Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 10/1 p. 19-24
  • Ịgbaso Nzọụkwụ nke Ndị Mụrụ M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgbaso Nzọụkwụ nke Ndị Mụrụ M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi Papa M Maka Alaeze Ahụ
  • Ozi Ikwesị Ntụkwasị Obi nke Mama M
  • Ozi Oge Ntorobịa
  • Agha Ụwa nke Abụọ Etiwapụ
  • Ozi Oge Nile Na-enye Obi Ụtọ
  • Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị Bara Ụba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ihe Nketa Ndị Kraịst nke Dị Ụkọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nne na Nna Anyị Kụziiri Anyị Ịhụ Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Agaghị M Agbanwe Ihe Ọ Bụla!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 10/1 p. 19-24

Ịgbaso Nzọụkwụ nke Ndị Mụrụ M

DỊ KA HILDA PADGETT SI KỌỌ

“Araara m ndụ m nye n’ije ozi nke Onye Kasị Ihe Nile Elu,” ka akụkọ akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu, “apụghịkwa m ijere nna ukwu abụọ ozi.” Okwu ndị ahụ sitere n’ihe m degaara ndị isi nke Ụlọ Ọrụ Britain Na-ahụ Maka Ọrụ na Ozi Mba na 1941 gosipụtara ihe kpatara ọjụjụ m jụrụ ntụzi ha ịrụ ọrụ ụlọ ọgwụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ntakịrị oge ka e mesịrị, a mara m ikpe ma tụọ m nga ọnwa atọ n’ihi ọjụjụ m jụrụ.

GỊNỊ tinyere m ná nsogbu a? Ee e, ọ bụghị mkpali ntorobịa ma ọ bụ àgwà nnupụisi. Kama nke ahụ, ihe ndị kpatara ya malitererị laa azụ n’oge m bụ nwata.

Ịnụ Ọkụ n’Obi Papa M Maka Alaeze Ahụ

A mụrụ m na June 5, 1914, na Horsforth n’ebe dịdewere Leeds, n’ebe ugwu nke England. Ndị mụrụ m, bụ́ Atkinson na Pattie Padgett, bụ ndị nkụzi Sunday school na ndị òtù ukwe na Primitive Methodist Chapel bụ́ ebe papa m na-akpọ ngwá egwú bụ́ organ. Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, ebe obibi anyị bụ nke obi ụtọ ma e wezụga otu ihe. Papa m na-enwe nchegbu banyere ọnọdụ ụwa. Ọ kpọrọ agha na ime ihe ike asị, o kwenyekwara n’iwu ahụ Bible nyere: “I kwesịghị igbu ọchụ.”—Ọpụpụ 20:13, King James Version.

Na 1915 gọọmenti gbara ụmụ okorobịa nile ume iji aka ha banye soja wee si otú a zere ịbụ ndị e debara aha ha ná nrụgide. N’obi abụọ papa m guzoro ruo chi ojiji n’ime mmiri ozuzo na-eche ka o rutere ya ideba aha ya dị ka onye soja. Echi ya kpọmkwem, ndụ ya gbanwere kpam kpam!

Ka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye na-edozi okporo ígwè mmiri si aga n’otu nnukwu ụlọ, o sooro ndị ọrụ ndị ọzọ na-ekwurịta banyere ihe ndị na-eme n’ụwa. Onye na-elekọta ubi ebe ahụ nyefere ya otu ntakịrị traktị bụ́ Gathering the Lord’s Jewels. Papa m jiri ya lọta ụlọ, gụọ ya, gụgharịakwa ya. “Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu,” ka o kwuru, “ọ pụtara na ihe ndị ọzọ nile dị njọ.” Echi ya, ọ rịọrọ maka inwetakwu ihe ọmụma, ruokwa izu atọ, ọ na-amụ Bible ruo n’isi ụtụtụ. Ọ maara na ya achọtawo eziokwu ahụ! Sunday, January 2, 1916, akwụkwọ ihe ndekọ ya na-asị: “Ejere m Chapel n’ụtụtụ, jiri abalị gaa I.B.S.A. [Òtù Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ n’England]—na-amụ Ndị Hibru 6:9-20—ojije mbụ m jere na nke ụmụnna ahụ.”

Mmegide bilitere n’oge na-adịghị anya. Ndị ikwu anyị na ndị enyi anyị na chọọchị chere na isi emebiela papa m. Ma o mewo mkpebi ya. Ndụ ya nile bụ nzukọ na ọmụmụ ihe, ka ọ na-erule March o gosipụtara nrara ya nye Jehova site na baptism ime mmiri. Mgbe ọ gasịrị izu ole na ole papa m nọ na-eje nzukọ nanị ya, mama m kwụsịrị iguzogide ya ịga nzukọ. O tinyere m n’ihe e ji akwagharị ụmụaka wee gaa ije kilomita asatọ ruo Leeds, na-abịarute ka nzukọ ka mechisịrị. Lee ọṅụ papa m nwere. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, e jikọtara ezinụlọ anyị n’ozi Jehova.

Ọnọdụ papa m nọ n’ime ya siri nnọọ ike—onye ji aka ya banye soja ma ghọọ onye jụrụ n’ihi akọ na uche ya n’ime izu ole na ole. Mgbe a kpọrọ ya, ọ jụrụ ibu égbè, ka ọ na-erukwa July 1916 o chere nke mbụ n’ime ikpe ise nke ụlọikpe ndị agha ihu, bụrụ onye a mara ikpe ije mkpọrọ ruo 90 ụbọchị. Mgbe ọ nọsịrị mkpọrọ nke mbụ, papa m nwere ezumike izu abụọ, bụ́ nke ikpe ọzọ nke ụlọikpe ndị agha na ije mkpọrọ ruo 90 ụbọchị ọzọ sochiri. Mgbe o jesịrị mkpọrọ nke abụọ ya, e bufere ya n’òtù ndị agha bụ́ Royal Army Medical Corps, na February 12, 1917 kwa, o ji ụgbọ mmiri ndị agha gawa Rouen, France. Akwụkwọ ndekọ ihe ya na-akọ na n’ebe ahụ ọ kpọwanyere ọnọdụ ya asị kwa ụbọchị. Ọ chọpụtara na nanị ihe ya na-eme bụ ilekọta ndị agha merụrụ ahụ ka ha wee laghachi ịlụ agha.

Ọzọkwa ọ jụrụ. Na nke ugbu a ụlọikpe ndị agha ahụ mara ya ikpe mkpọrọ afọ ise n’ụlọ mkpọrọ ndị agha Britain dị na Rouen. Mgbe papa m nọgidere na-arịọ ka e bufee ya n’ụlọ mkpọrọ ndị nkịtị dị ka onye jụrụ n’ihi akọ na uche ya, e jiri ọnwa atọ nke ịta nanị bred na mmiri taa ya ahụhụ, bụ́ nke ihe oriri ụlọ mkpọrọ sochiri ruokwa mgbe o butụrụ ibu; mgbe ahụ a maliteghachiri usoro ahụ. N’ehihie a na-atụ ya ị́gà n’aka na-achịfe ya aka azụ ma a na-achịfeta ya aka n’ihu n’abalị na n’oge nri. Ogologo ndụ ya nile, o bu àpà ná nkwoji aka ya ebe ị́gà ahụ dị ntakịrị nke ukwuu kpadoro anụ ahụ ya, na-akpata ọnyá na-agba abụ. A tụkwara ya ị́gà n’ụkwụ bụ nke e jikọtara ya na úkwù ya.

Ndị isi soja mere ihe nile ike ha ruru iji kụda mmụọ ya ma o nweghị isi. A napụrụ ya Bible na akwụkwọ ya nile. O nwetaghị akwụkwọ ozi ọ bụla site n’ụlọ, nke o ji enwekwanụ ike izipụ nke ọ bụla. Mgbe afọ abụọ gasịrị o kpebiri igosipụta obi eziokwu ya site n’ịjụ iri ihe. Ruo ụbọchị asaa ọ nọgidere ná mkpebi ya, n’erighị ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe, na-arụpụta ịbụ onye e bufere n’ụlọ ọgwụ nke ụlọ mkpọrọ, na-arịasi ọrịa ike. O gosipụtara obi eziokwu ya, ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ n’ihi ya. N’afọ ndị sochiri ka e mesịrị, o kwetara na ya emezighị emezi isi otú a tinye ndụ ya n’ihe ize ndụ, na ya agaghị emekwa otú ahụ ọzọ.

Agha ahụ kwụsịrị na November 1918 mgbe papa m ka nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rouen, ma ná mmalite nke afọ na-esonụ, e bufere ya n’ụlọ mkpọrọ ndị nkịtị dị n’England. Lee ọṅụ o nwere ịnata akwụkwọ ozi na ngwugwu nile nke mama m zijeere ya bụ́ ndị tụkọbaworo, tinyere Bible na akwụkwọ ya nile dị oké ọnụ ahịa nye ya! E bugara ya Ụlọ Mkpọrọ Winchester, bụ́ ebe o zutere otu nwanna nwoke na-eto eto onye ahụmahụ ya nile n’oge agha yiri nke ya. Aha ya bụ Frank Platt, bụ́ onye mesịrị jee ozi na Betel dị na London ruo ọtụtụ afọ. Ha mere ndokwa izute echi ya, ma tupu oge ahụ e zipụwo Frank gaa n’ebe ọzọ.

N’April 12, 1919, mama m natara ozi teligram: “Haleluya! Ana m alọta ụlọ—m na-akpọ London na fon.” Lee oge ịṅụrị ọṅụ nke ahụ bụ ka afọ atọ nke ule, nnwale, na nkewa gasịrị! Ihe mbụ gbatara papa m n’uche bụ ịkpọ na fon na izute ụmụnna nọ na Betel na London. Na 34 Craven Terrace, o nwetara nnabata ịhụnanya. Mgbe ọ sasịrị ahụ, kpụọkwa afụ ọnụ ya ma yiri uwe suit na okpu a gbazitere agbazite, papa m lọtara ụlọ. Cheedị echiche banyere njikọghachi anyị. Adị m ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ ise mgbe ahụ, echetaghịkwa m onye ọ bụ.

Nzukọ mbụ papa m jere ka o nweresịịrị onwe ya bụ Ememe Ncheta. Ka ọ na-arị elu stepụ ụlọ nzukọ ahụ, ònye ka ọ hụrụ ma ọ bụghị Frank Platt, bụ́ onye e bufeworo n’ụlọ ọgwụ ndị agha dị na Leeds. Lee ọṅụ ha nwere ikerịta ahụmahụ ha! Malite mgbe ahụ gaa n’ihu ruo mgbe a tọhapụrụ ya, Frank mere ụlọ anyị ebe obibi ya nke abụọ.

Ozi Ikwesị Ntụkwasị Obi nke Mama M

N’oge ahụ nile papa m na-anọghị ya, mama m na-asara ndị mmadụ uwe iji tinyekwuo ná ntakịrị ego ndị gọọmenti na-enye ya. Ụmụnna gosiri anyị nnọọ obi ọma. Izu ole na ole ọ bụla otu n’ime ndị okenye ọgbakọ na-enye ya ntakịrị ngwugwu nke onyinye a na-akpọghị aha onye nyere ya dị n’ime ya. Mama m na-ekwu mgbe nile na ọ bụ ịhụnanya nke ụmụnna mere ka ya nọrọ Jehova nso ma nyere ya aka ịtachi obi n’oge ndị ahụ siri ike. O jiri ikwesị ntụkwasị obi jee nzukọ ọgbakọ n’oge nile papa m na-anọghị ya. Ule kasị sie ike o nwetara bụ mgbe, ruo ihe karịrị otu afọ, ọ maghị ma papa m ọ̀ dị ndụ ka ọ nwụrụ anwụ. Dị ka ibu ọzọ a tụkwasịrị ya, na 1918 ma mụ ma mama m butere ọrịa ahụ ọkụ sitere Spain. Ndị mmadụ na-anwụ gburugburu anyị. Ndị agbata obi jere inyere ndị agbata obi aka butere ọrịa ahụ ma nwụọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ụkọ nri ndị e nwere n’oge ahụ soro belata ikike nke ahụ ndị mmadụ nwere iguzogide ọrịa.

Okwu Pita onyeozi ghọrọ nnọọ eziokwu maka ezinụlọ anyị: “Mgbe unu hụworo ahụhụ nwa oge, [Chineke] . . . ga-eme ka unu . . . dị ike, tọọkwa unu ntọala”! (1 Pita 5:10) Ahụhụ ndị mụrụ m tara kụnyere n’ime ha okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ, mmesi obi ike dị ike na ọ na-eche banyere anyị nakwa na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke. A gọziri m agọzi karịsịa inwe nzụlite dị otú ahụ n’okwukwe.—Ndị Rom 8:38, 39; 1 Pita 5:7.

Ozi Oge Ntorobịa

Mgbe a tọhapụsịrị papa m, ozi Alaeze ghọrọ ebe ndụ anyị hiwere isi. Apụghị m icheta mgbe ọ bụla m hapụrụ otu nzukọ, e wezụga n’ihi ọrịa. N’oge na-adịghị anya mgbe ọ lọtasịrị n’ụlọ, papa m rere kamera ya e ji ese ihe ndị e sere n’elu enyo na ihe olu ọlaedo nke mama m iji nweta ego iji jee otu mgbakọ. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ego maka ịga ezumike, ọ dịghị mgbe nnọkọ ndị a funahụrụ anyị, gụnyere ndị e mere na London.

Afọ abụọ ma ọ bụ atọ ndị mbụ mgbe agha ahụ gasịrị bụ oge inweta ume ọhụrụ. Papa m na mama m jiri ohere nile nke nnọkọrịta na mkpakọrịta mee ihe n’ụzọ zuru ezu. M ka pụrụ icheta otú anyị ga-esi jee leta ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ọzọ, mụ kwa, dị ka obere nwatakịrị nwanyị, ga-anọrọ na-ese ihe osise ebe ndị tọrọ m ga na-enwe nkwurịta okwu ruo ọtụtụ hour banyere nghọta ndị ọhụrụ nke eziokwu. Ikwurịta okwu, iji ngwá egwú organ na-abụ abụ, inwe nnọkọrịta ndị na-enye obi ụtọ, mere ka ha nwee obi ụtọ na ume ọhụrụ dị ukwuu.

Ndị mụrụ m gbasiri aka ike n’ọzụzụ m. Adị m iche n’ụlọ akwụkwọ, ọbụna mgbe m dị afọ ise, na-eji “Agba Ọhụrụ” m eje akwụkwọ maka ịgụ ya mgbe klas na-amụ katikizim. Ka e mesịrị a kpọpụtara m n’ihu ụlọ akwụkwọ dum dị ka “onye jụrụ n’ihi akọ na uche ya” n’ihi na m gaghị ekere òkè n’ememe Ụbọchị Ncheta.a Adịghị m akwa ụta maka otú e si zụlite m. N’ezie, ọ bụ ihe nchebe, meekwa ka ọ dị mfe karị ịnọgide ‘n’ụzọ ahụ dị warara.’ Ebe ọ bụla ndị mụrụ m jere, nzukọ ma ọ bụ ozi, eso m ha eje.—Matiu 7:13, 14.

Ana m echetakarịsị ụtụtụ Sunday ahụ mgbe mbụ m malitere ime nkwusa n’onwe m. Adị m nanị afọ 12. Mgbe m nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, apụrụ m icheta oge m mara ọkwa n’otu ụtụtụ Sunday na m ga-anọ n’ụlọ. Ọ dịghị onye katọrọ m ma ọ bụ manye m ije, ya mere anọdụrụ m n’ubi na-amụ Bible m ma na-enwe oké mwute. Otu izu ma ọ bụ abụọ ka nke a gasịrị, asịrị m papa m: “Echere m na m ga-eso gị n’ụtụtụ a!” Site mgbe ahụ gaa n’ihu ọ dịghị mgbe m leghachiri anya azụ.

Lee afọ mara mma nke 1931 bụ! Ọ bụghị nanị na anyị natara aha ọhụrụ anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova, kama e mikpuru m n’ime mmiri ka a nọ ná mgbakọ mba n’Alexandra Palace, London. Agaghị m echefu ụbọchị ahụ echefu. Anyị yi uwe mwụda ogologo dị ojii, ọ dabakwara na nke m yi dị mmiri bụ́ nke onye ọzọ jiworo mee ihe!

Ọchịchọ m mgbe nile n’oge m bụ nwata bụ ịbụ onye colporteur, dị ka e si maara ndị nkwusa oge nile n’oge ahụ. Ka m mere okenye karị, echere m na m kwesịrị ime ihe karị n’ozi Jehova. Ya mere na March 1933, mgbe m dị afọ 18, esonyere m ná ndị na-eje ozi oge nile.

Ihe na-enye anyị ọṅụ pụrụ iche bụ “Izu Ndị Ọsụ Ụzọ” n’obodo ukwu ụfọdụ, mgbe ihe ruru ndị na-eje ozi oge nile iri na abụọ ga-abịakọta ọnụ, soro ụmụnna nọ n’ógbè ahụ nọrọ, ma rụkọọ ọrụ dị ka otu ìgwè. Anyị nyere ndị ndú okpukpe na ndị ọzọ a ma ama akwụkwọ nta. Ọ chọrọ obi ike iji jekwuru ha. Ihe ka n’ọtụtụ mgbe a na-eji nleda anya anabata anyị, e mechibidokwara ọtụtụ n’ime anyị ụzọ. Ọ bụghị na nke a nyere anyị nsogbu n’obi, n’ihi na ịnụ ọkụ n’obi anyị dị ukwuu nke na anyị ṅụrịrị ọṅụ ịbụ ndị a kọchara n’ihi aha Kraịst.—Matiu 5:11, 12.

Na Leeds anyị rụgharịrị ihe e ji akwagharị ụmụaka, ịnyịnya ígwè nwere ụkwụ atọ, na ọgba tum tum papa m na ụlọ ọgba tum tum na-adọkpụ, ka e mesịkwara ụgbọ ala ya na-ebu ígwè okwu. Ụmụnna abụọ ga-eburu ígwè okwu ahụ banye n’okporo ámá, tinye rekọd na-akpọ egwú iji mee ka ndị mmadụ mara ma pụta n’ọnụ ụzọ ha, jirizie okwu ga-ewe minit ise nke okwu Nwanna Rutherford gụnyere na rekọd sochie ya. E mesịa ha agafee n’okporo ámá na-esonụ ebe anyị, bụ́ ndị nkwusa, ga-esochi ma na-enyefe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.

Ruo ọtụtụ afọ, n’uhuruchi Sunday ọ bụla mgbe nzukọ mechisịrị, anyị ga-eje na Town Hall Square bụ́ ebe e nwere Ebe Onye Ọkà Okwu Na-anọ ma kwadoo ya site n’ịṅa ntị n’okwu ndị ahụ ga-ewe otu hour nke Nwanna Rutherford, na-enyefe mpempe akwụkwọ ma na-akpọtụrụ onye ọ bụla gosiri mmasị. Anyị ghọrọ ndị a maara nke ọma n’ebe ahụ. Ọbụna ndị uwe ojii na-akwanyere anyị ùgwù. N’otu uhuruchi, anyị zukọtara dị ka anyị na-emebu mgbe anyị nụrụ ụda ị̀gbà na ngwá egwú n’ebe dịtụ anya. N’oge na-adịghị anya ìgwè ndị Fascist dị ihe dị ka otu narị zọọrọ ije gbadata n’okporo ụzọ ahụ. Ha zọọrọ ije gaa n’azụ anyị wee kwụsị na-eweli ọkọlọtọ ha elu. Ìgwè ahụ kwụsịrị, ebe nile dara jụụ ka olu Nwanna Rutherford na-adasi ike, sị: “Ha kelewe ọkọlọtọ ha, tookwa ụmụ mmadụ ma ọ masị ha. Anyị ga-efe ma too nanị Jehova bụ́ Chineke anyị!” Anyị nọ na-eche ihe ga-emezi! Ọ dịghị ihe mere, e wezụga na a gbaara ha ezi àmà, ndị uwe ojii mekwara ka ha nọrọ jụụ ka anyị wee nwee ike ịnụrụ okwu ihu ọha nke fọrọ afọ.

Ka ọ dị ugbu a a na-amalite iji ígwè okwu phonograph mee ihe iji nyere anyị aka ịgba àmà dị ukwuu. N’ọnụ ụzọ, anyị na-eji nlezianya lekwasị anya na rekọd ahụ iji gbaa ndị mmadụ ume ka ha ṅaa ntị ruo minit ise zuru ezu n’okwu Bible ahụ a gụnyere na rekọd. Ọtụtụ mgbe ndị nwe ụlọ na-akpọbata anyị, obi na-adịkwa ha ụtọ anyị ịlaghachi ma kpọkwuo rekọd.

Afọ 1939 bụ afọ jupụtara n’ọrụ na nke siri ike, n’ihi ntiwapụ dị iche iche nke mmegide na ime ihe ike. Tupu anyị enwee otu n’ime mgbakọ anyị, ụmụnna nwetara nnọọ mwakwasị na iti mkpu nke ìgwè mmadụ n’okporo ámá. Ya mere n’oge mgbakọ ahụ, ha mere atụmatụ maka ìgwè pụrụ iche nke ụmụnna ndị ji ụgbọ ala ime nkwusa n’ógbè ndị ahụ e nwere nsogbu, ebe ụmụnna nwanyị na ụmụnna ndị ọzọ gara n’ebe na-adịchaghị ize ndụ. N’iso otu ìgwè na-arụ ọrụ n’otu okporo ámá, agbadara m n’otu paseji ije n’ụlọ ndị dị n’azụ. Ka m nọ n’otu ọnụ ụzọ, anụrụ m ka ọgba aghara malitere—a na-eti mkpu, na-ebekwa ákwá n’okporo ámá. M nọgidere na-agwa onye ahụ nọ n’ọnụ ụzọ okwu, na-agbatị nkwurịta okwu ahụ ruo mgbe m pụrụ ịnụ na ihe adajụọla. Mgbe ahụ esiri m na paseji ahụ gbagote bata n’okporo ámá nanị ịhụ na ụjọ ejidela ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ahụ mgbe ha na-enweghị ike ịchọta m! Otú ọ dị, ka oge gatụkwuru n’ụbọchị ahụ, ndị ahụ na-enye nsogbu nwara ịkpaghasị nzukọ anyị, ma ụmụnna duuru ha pụọ.

Agha Ụwa nke Abụọ Etiwapụ

Ka ọ dị ugbu a ndebanye aha n’òtù ndị agha ná nrụgide na-aga n’ihu, a tụkwara ọtụtụ ụmụnna nwoke na-eto eto mkpọrọ malite n’ọnwa 3 ruo 12. Mgbe ahụ papa m nwetara ihe ùgwù ọzọ, nke ịbụ onye nleta ndị mkpọrọ. Kwa Sunday ọ na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ụlọ mkpọrọ dị n’ógbè ahụ. Ọ na-eje eleta ụmụnna n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ha n’uhuruchi Wednesday ọ bụla. Ebe o nweworo ahụmahụ dị ogologo nke siri ike dị otú ahụ n’onwe ya banyere ụlọ mkpọrọ n’oge Agha Ụwa Mbụ, o nwere obi ụtọ pụrụ iche ijere ndị na-enwe ule yiri nke ahụ ozi. O mere nke a ruo 20 afọ, kpọmkwem ruo ọnwụ ya na 1959.

Ka ọ na-erule 1941, obi ilu na ịkpọasị nke ọtụtụ ndị na-egosi banyere nguzo anyị nke nnọpụiche nọ na-amata anyị ahụ. Ọ dịghị mfe iji magazin guzoro n’okporo ámá wee chee nke a ihu. N’otu mgbe ahụ, anyị ṅụrịrị ọṅụ inyere ndị gbara ọsọ ndụ bi n’ógbè anyị aka. Ndị Latvia, ndị Poland, ndị Estonia, ndị Germany—lee aha ọṅụ ọ bụ ịhụ ka ihu ha na-agbasapụ n’ọchị mgbe ha hụrụ Ụlọ Nche ma ọ bụ Consolation (nke bụ́ Teta! ugbu a) n’asụsụ ha!

O ruru ikpe m ikpe n’ihi nguzo nnọpụiche m n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. N’ịbụ onye a kpọchibidoro n’ime ọnụ ụlọ mkpọrọ nke m ruo hour 19 n’ime 24 ọ bụla, ndụ ụlọ mkpọrọ siiri m ike. Ụbọchị atọ ndị mbụ bụ ndị kasị siere m ike, n’ihi ọ bụ nanị m nọ. N’ụbọchị nke anọ, a kpọrọ m ịbịa n’ọfịs gọvanọ bụ́ ebe m hụrụ ụmụ agbọghọ abụọ ndị ọzọ ka ha guzo. Otu n’ime ụmụ agbọghọ ahụ takwụnyeere m, sị: “N’ihi gịnị ka e ji tụọ gị mkpọrọ?” M sịrị: “Ọ ga-eju gị anya ma ị mara.” O jiri ntakwụnye na-ama jijiji jụọ, sị: “Ị̀ bụ Onyeàmà Jehova?” Nwa agbọghọ nke ọzọ nụrụ ihe o kwuru wee jụọ anyị abụọ, sị: “Ùnu bụ Ndịàmà Jehova?” anyị atọ makụkwara ibe anyị. Anyị anọkwaghị nanị anyị!

Ozi Oge Nile Na-enye Obi Ụtọ

N’ịbụ onye a tọhapụrụ n’ụlọ mkpọrọ, agara m n’ihu n’ozi oge nile m, otu nwa agbọghọ dị afọ 16 nke ka gụsịrị akwụkwọ sonyekwaara m. Anyị kwagara Ilkley, bụ́ obodo mara mma nke dị n’ọnụ ọnụ nke Yorkshire Dales. Ruo ọnwa isii zuru ezu, anyị gbalịsiri ike ịchọta ebe kwesịrị ekwesị maka inwe nzukọ anyị. N’ikpeazụ, anyị gbazitere otu ebe dị ntakịrị a na-adọsa ụgbọ ala, bụ́ nke anyị gbanwere ịghọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Papa m gbataara anyị ọsọ enyemaka, na-etinyere anyị ọkụ na ihe na-ekpo ụlọ ọkụ. Ọ chọkwaara anyị ụlọ ahụ mma. Ruo ọtụtụ afọ, ọgbakọ dị nso nyere anyị nkwado, na-ekenye ụmụnna kwa izu ịbịa kwuo okwu ihu ọha. Site ná ngọzi Jehova anyị nwere ọganihu ma too, e mesịkwara guzobe otu ọgbakọ.

Na January 1959, papa m dara ọrịa na mberede. A kpọrọ m ka m lọta ụlọ, ọ nwụkwara n’April. Afọ ndị sochiri bụ ndị siri ike. Ahụ ike mama m na ike ncheta ihe ya dakpọrọ, na-eme ka ọ bụụrụ m ọgụ na mgba. Ma mmụọ Jehova nọgidere na-akwagide m, enwekwara m ike ilekọta ya ruo n’ọnwụ ya na 1963.

Enwetawo m ọtụtụ ngọzi site n’aka Jehova n’ime afọ ndị gara aga. A pụghị ịgụ ha ọnụ. Ahụwo m ka ọgbakọ anyị n’ụlọ toro ma kewaa ugboro anọ, na-ezipụ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ, ụfọdụ dị ka ndị ozi ala ọzọ gaa ná mba ndị dị anya dị ka Bolivia, Laos, na Uganda. Olileanya nke alụmdi na nwunye na inwe ezinụlọ nke m adabaghịrị m. O mebeghị ka m nwee mwute; anọwo m na-ejibiga ọrụ n’aka ókè. Ọ bụ ezie na mụ enweghị ndị ikwu n’anụ ahụ, enwere m ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ n’ime Onyenwe anyị, ọbụna narị okpukpu.—Mak 10:29, 30.

Ọtụtụ mgbe m na-akpọ ndị ọsụ ụzọ na-eto eto na ndị ntorobịa ndị ọzọ n’ebe obibi m maka inwe nnọkọrịta ndị Kraịst. Anyị na-akwadokọta maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Anyị na-akọkwa ahụmahụ ma na-abụ abụ Alaeze, dị nnọọ ka ndị mụrụ m na-emebu. N’ịbụ onye ìgwè ndị na-eto eto obi dị ụtọ gbara gburugburu, m nọgidere na-enwe àgwà ndị ntorobịa na olileanya obi ụtọ. Ọ dịghị ndụ dị mma nye m karịa ozi ọsụ ụzọ. Ana m ekele Jehova na m nwere ihe ùgwù nke ịgbaso nzọụkwụ ndị mụrụ m. Ekpere m bụ ka m nọgide na-ejere Jehova ozi ruo ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’icheta nkwụsị nke agha na 1918 nakwa, ka e mesịrị, na 1945.

[Foto dị na peeji nke 23]

Traktị ahụ kpasuru mmasị papa m n’eziokwu

[Foto dị na peeji nke 23]

Hilda Padgett na ndị mụrụ ya, bụ́ Atkinson na Pattie

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya