aịza. 5:20) Ebe anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma, anyị na-agbalịsi ike ka ahụ́ anyị, omume anyị, na echiche anyị na-adị ọcha. (1 Kọr. 6:9-11) Anyị hụrụ Jehova n’anya, tụkwasịkwa ya obi. Ọ bụ ya mere anyị ji eme ihe Okwu ya bụ́ Baịbụl gwara anyị iji gosi na anyị na-erubere ya isi. Anyị na-agbalịsikwa ike irubere iwu ya isi n’ebe ọ bụla, ma n’ezinụlọ anyị ma n’ọgbakọ ma n’ebe anyị na-arụ ọrụ. w16.11 3:13
Wenezdee, Mach 21
Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị.—Rom 13:1.
Obi Ndị Mmụta Baịbụl dị ọcha. Ma n’agbata afọ 1914 na 1919, ọ bụghị mgbe niile ka ha lere ndị ọchịchị anya otú ha kwesịrị isi na-ele ha. N’ihi ya, ha tinyere aka n’agha mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mgbe onyeisi ala Amerịka nyere iwu n’abalị iri atọ n’ọnwa Mee afọ 1918 ka e wepụta otu ụbọchị a ga-eji kpee ekpere maka udo, Ụlọ Nche gbara Ndị Mmụta Baịbụl ume ka ha soro mee ihe ahụ e kwuru. Ụfọdụ ụmụnna nyere onyinye iji kwado agha ahụ. Ụfọdụ ndị ghọdịrị ndị agha ma gaa agha. Ma, e kwesịghị iche na Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ Ndị Mmụta Baịbụl n’agha n’ihi na e kwesịrị ịgbazi ha ma dọọ ha aka ná ntị. Kama, ha ghọtara na ha kwesịrị isepụ aka n’okpukpe ụgha. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, ọ fọrọ obere ka ha sepụchaa aka n’okpukpe ụgha.—Luk 12:47, 48. w16.11 5:9
Tọzdee, Mach 22
[Anyị] na-eje ije, ọ bụghị dị ka anụ ahụ́ si chọọ, kama dị ka mmụọ nsọ si chọọ.—Rom 8:4.
I nwere ike ịna-eche ihe mere Pọl ji dọọ Ndị Kraịst e tere mmanụ aka ná ntị ka ha ghara ‘ịna-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ.’ Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime Ndị Kraịst taa, bụ́ ndị Chineke kpọrọ ndị enyi ya na ndị ezi omume? Ọ dị mwute na Onye Kraịst nwere ike imewe ihe anụ ahụ́ ya na-ezughị okè chọrọ. Dị ka ihe atụ, Pọl dere na ụfọdụ ụmụnna nọ na Rom bụ ohu “nke afọ ha,” ya bụ, ihe ndị na-agụ ha agụụ. O nwere ike ịbụ na ihe Pọl na-ekwu bụ na mmekọahụ, nri, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Ụfọdụ n’ime ha ‘na-arafu ndị na-adịghị aghụghọ.’ (Rom 16:17, 18; Fil. 3:18, 19; Jud 4, 8, 12) Chetakwa na e nwere mgbe otu nwoke nọ na Kọrịnt “kpọọrọ nwunye nna ya.” (1 Kọr. 5:1) Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji si n’ọnụ Pọl dọọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ghara ‘ịna-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́.’ (Rom 8:5, 6) Ihe ahụ Pọl kwuru gbasakwara anyị taa. w16.12 2:5, 8, 9
Fraịdee, Mach 23
Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.—Ilu 12:25.
E nwee ihe na-echegbu gị, ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị ga-enyere gị aka. Di gị ma ọ bụ nwunye gị, enyi gị ma ọ bụ okenye ọgbakọ nwere ike inyere gị aka ka i lewe nsogbu ahụ anya otú kwesịrị ekwesị. Ịkọrọ onye ọzọ nsogbu gị n’ezoghị ọnụ nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe na-echegbu gị ma mee ihe i kwesịrị ime. Baịbụl kwuru, sị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” (Ilu 15:22) Jehova na-ejikwa ọmụmụ ihe ọgbakọ enyere Ndị Kraịst aka idi ihe na-echegbu ha. Ị gaa ọmụmụ ihe, gị na ụmụnna gị ga-anọrị. Ihe gbasara gị na-emetụ ha n’obi. Ha chọkwara ịna-agbarịta ibe ha ume. (Hib. 10:24, 25) Otú gị na ha si ‘agbarịta ibe unu ume’ ga-enyere gị aka ka okwukwe gị sie ike, meekwa ka ọ dịrị gị mfe ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị.—Rom 1:12. w16.12 3:17, 18
Satọdee, Mach 24
[Hana] wee malite ikpeku Jehova ekpere.—1 Sam. 1:10.
Ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nsogbu ndị anyị na-agaghị emeli ihe ọ bụla banyere ha, anyị kwesịrị ịkọrọ ya Jehova, ebe anyị ma na ọ na-eche banyere anyị. (1 Pita 5:6, 7) Anyị kwesịkwara ime ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike ịna-aga ọmụmụ ihe anyị, sorokwa na-eme ihe ndị ọzọ a na-eme ná nzukọ Jehova, n’ihi na ha na-abara anyị uru. (Hib. 10:24, 25) Oleekwanụ maka ndị nne na nna ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ụmụ ha ahapụ ọgbakọ? Samuel onye amụma agaghị amanyeli ụmụ ya bụ́ ndị dimkpa ka ha na-erubere Chineke isi. (1 Sam. 8:1-3) Ọ hapụụrụ Jehova okwu ahụ. Ma, Samuel ga-erubereli Nna ya nke eluigwe bụ́ Jehova isi ma na-eme ihe ọ chọrọ. (Ilu 27:11) Taa, ụdị ihe a emeela ọtụtụ ndị nne na nna ji obi ha niile na-efe Chineke. Obi siri ha ike na Jehova na-achọ ndị mmehie chegharịrị echegharị ka ọ nabata ha. (Luk 15:20) Ka ọ dịgodị, ndị nne na nna ahụ na-agbasi mbọ ike ka hanwa na-erubere Jehova isi, na-atụkwa anya na ụmụ ha ga-amụta ihe n’aka ha, lọghachikwute Jehova. w17.01 1:15, 16
Sọnde, Mach 25
N’ịdị nwayọọ n’obi, na-ewere na ndị ọzọ ka unu.—Fil. 2:3.
Onye dị umeala n’obi anaghị eme ihe na-erughịrị ya, ọ naghị etu ọnụ, ọ na-ekweta ma o mejọọ ihe, ọ na-egekwa ndị ọzọ ntị. N’eziokwu, ụdị àgwà a na-eme Jehova obi ụtọ. Baịbụl kwuru na onye dị umeala n’obi ma na o nwere ihe ndị ọ na-agaghị emeli, ma ọ bụkwanụ ihe ndị a na-enyeghị ya ikike ime. Ihe a na-eme ka ọ kwanyere ndị ọzọ ùgwù, jirikwa obiọma na-emeso ha ihe. Olee otú anyị nwere ike isi malite ịdị mpako? Lee ihe ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka ịmata ma ànyị adịwala mpako. Anyị nwere ike ịna-ewere onwe anyị ka ànyị adịka mkpa, ma ọ bụkwanụ were ya ka o nweghị onye ha ka anyị n’ihi ọrụ e nyere anyị. (Rom 12:16) Anyị nwere ike ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ndị ọzọ towe anyị. (1 Tim. 2:9, 10) Ma ọ bụkwanụ anyị nwere ike ikwo maka ọkwá anyị ma ọ bụ ndị anyị ma na-esi ọnwụ ka e mee ihe anyị chọrọ n’amaghị na anyị adịwala mpako.—1 Kọr. 4:6. w17.01 3:6-8
Mọnde, Mach 26
Ịma mma nke ụmụ okorobịa bụ ike ha, ịma mma nke ndị agadi bụkwa isi awọ́ ha.—Ilu 20:29.
Taa, ọrụ ndị ohu Jehova na-arụ amụbaala n’ebe o buru ibu. Ka a na-enwe ọrụ ọhụrụ, a na-enwekarịkwa otú ọhụrụ e kwesịrị isi na-arụ ya. Otú ọhụrụ a e si arụ ụfọdụ ọrụ ndị a pụtakwara na a ga-eji ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ na-arụ ha. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị merela agadi ike ịrụ ọrụ ndị a otú ọhụrụ e sizi arụ ha. (Luk 5:39) Ọ bụrụgodị ndị nke ọ na-anaghị esiri ike, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-akatabeghị ahụ́ nwere ume na ike karịrị nke ndị katarala ahụ́. N’ihi ya, ọ bara uru, kwesịkwa ekwesị, ka ndị okenye zụọ ụmụ okorobịa ka ha nwee ike ịna-arụkwu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. (Ọma 71:18) O nwere ike isiri ndị nọ n’ọkwá ike inyefe ndị ka bụ́ okorobịa ọrụ. Ụjọ ha bụ na e nwere ike ịnaghara ha ọrụ ha dị ha ezigbo mkpa ma ọ bụ na ụmụ okorobịa agaghị arụtali ya nke ọma otú hanwa ga-esi arụta ya. Ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu na ha enweghị ohere ha ga-eji azụ ndị ọzọ. Ụmụ okorobịa kwesịkwara inwe ndidi ma ọ bụrụ na e nyekwubeghị ha ọrụ. w17.01 5:3, 4
Tuzdee, Mach 27
E si n’otu omume ziri ezi kpọọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.—Rom 5:18.
Jizọs ghọrọ mmadụ zuru okè otú ahụ Adam zuru. (Jọn 1:14) Ma Jizọs emeghị ka Adam. O mere ihe Jehova chọrọ ka onye zuru okè mee. N’agbanyeghị ọnwụnwa tara akpụ bịaara ya, o mehieghị ma ọ bụ daa iwu Chineke. Ebe Jizọs bụ nwoke zuru okè, o nwere ike ịnwụ n’ihi ụmụ mmadụ iji zọpụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. Ọ bụ mmadụ zuru okè, onye ji obi ya niile rubere Chineke isi otú ahụ Adam kwesịrị ime. (1 Tim. 2:6) Jizọs chụrụ àjà ga-eme ka “ọtụtụ mmadụ” nweta ndụ ebighị ebi, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụaka. (Mat. 20:28) N’eziokwu, ọ bụ ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ mezuo. (2 Kọr. 1:19, 20) Ọ ga-emekwa ka mmadụ niile kwesịrị ntụkwasị obi nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. w17.02 1:15, 16
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 9) Jọn 12:12-19; Mak 11:1-11
Wenezdee, Mach 28
N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ.—Hib. 12:2.
Weregodị ya na ị nọ n’ụzọ, hụ ebe yiri ọgba toro ogologo, gbaakwa ọchịchịrị. I nwere ike ịna-eche ma ị̀ ga-ahụwakwa ìhè. E nwere ike iji ndụ anyị dị ugbu a tụnyere ụdị njem ahụ. Nsogbu bịaara gị nwere ike isi ezigbo ike, ya adị gị ka nsogbu nke gị ọ̀ karịala. Ị manụ na o nwere mgbe ọ dị Jizọs otú ahụ. Mgbe a kpọgidere ya n’elu osisi ịta ahụhụ, e menyere ya ihere, taakwa ya ezigbo ahụhụ. Oge ahụ nwere ike ịbụ oge kacha siere ya ike n’ụwa. (Hib. 12:3) Ma, Jizọs diri ihe ahụ niile. O lekwasịrị anya n’uru ntachi obi ya ga-aba. Nke kacha mkpa bụ na ọ ga-eso mee ka e doo aha Chineke nsọ ma kwado na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị. Ọ ma na ọnwụnwa ahụ agaghị adịte aka, ma ụgwọ ọrụ a ga-enye ya n’eluigwe ga-adịru mgbe ebighị ebi. Taa, ọnwụnwa ndị na-abịara gị nwere ike ịna-ebu gị aka, na-ewutekwa gị. Ma, cheta na ha agaghị adịte aka. w16.04 2:10
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 10) Jọn 12:20-50
Tọzdee, Mach 29
E si n’aka [Jizọs] jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, site n’ọbara nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie anyị.—Efe. 1:7.
N’ụwa a ndị mmadụ na-eme ihe sọrọ ha, a naghịzi ewere mmehie ka ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere na ọtụtụ ndị amaghị na e kwesịrị ịgbapụta ha. Ha aghọtaghị ihe mmehie bụ, ihe ọ na-eme anyị, na ihe anyị kwesịrị ime ka a gbapụta anyị ná mmehie. Obi na-adị ndị ji obi ha niile na-achọ eziokwu ụtọ ịmụta na ọ bụ ịhụnanya Jehova na obiọma ya na-erughịrị mmadụ mere ka o zite Ọkpara ya n’ụwa ka ọ napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. (1 Jọn 4:9, 10) Àjà ahụ Kraịst ji ndụ ya chụọ bụ ihe kacha gosi na Chineke hụrụ anyị n’anya nakwa na obiọma ya na-erughịrị mmadụ enweghị atụ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmụta na anyị nwee okwukwe n’ọbara Jizọs ji chụọ àjà, Chineke ga-agbaghara anyị, sachaakwa akọnuche anyị. (Hib. 9:14) Ọ bụ ozi ọma anyị kwesịrị ịna-ezi ndị ọzọ. w16.07 4:6, 7
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 11) Luk 21:1-36
Fraịdee, Mach 30
[Kraịst nwetaara] anyị nnapụta nke na-adịru mgbe ebighị ebi.—Hib. 9:12.
Anyị nwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, Jehova ga-agbaghara anyị mmehie anyị. Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Chineke ‘ga-ehichapụ mmehie anyị.’ (Ọrụ 3:19-21) Ihe mgbapụta ahụ mere ka Jehova kpọọ Ndị Kraịst e tere mmanụ ụmụ ya. (Rom 8:15-17) Ọ dị ka à ga-asị na Jehova edeela aha anyị bụ́ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ na satifiket ọ ga-eji were anyị ka ụmụ ya. Mgbe anyị ga-ezu okè ma gafee ule ikpeazụ, obi ga-adị ya ụtọ ịbịanye aka na satifiket ahụ ma were anyị ka ụmụ ya ọ hụrụ n’anya ga-ebi n’ụwa. (Rom 8:20, 21; Mkpu. 20:7-9) Jehova ga-ahụ ụmụ ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Uru ihe mgbapụta ahụ bara ga-adịru mgbe ebighị ebi. O nweghị mgbe onyinye ahụ na-agaghịzi aba uru. E nweghị onye ga-anapụli anyị ya. w17.02 2:15, 16
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 12) Matiu 26:1-5, 14-16; Luk 22:1-6
Ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs
Mgbe Anwụ Dachara
Satọdee, Mach 31
Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst.—1 Jọn 2:1.
Mgbe Jehova dọtara anyị ka anyị bụrụ enyi ya, ọ ma ụdị àgwà ndị ga-akacha siere anyị ike ịgbanwe. Ọ makwa na anyị ga na-emehie mgbe ụfọdụ. Ma, ihe ndị a emeghị ka Jehova ghara ịchọ ka anyị na ya bụrụ enyi. Otú Jehova si hụ anyị n’anya mere ka o nye anyị onyinye bara ezigbo uru. O zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta anyị. (Jọn 3:16) Ọ bụrụ na anyị emejọọ, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị. N’ihi ihe mgbapụta ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-agbaghara anyị, anyị na ya aka bụrụkwa enyi n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè.—1 Tim. 1:15. w16.05 4:6, 7
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 13) Matiu 26:17-19; Mak 14:12-16; Luk 22:7-13 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 14) Jọn 13:1-5; 14:1-3