AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ TESALONAỊKA 1-5
“Na-akasirịtanụ Ibe Unu Obi ma Na-ewulirịtanụ Ibe Unu Elu”
Onye Kraịst ọ bụla nwere ike ịkasi ndị ọzọ obi. Dị ka ihe atụ, anyị na-akasi Ndị Kraịst ibe anyị obi ma anyị gaa ọmụmụ ihe nakwa ma anyị gaa ozi ọma n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na anyị na-ata ahụhụ n’ihi ọrịa ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. (1 Tesa. 2:2) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma ma mee nchọnchọ, anyị ga-amata ihe ndị anyị nwere ike ikwu iji kasie ụmụnna anyị obi.
Olee ebe ị ga-esi nweta ihe ị ga-eji kasie onye nwere nsogbu ya na ya na-alụ obi?
Olee onye nọ n’ọgbakọ unu ị ga-achọ ịkasi obi?