Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite June 11
Abụ nke 178
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke June 18.
15 min: “Nọgide ‘Na-eme Ihe Ọma.’” Okwu na-agba ume nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke okenye ga-ekwu.
20 min: “Ruo n’Obi Onye Ị Na-amụrụ Ihe.”a Gụnye aro ndị dị irè banyere ụzọ isi nyere ndị ọhụrụ aka ịzụlite okwukwe na ịhụnanya n’obi ha n’ebe Jehova na Jisọs nọ. Jiri isi ihe ndị dị n’Ụlọ Nche nke July 15, 1999, peeji nke 14, paragraf nke 18-20, mee ihe.
Abụ nke 184 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 18
Abụ nke 194
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
10 min: Ịzaghachi Ndị Nkwụsị Nkwurịta Okwu. Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Tụleghachi “Nkọwa” dị n’akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 7-8. Malite na peeji nke 8-12, họrọ okwu mgbochi ụfọdụ a na-ezute n’ókèala unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo nzaghachi ndị dị irè nye ha na ihe mere ha ji dị irè.
30 min: “Ana M Eguzosi Ike! Ana M Eguzosi Ike! Ana M Eguzosi Ike!” Ntụle a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee vidio Stand Firm, na-eji ajụjụ ndị dị na paragraf nke 2 eme ihe. Mgbe ahụzi, tụlee paragraf nke 3-4. Mechie site n’ịkọ ahụmahụ dị na Teta! (Bekee) nke November 22, 1999, peeji nke 31. N’August anyị ga-atụleghachi vidio bụ́ The New World Society in Action.
N’ọnọdụ ya, tụlee “Ndịàmà Jehova—Ndị Nwere Obi Ike n’Agbanyeghị Ihe Ize Ndụ nke Ndị Nazi.” Okwu okenye ga-ekwu bụ́ nke dabeere na Teta! nke July 8, 1998, peeji nke 10-14.
Abụ nke 197 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 25
Abụ nke 2
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi akwụkwọ ndị a ga-enyefe na July na August. Dọrọ uche gaa na broshuọ abụọ e nwere n’ọgbakọ. Mee ihe ngosi ndị a kwadoro nke ọma banyere ụzọ isi nyefee ha n’ozi. Maka ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ, bụ́ ndị a tụrụ aro ha, lee azụ mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke July na August 1995 ruo 1997.
17 min: “Mụrụ Anya n’Ịchọta Ndị Ntị Chiri Nọ n’Ókèala Unu.”b Ọ bụrụ na unu nwere ndekọ ọnụ ọgụgụ, kwuo mmadụ ole bụ́ ndị ntị chiri nọ n’ókèala ọgbakọ unu. Kọọ ahụmahụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke February 1998, peeji nke 3, paragraf nke 6.
13 min: “Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Gboo Mkpa E Nwere Maka Inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze?”c (Paragraf nke 1-10) Gụọ paragraf nke 4 ma tụlee ná nkenke ihe dị mkpa ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze unu na-agba àmà dị mma n’ógbè unu. (1 Kọr. 10:31) Gụọ paragraf nke 9 ma kwuo na n’izu na-abịa abịa ntụle nke ọkara nke abụọ nke ihe ntinye a ga-akọwa ohere ọhụrụ e mere ka o buo ibu iji kere òkè n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Abụ nke 29 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 2
Abụ nke 5
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka June.
10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu okenye ga-ekwu.
15 min: Ndị Ntorobịa—Na-ejinụ Amamihe Eme Ihe n’Ịhọrọ Ọrụ Unu. Nke a bụ nke mbụ n’ime ihe omume atọ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi bụ́ ndị ga-atụle ụkpụrụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị metụtara ịgụkwu akwụkwọ. Ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst na-achụso ọrụ ụwa site n’inweta agụmakwụkwọ ka elu, bụ́ nke na-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ọnọdụ ime mmụọ ha. Ihe omume a bụ nkwurịta okwu dị n’etiti nne na nna na nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwanyị nọ n’afọ iri na ụma. Onye ntorobịa ahụ nọ n’ọnọdụ chọrọ ka e mee mkpebi siri ike banyere ihe mgbaru ọsọ ya n’ọdịnihu. Ọ bụ ezie na ụfọdụ nwere ike ịchọ ịchụso akụ̀ na ụba, ùgwù, ma ọ bụ ụzọ ndụ okomoko, ezinụlọ ahụ atụlee Bible iji mata ihe ọ tụrụ aro ya. (Lee Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, peeji nke 174-175; Ụlọ Nche nke August 15, 1997, peeji nke 21, na nke September 1, 1999, peeji nke 19-21, paragraf nke 1-3 na nke 5-6.) Onye ntorobịa ahụ ekweta na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchụso ụzọ ndụ nke ga-enyere ya aka iru ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke iji mee ka ọdịmma Alaeze na-aga n’ihu.
15 min: “Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Gboo Mkpa E Nwere Maka Inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze?”d (Paragraf nke 11-21) Kọwaa ihe dị iche n’onye ọrụ afọ ofufo n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze na onye ozi owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ezie na a na-eme otu ndokwa maka igbo mkpa nke ma ndị ọrụ afọ ofufo ma ndị ozi, a dịghị ele ndị na-ewepụta onwe ha ruo nwa oge ịrụ ọrụ dị ka ndị ọrụ afọ ofufo n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze anya dị ka ndị nọ n’ozi oge nile ọ gwụla ma ha anọworị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na ha bụzi ndị ọsụ ụzọ, a pụrụ idenyere ha ihe ruru awa 70 kwa ọnwa maka awa ndị ha tinyere n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị ruru eru ije ozi a pụrụ inweta fọm bụ́ Application for Kingdom Hall Construction Volunteer Program (A-25) site n’aka onyeisi oche ndị nlekọta. Ọ bụ Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-enye ndị ọrụ afọ ofufo ruru eru fọm bụ́ Application for Kingdom Hall Construction Servant (A-12). Gụọ paragraf nke 20 na Ndị Filipaị 2:2-4. Kọwaa otú ụkpụrụ ụlọ ndị dị mfe na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị na-ebughị oké ibu ga-esi mee ka e nwee ike iwu ha ngwa ngwa. Mechie site n’ịgụ paragraf nke 21.
Abụ nke 32 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.