Ụlọ Ọrụ Ndị Na-emepụta Ụtaba Adaba n’Ọnọdụ Jọgburu Onwe Ya
DỊ KA otu akụkọ pụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times nke July 26, 1995, si dị, “Ngalaba Ikpe akpọwo nzukọ òtù nnọkọ ikpe na-eleba anya n’ebubo ime mpụ na New York ime nchọpụta ma ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ụtaba hà gwara ndị ọrụ gọọmenti Etiti na-ahụ maka ihe ndị e ji eme siga okwu ụgha banyere ihe ndị e ji eme ya na mmetụta ọjọọ ndị ha na-enwe. Ma eleghị anya ngalaba ahụ ga-agbakọta na nke ugboro abụọ ya n’ebe a iji chọpụta ma ndị isi ụlọ ọrụ hà ghaara Nzukọ Ezumezu ụgha banyere ihe ndị e ji ụtaba mee.”
Gịnị bụ ndabere maka nke a? Akụkọ ahụ mere ka o doo anya. N’April 1994, ndị isi ọrụ ukwu nke ụlọ ọrụ ụtaba asaa ndị bụ isi na United States ji ọṅụṅụ iyi kwuo n’ihu kọmitii Nzukọ Ezumezu ahụ na “ha echeghị na nicotine na-eri ahụ, na siga na-akpata ọrịa ma ọ bụ na ụlọ ọrụ ha ji aghụghọ gbanwee ọ̀tụ̀tụ̀ nicotine dị n’ihe ndị e ji ụtaba mee.”
Mgbe e mesịrị, okwu ahụ pụtara ìhè—nzọrọ ha nke ịbụ ndị aka ha dị ọcha dara—mgbe e wepụtara puku abụọ nke ihe odide ndị na-emegide ha na June 1995. Ihe odide ndị a na-egosi na ndị na-eme nnyocha n’ụtaba etinyewo afọ 15 n’ịmụ banyere mmetụta nicotine na-enwe ‘n’ụzọ nkà mmụta ọgwụ’ n’ahụ, ụbụrụ, na akparamàgwà nke ndị na-ese siga. Dr. Victor DeNoble, onye bụbu ọkà mmụta sayensị na-eme nnyocha n’otu n’ime ụlọ ọrụ ndị ahụ, na-akọwa nchọpụta gbara ọkpụrụkpụ nke nnyocha ahụ, sị: “Ụlọ ahụ malitere ịghọta na ha pụrụ ibelata nsí tar, ma mee ka nicotine bakwuo ụba, onye na-ese siga ka ga-anakwerekwa ya. Mgbe ha rụsịrị ọrụ ha nile, ha chọpụtara na ọ bụghị nanị na nicotine na-akụjụ mmadụ ahụ ma ọ bụ na-akpali akpali, kama ọ na-enwe mmetụta ya n’ebe dị n’etiti, n’ụbụrụ, nakwa ná ndị mmadụ na-ese siga n’ihi mmetụta ndị ọ na-enwe n’ụbụrụ.”
Dị ka The New York Times si kwuo, ihe ọmụmụ ụlọ ọrụ gosiri na “n’agbanyeghị ụdị ndị mmadụ sere, o yiri ka ha na-enweta ọ̀tụ̀tụ̀ nicotine dị ha mkpa site n’ikumi ya ime karị, ịkpụgide anwụrụ n’ọnụ ruo ogologo oge, ma ọ bụ ise ọtụtụ siga karị.” Ndị na-emere ụlọ ọrụ nnyocha gbalịrị imepụta siga nwere ọ̀tụ̀tụ̀ nsí tar dị ala ma nwee ọ̀tụ̀tụ̀ nicotine zuru ezu iji nye afọ ojuju nke onye na-ese siga.
Ihe odide ndị ahụ gosikwuru na ụlọ ọrụ ụtaba ahụ gosipụtara mmasị dị ukwuu n’ebe ndị ahịa ya nọ. Ụmụ akwụkwọ nọ kọleji bụ ndị bụ isi o nyochara ruo ihe karịrị afọ 15. A jụrụ ndị bi n’otu obodo Iowa ajụjụ, tinyere ole na ole n’ime ndị dị afọ 14 na-ese siga, banyere àgwà ha nke ise siga.
A na-ahụ ihe ọmụma nke ihe odide nnyocha ndị a nyere dị ka oké abamuru nye ndị ọkàiwu bụ́ ndị jikọrọ aka gbaa ụlọ ọrụ ụtaba asaa akwụkwọ. Ha na-ekwu na ụlọ ọrụ ụtaba dị iche iche zoro ihe ọmụma banyere ihe ndị na-eri ahụ dị na nicotine ma gbanwee ọ̀tụ̀tụ̀ nicotine iji kwalite ihe iri ahụ. Otu ọkàiwu sịrị na ọ dịghị òtù ikpe dị n’ụwa nke ga-ekweta na ụlọ ọrụ ndị a na-eme nnyocha a dị ka ihe ntụrụndụ efu.
Ka ọnọdụ ahụ jọgburu onwe ya na-akawanye njọ ná mba ndị mepere emepe, anwụrụ ụtaba na-akwụgakarị ná mba ndị ka na-emepe emepe. Iri afọ anọ gara aga, ọ fọrọ nke nta ka a ghara inwe nwanyị ọ bụla na-ese siga, nanị ihe dịkwa ka 20 pasent nke ndị ikom n’Ebe Ndịda, ma ọ bụ ná mba ndị ka na-emepe emepe na-ese siga. Ma taa, pasent 8 nke ndị inyom nile na 50 pasent nke ndị ikom nile ná mba ndị ka na-emepe emepe na-ese ụtaba—ọnụ ọgụgụ ahụ na-arịkwa elu. “Anwụrụ,” ka ndị na-eme nnyocha na-ekwu, “na-akwụga n’Ebe Ndịda.”
Onye Nta Akụkọ Teta! Enye Akụkọ n’Ọnọdụ Ahụ
Onye na-edere anyị akụkọ nọ na Brazil na-ekwu okwu ndị metụtara ọtụtụ ihe n’ọnọdụ ahụ n’Ebe Ndịda. Nnyocha ndị e mere ná mba ndị na-emepụta ngwá ahịa na-egosi ọnọdụ na-akawanye njọ maka onye na-ese ụtaba. O nwere mmetụta nke ya. “Mba ndị ghọtaworo ịdị mkpa nke ihe ọmụma ọha mmadụ na-ahụ ugbu a mmalite nke ndalata n’ise ụtaba,” ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) na-akọ. “N’Ebe Ugwu,” ka Panos, òtù na-enye ihe ọmụma nke dị na London, na-ekwukwasị, “a dịghịzi anakwere ise siga n’ọtụtụ ebe obibi, ebe ọha na eze na ebe ọrụ dị iche iche,” ihe ka ọtụtụ n’etiti ndị mmadụ na-aghọtazi na “ise siga pụrụ igbu ha.” “Ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba na-aga n’Ebe Ndịda.”
N’ụzọ dị iche, n’Ebe Ndịda, imepe ahịa ọhụrụ na-adịzi mfe dị ka imepe ọbọ siga. Nye ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba, ọnọdụ ndị dịnụ ná mba ndị ka na-emepe emepe na-akpali mmasị. Na 3 n’ime 4 nke mba ndị ka na-emepe emepe, e nweghị mmachibido iwu n’ime mkpọsa, n’otu oge ahụkwa, ihe ọha mmadụ maara banyere ihe ize ndụ nke ise siga dị nta. “Ndị mmadụ amataghị banyere ihe ize ndụ ndị ahụ n’ihi na a gwaghị ha banyere ha,” ka Panos na-arịba ama.
Iji kpalie ụmụ agbọghọ—otu n’ime ndị ụlọ ọrụ ahụ na-elekwasịkarị anya—ịmalite ise siga, mkpọsa dị iche iche “na-egosi ise siga dị ka ihe omume mara mma, nke na-atọ ụtọ nke ndị inyom nọọrọ onwe ha na-ama ụtọ ya.” Mkpọsa ụtaba na-ada ụda dị ka ihe a na-enyo enyo nke yiri ndị e jiri mee ihe ná mba ndị mepere emepe n’ọkara narị afọ gara aga. Laa azụ n’oge ahụ, mkpọsa ndị ahụ dị irè. Tupu ọ dịtee anya, ka otu akụkọ na-ekwu, 1 n’ime ndị inyom 3 “ji ịnụ ọkụ n’obi yiri nke ndị ikom na-ese siga.”
Taa, azụmahịa eleghị anya n’azụ nke e mesiwanyere ike, bụ́ nke na-elekwasị anya ná ndị inyom na-amaghị nke a na-akọ nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe na-eme ka e jide n’aka na a gaje inweghachi “ihe ịga nke ọma” mkpọsa nke a nke afọ ndị 1920 na ndị 1930. Ya mere, atụmanya jọrọ njọ bụ na ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ n’ime mba ndị ka daa ogbenye n’ụwa nọ ugbu a n’ihe ize ndụ nke ịghọ, dị otu onye na-ekiri ihe na-emenụ si tinye ya, “ụmụ agbọghọ mara mma ndị nọ ná mmalite nke ihe iri ahụ ha.”
Ndị A Kasị Elekwasị Anya
Ọ bụ ezie na ndị inyom bụ otu n’ime ndị ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba kasị elekwasị anya, ndị na-eto eto bụ ndị ọ kasị elekwasị anya. Mkpọsa ndị e mere n’ụdị ihe osise na-atọ ọchị na okwu ndị e ji amata siga ndị e dere n’ihe ụmụaka ji egwu egwu na-eweta uru, otú ahụkwa ka ọ dị nhazi ihe omume egwuregwu dị iche iche.
Na China, ka magazin bụ́ Panoscope na-akọ, ndị na-eto eto “na-amalite ise siga n’ọnụ ọgụgụ bara ụba.” Ihe dị ka 35 pasent nke ndị dị afọ 12 ruo 15 na pasent 10 nke ndị dị afọ 9 ruo 12 na-ese siga. Na Brazil, ka akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị bụ́ Folha de S. Paulo na-akọ, ihe dị ka nde iri ndị ntorobịa na-ese siga. Ọ̀ bụ na ha amataghị ihe ize ndụ ndị dịnụ? “Amatara m na ise siga na-emerụ ahụ,” ka Rafael, nwa okoro Brazil dị afọ 15 nke na-ese otu ọbọ siga na ọkara kwa ụbọchị na-ekwu, “ma ọ dị mma nke ukwuu.” Gịnị si n’iche echiche ọ̀ gbasara m nke a apụta? “Kwa ụbọchị,” ka Panos na-akọ, “ọ dịkarịa ala 4,000 ndị ọzọ na-eto eto na-amalite ise siga.”
Ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba na-ebuga n’Ebe Ndịda siga ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke nsí tar na nicotine karịa ụdị ndị a na-ere n’Ebe Ugwu. Ihe kpatara ya doro anya. “Adịghị m arịọ mgbaghara maka nicotine,” ka otu onye isi ọrụ nke ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba kwuru n’afọ ole na ole gara aga. “Ọ bụ ihe na-eweta azụmahịa na-aga n’ihu. Ọ bụ ihe na-eme ka ndị mmadụ na-abịaghachi.” Ọ dị irè. “N’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị elu nke nicotine,” ka akwụkwọ ndị Netherlands bụ́ Roken Welbeschouwd (Ise Siga—Ịtụle Ihe Nile) na-emesi ike, “a na-enwe ndabere ngwa ngwa karị, nke a na-emeghekwa ohere dị iche iche iji mụbaa ise na ire ya site n’iji nwayọọ nwayọọ na-ewetu ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ahụ.”
“Ụlọ ọrụ na-emepụta ụtaba,” ka Panos na-ekwubi, “na-ele Ebe Ndịda anya dị ka ahịa nke ga-eme ka ụlọ ọrụ ahụ nọgide n’achụmnta ego.”
Ise Siga Ka Ọ̀ Bụ Ịnọgide Na-adị Ndụ?
Ọ bụrụ na i bi ná mba ka na-emepe emepe, gịnị ka ị ga-eme? Eziokwu ndị ahụ doro anya. Ruo 1950, ọnwụ ndị sitere n’ọrịa ndị ise siga na-akpata adịghị ọtụtụ, ma taa otu nde mmadụ n’Ebe Ndịda na-anwụ kwa afọ site n’ọrịa ndị ise siga na-akpata. Otú ọ dị, òtù WHO na-adọ aka ná ntị na n’ime iri afọ atọ, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ kwa afọ n’ihi ise siga ná mba ndị ka na-emepe emepe ga-arị elu ruo nde asaa. N’ụzọ megidere ihe mkpọsa ụtaba na-agwa gị, siga bụ nnọọ ihe na-egbu egbu.
Ị̀ na-ekwu na ị matara ihe ize ndụ ndị dịnụ? Ọ dị mma, ma gịnị ka ị ga-eji ihe ọmụma ahụ mee? Ị̀ ga-adị ka onye ahụ na-ese siga nke gụworo ọtụtụ ihe ọjọọ banyere ise siga nke na o kpebiri ịkwụsị ịgụ? Ka ị̀ ga-adị nkọ ruo n’ókè ịhụ aghụghọ dị ná mkpọsa ụtaba ma sị ee e nye ise siga? N’eziokwu, anwụrụ ụtaba na-akwụga n’Ebe Ndịda—ma ọ bụghị iwu na ọ ga-akwụga n’ebe ị nọ!
[Igbe dị na peeji nke 19]
China—Ọkaibe
Zhang Hanmin, onye ọrụ na China nke gbara 35 afọ, na-ekpuchitụ aka ya abụọ ma mụnye ọkụ na siga. “N’ikwu eziokwu,” ka ọ na-ekwu, “m pụrụ ịgbahapụ ọtụtụ ihe, ma siga abụghị otu n’ime ha.” O yiri ka a pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere 300 nde ndị ọzọ ha na Zhang sitere otu mba. Kemgbe afọ ndị 1980, China ‘emepụtawo, ree ma see siga karịa mba ọ bụla.’ N’otu afọ na-adịbeghị anya, “e resịrị ụba mmadụ ise siga riri ahụ ọtụtụ ijeri siga,” na-eme China “mba bụ ọkaibe n’ụtaba.”—Magazine Panoscope.
[Igbe dị na peeji nke 20]
Siga Ọ̀ Na-enwe “Ihe Akaebe”?
N’agbanyeghị na nde mmadụ atọ na-anwụ kwa afọ n’ihi ọrịa ndị ụtaba na-akpata, mkpọsa dị iche iche nọgidere na-agwa ndị na-ese siga na àgwà ha adịghị ize ndụ. Dị ka ihe atụ, otu mkpọsa e mere n’oge na-adịbeghị anya n’ime otu magazin mba Brazil kpọsara mpụta nke otu ụdị siga nke “na-eji ihe akaebe ụlọ ọrụ mmepụta ihe abịa.” Mkpọsa ahụ na-emesi obi ike, sị: “Ụgbọ ala gị nwere ihe akaebe; TV gị nwere ihe akaebe; mgbanaka elekere gị nwere ihe akaebe. Siga gị nwekwara.” Otú ọ dị, dị ka mkpọsa ndị ahụ na-egosipụta na dị ka ndị na-ese siga ọrịa ha na-adịghị ala ala pụrụ ịgba akaebe ya, nanị ihe akaebe dịnụ bụ na “ise siga na-emebi ahụ ike.”
[Foto dị na peeji nke 19]
Ndị a kasị na-elekwasị anya—ndị inyom nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto òtù WHO nke L. Taylor sere
[Foto dị na peeji nke 20]
Ọ̀ bụ na ha amaghị ihe ize ndụ ndị dịnụ?
[Ebe E Si Nweta Foto]
Òtù WHO