Ị̀ Na-eme Ihe Banyere Ịhụnanya Kraịst?
1 N’ikwu banyere ndụ Nna ya Ukwu biri, Jọn onyeozi dere sị: “[Jisọs] hụrụ ndị nke aka Ya nọ n’ụwa n’anya, Ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ ihe.” (Jọn 13:1) N’oge Ememe Ncheta a, anyị ga-atụgharị uche ná ngosipụta kasị ukwuu nke ịhụnanya Kraịst. Anyị pụrụ ime ihe banyere ịhụnanya ahụ site n’igosipụta okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa, nakwa dị ka Jisọs, site n’iji ntachi obi nọgide “ruo ọgwụgwụ.”—Mat. 24:13; 28:19, 20; Jọn 3:16.
2 Ime Ihe Banyere Ịhụnanya Kraịst: Jisọs rụsiri ọrụ ike n’izu ikpeazụ nke ndụ ọ dịrị n’elu ala. (Mat. 21:23; 23:1; 24:3) Dị ka ndị na-eṅomi Kraịst, ịhụnanya na-akpalikwa anyị ‘ijisi ike’ n’ozi Jehova. (Luk 13:24) Ị̀ pụrụ iji ndokwa ndị e mere maka ọrụ ịgbakwu àmà n’ọnwa April mee ihe site n’ịmụba oge ị na-etinye n’ozi?
3 N’afọ a Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị dabara n’anyasị Wednesday, April 19. Mmadụ ole ga-anọ ya maka ihe omume a dị mkpa? Ruo n’ókè dị ukwuu, ọ dabeere n’ebe anyị nọ. Ì depụtawo aha ndị ị na-eme atụmatụ ịkpọ òkù—ndị ị na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị, ndị ikwu gị, ndị gị na ha na-achụkọ nta ego, na ụmụ akwụkwọ ibe gị? Ị̀ kpọtụworo ha ma jiri obi gị kpọọ ha òkù? Ị̀ ga-echetara ha ya ụbọchị ole na ole tupu Ememe Ncheta ahụ eruo? Enyemaka gị ọ̀ dị ha mkpa iji rute ebe ahụ? Ndị okenye na-akpọkwa onye ọ bụla na-adịghị ejekwa ozi òkù ịbịa. Eziokwu ahụ bụ́ na a ga-eme Ememe Ncheta ahụ n’anyasị nke etiti izu kama ịbụ ná ngwụsị izu emeghị ka ọ ghara ịdịcha mkpa na mmadụ nile ga-abịa.
4 Kwadebe nke Ọma Tupu Ị Bịa: Ọ dị mkpa ka anyị kwadebe nke ọma ma nwee ọnọdụ uche kwesịrị ekwesị mgbe anyị na-abịa Ememe Ncheta ahụ. Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha buru ịdị mkpa nke ememe ahụ n’uche. (1 Kọr. 11:20–26) Unu pụrụ ịgụ isi 13 ruo 17 nke Oziọma Jọn n’oge ọmụmụ Bible ezinụlọ unu ma mee ka onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ unu kọọ ihe àjà Jisọs pụtaara ya. Unu echefukwala ịgụkwu ọg̣ụgụ Bible dịịrị izu Ememe Ncheta!
5 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Kraịst nọ na-emiwanye emi ma na-agabiga April 19. Anyị na-ekpebisi ike igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ ruo mgbe ebighị ebi! Ememe Ncheta nke afọ a ga-enyere anyị aka ime ka mkpebi ahụ siwanye ike.