-
Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi WakporoỤlọ Nche—1998 | Disemba 15
-
-
Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Bịara
Otú ọ dị, gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị ohi abata n’ebe obibi gị ma bakwute gị? Cheta na ndụ gị ka ihe onwunwe mkpa. Kraịst Jisọs sịrị: “Eguzogidela onye bụ ajọ onye: kama onye ọ bụla na-akpụ gị ụra ná ntị aka nri, tụgharịakwara ya ntị ọzọ. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-achọ . . . ka o wee nara gị uwe ime gị, hapụkwara ya oké uwe gị.”—Matiu 5:39, 40.
Nke a bụ ndụmọdụ amamihe dị na ya. Ọ bụ ezie na iwu ejighị ndi Kraịst inye ndị omekome ihe ọmụma banyere ihe onwunwe ha, ndị ohi yikarịrị ka ha ga-eme ihe ike ma ọ bụrụ na ha ahụta nguzogide, ekwenyeghị ekwenye, ma ọ bụ aghụghọ. Ọtụtụ n’ime ha, “ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ,” bụ ndị a na-akpali n’ụzọ dị mfe ịkpa àgwà ọjọọ nke obi ịta mmiri.—Ndị Efesọs 4:19.
Samuel bi n’otu ebe e wuru ọgbara ụlọ. Ndị ohi nọchibigidere ụlọ ahụ ma na-esite n’otu ụlọ gaa n’ọzọ, na-akwakọrọ ihe. Samuel nụrụ ụda égbè, ibo ụzọ ndị a na-akụpịa, na ndị mmadụ na-eti mkpu, na-akwakwa ákwá. Mgbapụ apụghị ikwe omume. Samuel gwara nwunye ya na ụmụ ya nwoke atọ ka ha gbudo ikpere n’ala, chilie aka ha elu, mechie anya ha, ma chere. Mgbe ndị ohi ahụ tikabatara, Samuel gwara ha okwu ka ọ na-ele anya n’ala, na-amara na ọ bụrụ na ya elee ha anya n’ihu, ha pụrụ iche na ọ ga-amata ha ma e mesịa. “Batanụ,” ka ọ sịrị. “Ihe ọ bụla unu chọrọ, werenụ. Unu nwere onwe unu iwere ihe ọ bụla. Anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị agaghị eguzogidekwa unu.” Nke a juru ndị ohi ahụ anya. N’ime ihe karịrị otu awa ma ọ bụ ihe yiri ya sochirinụ, ngụkọta nke ndị ikom 12 bucha égbè batara n’ìgwè n’ìgwè. Ọ bụ ezie na ha zuuru ọla, ego, na ngwongwo electronics, a kụghị ezinụlọ ahụ ihe ma ọ bụ maa ha mma dị ka e mere ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ. Ezinụlọ Samuel kelere Jehova maka ndụ ha.
Nke a na-egosi na mgbe a bịara n’ihe banyere ego na ihe onwunwe, ndị e zuru ohi bụ́ ndị na-eguzogideghị ndị ohi pụrụ ibelata ịbụ ndị e nwere ike merụọ ahụ.a
-
-
Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi WakporoỤlọ Nche—1998 | Disemba 15
-
-
a N’ezie, nkwenye nwere ókè. Ndị ohu Jehova adịghị ekwenye n’ụzọ ọ bụla na-emebi iwu Chineke. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst agaghị eji ọchịchọ obi kwe ka e dinaa ya n’ike.
-