Abụ 152
Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị
O Jehova, i meela nye anyị
ezigb’olileanya.
Ọ n’eme anyị niil’obi ụtọ.
A’yị g’agwa ya ndị ọzọ.
Ma mgb’ụfọdụ, nsogb’ụwa n’eme
k’anyị bido tụw’ụjọ,
Ọ n’eme k’anyị chefuwe
ezi olileany’ahụ.
(KORỌS)
Ọ bụ gị bụ ike anyị,
n’olileany’anyị.
Ị n’enye any’ihe dị anyị mkpa.
Anyị n’eji ob’ike,
ekwus’ozi ọma
n’ihi n’ọ bụ gị n’edu anyị.
Jehova, biko nyer’anyị aka
k’anyị ghar’ichefu,
N’ọ bụ gị n’akasi anyị obi
ná nsogbu anyị niile.
Anyị g’enw’ezigb’olileanya
m’anyị n’echet’ihe ndị a,
Ha n’eme k’anyị nwe’ob’ike
ịkpọs’ah’ukwu gị.
(KORỌS)
Ọ bụ gị bụ ike anyị,
n’olileany’anyị.
Ị n’enye any’ihe dị anyị mkpa.
Anyị n’eji ob’ike,
ekwus’ozi ọma
n’ihi n’ọ bụ gị n’edu anyị.
(Gụọkwa Ọma 72:13, 14; Ilu 3:5, 6, 26; Jere. 17:7.)