Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/15 p. 31
  • “Ime Njem n’Osimiri n’Oge Oké Ifufe”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ime Njem n’Osimiri n’Oge Oké Ifufe”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/15 p. 31

“Ime Njem n’Osimiri n’Oge Oké Ifufe”

Ị́ GAGHỊ ele ime njem dị otú ahụ anya dị ka nke e mere n’oge na-ekwesịghị ekwesị, nke nzuzu, na nke pụrụ iweta ọdachi? Otú ọ dị, ụfọdụ na-etinye onwe ha n’ọnọdụ dị otú ahụ n’ụzọ ihe atụ. N’ụzọ dị aṅaa? Onye dere akwụkwọ na narị afọ nke 17 bụ́ Thomas Fuller kwuru, sị: “Emela ihe mgbe oké iwe ji gị. O yiri ime njem n’osimiri n’oge oké ifufe.”

Ime ihe mgbe ị nọ n’iwe a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ ịrụpụta ọdachi. Otu ihe omume e dekọrọ n’ime Bible gosipụtara nke a. Simeon na Livaị, bụ́ ụmụ ndị ikom nke nna ochie ahụ bụ́ Jekọb, meghachiri omume nye mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị bụ́ Daịna site n’iji ọnụma nke ịbọ ọbọ mee mwakpo. Ihe si na ya pụta bụ oké mgbukpọ na ịkwakọrọ ihe onwunwe. Ọ bụghị ihe ijuanya na Jekọb katọrọ omume ọjọọ ha, na-asị: “Unu emekpawo m ahụ, n’ime m ka m sie ísì n’etiti ndị bi n’ala nke a.”—Jenesis 34:25-30.

N’ụzọ amamihe dị na ya, Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-atụ aro ka a gbasoo ụzọ dị iche. Ọ na-asị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:8) Ịgbaso ndụmọdụ ahụ pụrụ igbochi mmehie ndị dị ukwuu.—Eklisiastis 10:4; leekwa Ilu 22:24, 25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya