Egwu Na-ejikpọ Ụwa
MGBỌWA nke otu nnukwute bọmbụ dị n’ụgbọ ala mere ka ụlọ elu World Trade Center nke dị 110 okpukpu na New York City maa jijiji na February 26, 1993. Ọtụtụ puku ndị ọrụ tọrọ n’ígwè mbugo ndị kwụsịrị ọrụ ma ọ bụ bụrụ ndị na-aghaghị ịgbatu ala site na stepụ ndị anwụrụ ọkụ kwụjuru. Ha nwere mmetụta nke egwu nke jupụtara ugbu a n’ụwa ime ihe ike nke a.
E jiwo bọmbụ menye ndị mmadụ n’ọtụtụ ala egwu, bụ́ nke a na-ahụ n’ebe nile ná mba ndị dị ka Ireland na Lebanọn. Leenụ, 13 gbọwara n’ime otu ụbọchị nanị—March 12, 1993—na Bombay, India, na-egbu ihe dị ka 200 mmadụ! Otu onye hụrụ ihe merenụ sịrị: “E nwere ahụ erughị ala n’ime Bombay dum.” Dị ka magazin bụ́ Newsweek kwuru, “njupụta ebe nile nke bọmbụ ụgbọ ala na-eme nanị ka ọ dị egwu karị.”
Egwu Nuklia Na-adịgide
E nwere egwu na a pụrụ ịtụ bọmbụ n’ebe a na-emepụta ngwá agha nuklia bọmbụ. Mwakpo gara nke ọma megide ụlọ ọrụ mmepụta nuklia pụrụ ịkpata mbibi na ahụhụ a na-apụghị ịkọ n’ọnụ. Ihe na-egosi na egwu nke a kwesịrị ekwesị bụ mgbalị otu nwoke mere iji ụgbọ ala ya tikara geti nke ụlọ ọrụ mmepụta nuklia nke dị na Three Mile Island na United States.
Ọtụtụ na-atụ egwu na ndị na-eme ihe ike na ndị ọchịchị agụụ inwe ike na-agụ pụrụ inweta ngwá agha nuklia. Ụfọdụ na-atụ egwu na ọtụtụ puku ndị Soviet bụ́ ọkà mmụta sayensị nkà ike nuklia bụ́ ndị na-enweghị ọrụ ga-agbalị iji nkà ha kpaa ego. Ọzọ, ọ bụ ezie na nkwekọrịta START na nkwekọrịta ndị ọzọ na-akpọ òkù maka mbelata dị ukwuu nke ngwá agha nuklia nile dị njikere iji mee ihe, a gaghị etinyesị nkwekọrịta ndị dị otú ahụ n’ọrụ ruokwa ọtụtụ afọ. Ka ọ dị ugbu a, ohere nke onye ji ajọ ịnụ ọkụ n’obi tikapụta iji ngwá agha ndị a mee ihe aghaghị ikokwasị n’isi ihe a kpọrọ mmadụ dị ka urukpuru oké mmiri ozuzo nke na-eyi egwu.
Ime Ihe Ike Na-akwalite Egwu
Mmụba zuru ebe nile nke mpụ site n’ime ihe ike na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’egwu n’ebe obibi ha na n’okporo ámá. E mere atụmatụ na e gburu ihe dị ka 23,200 ndị America na 1990. N’obodo Chicago, dị ka ihe atụ, ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ ndị na-eji ọgwụ crack cocaine eme ihe so kpata ihe dị ka 700 igbu ọchụ n’otu afọ. Akụkụ ụfọdụ nke obodo ukwu ụfọdụ aghọwo ọgbọ agha ebe e gbuworo ndị na-agafere onwe ha, gụnyere ụmụaka, mgbe a na-akwarịta mgbọ. Otu magazin kwuru, sị: “Ime ihe ike ji ọsọ na-arị elu n’obodo ukwu ndị na-ebuchaghị ibu. . . . Ọ dịghị onye ọ na-apụghị ịdabara ebe ógbè nile nke [United States] jupụtara n’ọgwụ ọjọọ na ndị omekome bụ́ ndị na-eto eto. Kwa afọ 1 n’ime ezinụlọ 4 ọ bụla nke ndị America na-enwe ahụmahụ nke mpụ site n’ime ihe ike ma ọ bụ ohi.”—U.S.News & World Report, October 7, 1991.
Egwu ndina n’ike na-eme ka ahụ ghara ịdị na-eru ụmụ nwanyị ala. Na France, ndina n’ike ndị e mere mkpesa ha ji 62 pasent rịa elu malite 1985 ruo 1990. N’ime afọ isii mwakpo n’ụzọ mmekọahụ rịrị elu okpukpu abụọ ruo 27,000 na Canada. Germany nyere akụkọ nke otu mwakpo nwanyị n’ụzọ mmekọahụ n’ime minit asaa ọ bụla.
Ụmụaka kwa na-atụ egwu maka ịnọ ná nchebe ha. Newsweek na-akọ na n’ime United States, “ụmụntakịrị, ọbụna ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị nke anọ na nke ise, na-ebu ngwá ọgụ, ndị nkụzi na ndị na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ na-anọkwa n’ụjọ.” Ọnọdụ siri ike nke ukwuu nke na otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụlọ akwụkwọ ndị dị n’ógbè ndị buru ibu na-enwe ngwá ọrụ e ji achọpụta ígwè, ma ndị na-eto eto obi tara mmiri na-achọta ụzọ isi gafere ndị a site n’inyefe ndị ọzọ égbè ha site na window.
Egwu Maka Ọrịa AIDS
Ọtụtụ mmadụ karị na-atụ egwu ibute ọrịa AIDS. E nwewo ihe karịrị 230,000 ndị butere ya na United States nanị. Ọrịa AIDS aghọwo ihe nke isii kasị na-akpata ọnwụ n’etiti ndị gbara malite afọ 15 ruo 24. “Ọdịnihu nwere atụmanya na-atụ ụjọ nke ọtụtụ nrịanrịa ndị gbasara ebe nile karị n’ụzọ dị ukwuu,” ka Newsweek na-ekwu.
Ọnwụ site n’ọrịa AIDS na-adịwanye ọtụtụ n’etiti ndị ọrụ ha bụ ịgba egwú, ime ihe nkiri, sịnịma, ịgụ egwú, ịdụ ákwà, ihe nkiri telivishọn, ise ihe, na ihe ndị yiri ha. Otu akụkọ sịrị na 60 pasent nke ndị ikom Paris, bụ́ ndị nta akụkọ, ndị na-ese ihe, na ndị na-eme ihe ntụrụndụ bụ́ ndị gbara malite 25 ruo 44 afọ bụ n’ihi ọrịa AIDS. Òtù WHO (World Health Organization) na-akọ na malite na nde mmadụ 8 ruo nde 15 gburugburu ụwa bu nje HIV. Dr. Michael Merson, onye ntụzi ọrụ nke òtù WHO, na-asị: “O dowo anya ugbu a na mbibi nke mbute nje HIV na-akpata gburugburu ụwa ji ọsọ na-akawanye njọ, karịsịa ná mba ndị na-emepe emepe.”
Otú ọ dị, e nwekwara egwu banyere ihe ndị metụtara gburugburu ebe obibi na egwu ndị ọzọ. Ma, nanị akụkọ ndị e hotaworo na-eme ka o doo anya na egwu na-ejikpọ ụwa. È nwere ihe dị ịrịba ama n’ụzọ pụrụ iche banyere nke a? Ànyị pụrụ ịtụ anya mgbe ọ bụla inwere onwe anyị pụọ n’egwu?
[Ebe e si nweta foto dị na peeji 2]
Foto ihu akwụkwọ: Aka ekpe: Tom Haley/Sipa Press; N’okpuru: Malanca/Sipa Press
[Ebe e si nweta foto dị na peeji 3]
Bob Strong/Sipa Press