Isi 119
A Kpọgaara Ya Anas, E Mesịakwa Kpọgara Ya Kaịafas
E DUURU Jisọs, onye e kere agbụ dị ka onye omempụ nkịtị, jekwuru Anas, onye ahụ a ma ama nke bụbu onye isi nchụàjà. Anas bụ onye isi nchụàjà n’oge ahụ mgbe Jisọs, dị ka nwa okoro dị afọ 12, mere ihe tụrụ ndị rabaị ndị na-ezi ihe n’ụlọ nsọ ahụ n’anya. Ọtụtụ n’ime ụmụ Anas mesịrị jee ozi dị ka ndị isi nchụàjà, n’oge a kwa, ọgọ ya nwoke bụ Kaịafas nọ n’ọkwá ahụ.
Ma eleghị anya e bu ụzọ duru Jisọs jee n’ụlọ Anas n’ihi eziokwu nke bụ na ruo ogologo oge, onye isi nchụàjà ahụ bụ onye a ma ama ná ndụ okpukpe nke ndị Juu. Nkwụsịtụ nke a e mere ije hụ Anas nyere ohere ka Onye isi Nchụàjà ahụ bụ Kaịafas kpọkọta ndị òtù Sanhedrin, bụ́ ụlọ ikpe ukwu ndị Juu ahụ nke nwere 71 ndị òtù, tinyekwara ịchịkọta ndị akaebe ụgha.
Ugbu a, onye isi nchụàjà ahụ bụ Anas jụrụ Jisọs ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya, banyekwara ozizi ya. Otú ọ dị, Jisọs zaghachiri, sị: “Mụ onwe m agwawawo ụwa okwu; mụ onwe m ziri ihe mgbe nile n’ụlọ nzukọ, na n’ụlọ ukwu Chineke, ebe ndị Juu nile na-agbakọ; ekwukwaghị m ihe ọ bụla na nzuzo. Gịnị mere ị na-ajụ mụ onwe m? Jụọ ndị nụworo okwu m, ihe m gwara ha: lee, ndị a matara ihe nile mụ onwe m kwuru.”
Na nke a, otu n’ime ndị ahụ na-eje ozi ndị guzo ya nso mara Jisọs ọra n’ihu na-asị: “Ị̀ na-aza onye isi nchụàjà otú a?”
Jisọs zaghachiri, sị, “Ọ bụrụ na m kwuru nke ọjọọ, gbaara ihe ọjọọ ahụ àmà: ma ọ bụrụ nke ọma, gịnị mere ị na-eti m aka?” Mgbe mkparịta ụka nke a gasịrị, Anas zipụrụ Jisọs n’agbụ jekwuru Kaịafas.
Ka ọ dị ugbu a, ndị isi nchụàjà na ndị okenye nile na ndị odeakwụkwọ, ee, Sanhedrin ahụ dum, amalitewo izukọta. Ihe àmà gosiri na ebe nzukọ ha bụ n’ụlọ Kaịafas. Inwe nnọkọ ikpe dị otú ahụ n’anyasị Ememe Ngabiga doro anya na o megidere iwu ndị Juu. Ma nke a emeghị ka ndị ndú okpukpe ahụ laa azụ ná nzube ọjọọ ha.
Ọtụtụ izu tupu oge a, mgbe Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ, Sanhedrin ahụ ekpebiworị n’etiti onwe ha na ọ ghaghị ịnwụ. Nanị ụbọchị abụọ tupu mgbe ahụkwa, na Wednesday, ndị isi okpukpe gbakọtara izu iji ụzọ aghụghọ jide Jisọs ma gbuo ya. Cheedị nnọọ echiche banyere nke ahụ, a maworị ya ikpe ọnwụ tupu a malite ikpe ya ikpe!
A na-eme mgbalị ugbu a ịchọta ndị akaebe ndị ga-enye ihe àmà ụgha ka e wee nwee ike ịhụ ihe a ga-eji kpee Jisọs ikpe. Otú ọ dị, ọ dịghị ndị akaebe ọ bụla a pụrụ ịchọta, bụ́ ndị ga-ekwekọ n’àmà ha gbara. Mgbe e mesịrị, mmadụ abụọ pụtara wee kwuo, sị: “Anyị onwe anyị nụrụ ka ọ na-asị, Mụ onwe m ga-akwatu ụlọ nsọ a nke e jiri aka mee, n’ụbọchị atọ m ga-ewukwa ụlọ ọzọ nke a na-ejighị aka mee.”
Kaịafas jụrụ, sị, “Ị́ zaghị ihe ọ bụla? Gịnị bụ àmà mmadụ ndị a na-agbagide gị?” Ma Jisọs ekwughị ihe ọ bụla. Ọbụna n’ebubo ụgha nke a, n’ịbụrụ Sanhedrin ahụ ihe ihere, ndị akaebe ahụ apụghị ime ka akụkọ ha kwekọrịta. Ya mere, onye isi nchụàjà ahụ nwalere ụzọ aghụghọ dị iche.
Kaịafas maara otú ọ na-esi emetụta ndị Juu n’ahụ nke ukwuu banyere onye ọ bụla nke na-ekwu na ya bụ Ọkpara nke Chineke. N’oge abụọ dị iche iche tupu mgbe ahụ, ha adịwo oké ngwa n’ịkpọ Jisọs onye nkwulu nke kwesịrị ọnwụ, na-eche echiche n’ụzọ na-ezighị ezi n’otu mgbe na ọ na-ekwu na ya na Chineke hà nhata. Ugbu a, Kaịafas ji ụzọ aghụghọ kwuo, sị: “Ewere m Chineke dị ndụ gbaa gị iyi, ka ị gwa anyị ma gị onwe gị ọ̀ bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke!”
N’agbanyeghị ihe ndị Juu ahụ na-eche, Jisọs bụ n’ezie Ọkpara Chineke. A pụkwara ịghọta ya dị ka ngọpụ nke ọbụbụ ọ bụ Kraịst ahụ ma ọ bụrụ na ọ gbachi nkịtị. Ya mere Jisọs ji obi ike zaghachi, sị: “Mụ onwe m bụ ya: unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-anọdụ n’aka nri nke ike, na-abịakwa, ya na igwe ojii nile nke eluigwe.”
Mgbe nke a mere, Kaịafas, n’oké ngosipụta nke iwe, dọwara uwe ya, wee tie mkpu, sị: “O kwuluru Chineke: ọ̀ bụ mkpa ndị àmà gịnị na-akpa anyị ọzọ? Lee, ugbu a ka unu nụrụ nkwulu ahụ: gịnị bụ uche unu?”
Sanhedrin ahụ wee kwupụta, sị, “O kwesịrị ịnwụ ọnwụ.” Ha wee malite ime ya ihe ọchị, ha kwukwara ọtụtụ okwu nkwulu megide ya. Ha tiri ya aka n’ihu, wee bụọ ya ọnụ mmiri n’ihu. Ndị ọzọ kpuchiri ihu ya wee tie ya aka wee kwuo n’ụzọ ịkwa imo, sị: “Buoro anyị amụma, Kraịst: Ònye bụ onye ahụ nke tiri gị aka?” Omume mkparị nke a megidere iwu weere ọnọdụ n’oge ikpe ahụ e kpere n’anyasị. Matiu 26:57-68; 26:3, 4; Mak 14:53-65; Luk 22:54, 63-65; Jọn 18:13-24; 11:45-53; 10:31-39; 5:16-18.
▪ Olee ebe e bu ụzọ duru Jisọs jee, gịnịkwa mere ya n’ebe ahụ?
▪ Olee ebe ọzọ a kpọjere Jisọs, ọ̀ bụkwa maka nzube dị aṅaa?
▪ Olee ụzọ Kaịafas si nwee ike ime ka òtù nnọkọ Sanhedrin kwupụta na Jisọs kwesịrị ịnwụ ọnwụ?
▪ Omume mkparị dị aṅaa nke megidere iwu weere ọnọdụ n’oge ikpe ahụ?