Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 46
  • Mgbidi Jeriko

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbidi Jeriko
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Rehab Zoro Ndị Nnyopụta
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Rehab Ezobe Ndị Nledo
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Rehab Kweere na Jehova
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • E ‘Sitere n’Ọrụ Ya Kpọọ Ya Onye Ezi Omume’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 46
Mgbe Jọshụa du ndị Izrel ha ana-eti mkpu, na-afụ opi, mgbidi Jeriko ana-adakwa

AKỤKỌ NKE 46

Mgbidi Jeriko

GỊNỊ mere mgbidi Jeriko ndị a ji na-ada? O yiri ka à ga-asị na a tụrụ ha otu nnukwu bọmbụ. Ma n’oge ahụ, e nweghị bọmbụ; e nweghịdị égbè ọ bụla. Ọ bụ ọrụ ebube ọzọ nke Jehova! Ka anyị hụ otú o si mee.

Gee ntị n’ihe Jehova gwara Jọshụa: ‘Gị na ndị agha gị ga-agagharị gburugburu obodo ahụ. Gagharịanụ ya gburugburu otu ugbo n’ụbọchị ruo ụbọchị isii. Burunụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ mgbe unu na-agagharị. Ndị nchụàjà asaa ga-anọ n’ihu na-afụ opi.

‘N’ụbọchị nke asaa, unu ga-agagharị obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Fụọnụ opi ike ruo ogologo oge, meekwanụ ka mmadụ niile tie oké mkpu agha. Mgbidi ahụ ga-adaru ala!’

Mgbidi Jeriko niile dara. Naanị ihe na-adaghị bụ ụlọ Rehab, bụ́ ebe e kenyere eriri uhie

Jọshụa na ndị Izrel mere ihe Jehova kwuru. Mgbe ha na-azọ ije, mmadụ niile gbachiri nkịtị. Ọ dịghị onye kwuru okwu. Naanị ihe a pụrụ ịnụ bụ opi ike na ije ụkwụ. Ndị iro nke ndị Chineke nọ na Jeriko aghaghị ịtụworị egwu. Ị̀ na-ahụ eriri uhie ahụ nke e kedoro na windo? Windo ònye ka ọ bụ? N’ezie, Rehab emewo ihe ndị nledo ahụ gwara ya mee. Ya na ndị ezinụlọ ya niile nọ n’ime ụlọ ahụ na-ekiri ihe na-emenụ.

N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke asaa, mgbe ha gagharịrị obodo ahụ gburugburu ugboro asaa, opi ike nọ na-ada, ndị agha ana-eti mkpu, mgbidi ahụ niile wee daa. Jọshụa wee sị ha: ‘Gbuonụ onye ọ bụla n’ime obodo ahụ, suokwanụ ya ọkụ. Suonụ ihe niile ọkụ. Chebenụ naanị ọlaọcha, ọlaedo, ọla kọpa na ígwè, weganụ ha n’ụlọ akụ̀ nke ụlọikwuu Jehova.’

Jọshụa gwara ndị nledo abụọ ahụ, sị: ‘Gaanụ n’ụlọ Rehab, kpọpụtanụ ya na ndị ezinụlọ ya nile.’ A zọpụtara Rehab na ndị ya dị ka ndị nledo ahụ kwere ya nkwa.

Joshua 6:1-25.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya