Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 3/15 p. 28-31
  • Ihe Ndekọ Akụkọ Ndị Na-akpali Mmasị nke Josephus

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndekọ Akụkọ Ndị Na-akpali Mmasị nke Josephus
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Nwata Ya
  • Ịga Rom Ma Laghachi
  • Akwụkwọ Ndị Flavius Josephus Dere
  • Inye Nghọta n’Okwu Chineke
  • Oké Mbili ahụ Megide Rom
  • Mgbe Agha ahụ Gasịrị
  • Ọ̀ Bụ Josifọs Dere Ya n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Masada—N’ihi Gịnị Ka O ji Mee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 3/15 p. 28-31

Ihe Ndekọ Akụkọ Ndị Na-akpali Mmasị nke Josephus

NDỊ mmụta akụkọ ihe mere eme echemiwo echiche eri ogologo oge banyere ihe ndị Josephus dere. N’ịbụ onye a mụrụ nanị afọ anọ mgbe Kraịst nwụsịrị, ọ bụ onye ji anya ya hụ mmezu na-awụ akpata oyi n’ahụ nke amụma Jisọs banyere mba Juu nke narị afọ mbụ. Josephus bụ onye ọchị agha, onye ụkọ obodo, onye Farisii, na onye nkà mmụta.

Ihe ndị Josephus dere jupụtara n’ihe ndị na-akpali mmasị. Ha na-eme ka ịbụ eziokwu nke Bible pụtakwuo ìhè ma na-enye nduzi nkà mmụta banyere otú Palestine dị n’ile anya na ọdịdị elu ala ya. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji ele akwụkwọ ya dị iche iche anya dị ka ihe bara uru a ga-etinye n’ebe ndebe akwụkwọ ha!

Ndụ Nwata Ya

A mụrụ Joseph ben Matthias, ma ọ bụ Josephus, na 37 O.A., afọ mbụ nke ọchịchị eze alaeze ukwu Rom bụ́ Caligula. Nna Josephus bụ onye ezinụlọ ndị nchụàjà. Nne ya, ka ọ na-azọrọ, sitere n’eriri ọmụmụ Jonathan bụ́ onye isi nchụàjà nke òtù Hasmon.

Mgbe ọ nọ n’afọ ndụ agbata iri na atọ na iri na itoolu, Josephus bụ onye na-amụsi Iwu Mosis ike. O ji nlezianya nyochaa ịrọ òtù atọ nke okpukpe ndị Juu​—⁠ndị Farisii, ndị Sadusii, na ndị Essen. N’ịhọrọ nke ikpeazụ, o kpebiri ibinyere otu onye na-anọpụrụ onwe ya n’ọzara, onye aha ya bụ Bannus, onye ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ onye Essen, ruo afọ atọ. Ka ọ gbahapụrụ nke a n’afọ ndụ nke 19, Josephus laghachiri Jerusalem ma sonyere ndị Farisii.

Ịga Rom Ma Laghachi

Josephus gara Rom na 64 O.A. ịrịọrọ ndị nchụàjà bụ́ ndị Juu arịrịọ bụ́ ndị onye ọchịchị obodo Juda bụ́ Filiks zigawooro Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Nero ka e kpee ha ikpe. N’ịbụ onye nwere ahụmahụ nke ụgbọ okpukpu ka ọ na-aga, Josephus ji obere ihe lanarị ọnwụ. Nanị 80 n’ime 600 ndị ụgbọ ahụ bu ka a zọpụtara.

N’oge nleta ahụ Josephus letara Rom, otu onye Juu na-eme ihe nkiri kpọgara ya n’ihu nwunye Nero, Poppaea nwunye eze. O keere òkè pụtara ìhè n’ịga nke ọma nke ozi o ji bịa. Ịdị ebube nke obodo ahụ nwere mmetụta na-adịgide adịgide n’ahụ Josephus.

Mgbe Josephus laghachitere na Judia, mbili megide Rom gbara mkpọrọgwụ siri ike n’uche ndị Juu. Ọ gbalịrị ime ka ndị mba ya ghọta enweghị isi nke obubu agha megide Rom. N’enweghị ike ijighachi ha azụ nakwa ma eleghị anya n’ihi egwu nke na a ga-ele ya anya dị ka onye mgba okpuru, ọ nakweere nhọpụta dị ka ọchịagha ìgwè ndị Juu na Galili. Josephus chịkọtara ma zụọ ndị ikom ya, nwetakwa ihe agha na nri ndị dị mkpa ná nkwadebe maka ibuso ndị agha Rom agha​—⁠ma ọ dịghị nke nwere isi. Galili dara n’aka ìgwè ndị agha Vespasian. Mgbe nnọchibido were 47 ụbọchị gasịrị, a kwaturu ebe e wusiri ike nke Josephus na Jotapata.

Mgbe ọ chịliri aka elu, Josephus ji amamihe kwupụta na n’isi nso Vespasian ga-abụ onye na-achị alaeze ukwu ahụ. N’ịbụ onye a tụrụ mkpọrọ n’ataghị ya ahụhụ n’ihi nkwupụta nke a, a tọhapụrụ Josephus mgbe ọ ghọrọ eziokwu. Nke ahụ bụ oge oké mgbanwe ná ndụ ya. N’ihe fọdụrụ n’agha ahụ, o jeere ndị Rom ozi dị ka onye nsụgharị na onye ngabita. Iji gosi nkwado nke Vespasian na ụmụ ya nwoke bụ Titus na Domitian, Josephus gbakwụnyere aha ezinụlọ ha bụ́ Flavius na nke ya.

Akwụkwọ Ndị Flavius Josephus Dere

A kpọrọ nke kasị ochie n’ihe ndị Josephus dere The Jewish War. E kwenyere na ọ kwadebere ihe ndekọ nke a dị mpịakọta asaa iji gosi ndị Juu n’ụzọ pụtara ìhè ọkịka nke ike nke ndị Rom ma nye ihe ndọghachi azụ megide mbili nnupụisi ndị ọzọ n’ọdịnihu. Ihe odide ndị a nyochara akụkọ ihe mere eme ndị Juu malite ná mmeri Antiochus Epiphanes meriri Jerusalem (na narị afọ nke abụọ T.O.A.) ruo n’ọgba aghara na-akpaghasị ihe nke 67 O.A. Dị ka onye ji anya ya hụ ihe merenụ, Josephus tụleziri agha ahụ a gwụsịrị na 73 O.A.

Akwụkwọ ọzọ Josephus dere bụ The Jewish Antiquities, akụkọ ihe mere eme nke ndị Juu dị mpịakọta 20. Na-amalite na Jenesis na okike, ọ gara n’ihu gaa ná ntiwapụ nke agha ha na ndị Rom. Josephus gbasochiri usoro nke akụkọ Bible anya, na-etinye nkọwa ọdịnala dị iche iche na ihe ndị ọzọ kwuru.

Josephus dere akụkọ nke onwe ya nke a kpọrọ nanị Life. N’ime ya ọ chọrọ ịgọpụrụ nguzo ya n’oge agha ahụ ma nwaa ịbịada ebubo ndị Justus nke Taịberịas welitere megide ya. Akwụkwọ nke anọ​—⁠ihe ngọpụ dị mpịakọta abụọ nke a kpọrọ Against Apion⁠—​na-ekwuchitere ndị Juu megide nkwujọ dị iche iche.

Inye Nghọta n’Okwu Chineke

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe ka ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke Josephus ziri ezi. N’akwụkwọ ya a kpọrọ Against Apion, o gosiri na ọ dịghị mgbe ndị Juu gụnyere akwụkwọ Apọkrịfa ndị ahụ dị ka akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ. Ọ na-enye ihe akaebe maka izi ezi na nkwekọ n’ime nke ihe odide ndị ahụ dị nsọ. Josephus na-asị: “Anyị enweghị ọtụtụ akwụkwọ a na-apụghị ịgụta ọnụ n’etiti anyị, na-agbagha ma na-emegiderịta ibe ha, . . . kama nanị iri akwụkwọ abụọ na abụọ [nke ya na nkeji anyị n’oge a nke Akwụkwọ Nsọ gaa na 39 akwụkwọ dị iche iche bụ otu ihe ahụ], bụ́ nke nwere ihe ndekọ nke oge nile gara aga; bụ́ ndị e kwenyere n’izi ezi na ha sitere n’aka Chineke.”

N’akwụkwọ The Jewish Antiquities, Josephus na-agbakwụnye akụkụ na-akpali mmasị n’ihe ndekọ nke Bible. Ọ sịrị na “Aịsak dị iri afọ abụọ na ise” mgbe Abraham kere ya aka na ụkwụ maka ịchụ àjà. Dị ka Josephus na-ekwu, mgbe o nyesịrị aka n’iwu ebe ịchụàjà ahụ, Aịsak sịrị na “‘e kwesịbughị ịmụ ya na mbụ, ọ bụrụ na ya ajụ mkpebi siri ike nke Chineke na nke nna ya’ . . . Ya mere ọ gara ozugbo n’elu ebe ịchụàjà ahụ ka a chụọ ya n’àjà.”

N’ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ nke ọpụpụ Israel pụtara n’Ijipt oge ochie, Josephus gbakwụnyere akụkụ ndị a: “Ọnụ ọgụgụ ndị chụsoro ha bụ narị ụgbọ ịnyịnya isii, na puku iri ise ndị na-anọkwasị n’elu ịnyịnya, na puku narị abụọ nke ndị ji ụkwụ aga, ha nile bucha ngwá agha.” Josephus kwukwara na “mgbe Samuel gbara afọ iri na abụọ, ọ malitere ibu amụma: otu mgbe kwa mgbe ọ na-ehi ụra, Chineke kpọrọ ya n’aha ya.”​—⁠Tụlee 1 Samuel 3:​2-⁠21.

Ihe ndị ọzọ Josephus dere na-enye nghọta n’ụtụ isi, iwu, na ihe dị iche iche merenụ. Ọ kpọrọ Salome aha dị ka nwanyị ahụ tere egwú ná nnọkọ oriri Herọd na onye rịọrọ maka isi Jọn Onye Na-eme Baptism. (Mak 6:​17-⁠26) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe anyị maara banyere ndị Herọd bụ Josephus deturu ha. Ọbụna na o kwuru na “iji zochie oké afọ ndụ ya, [Herọd] tejiri ntutu ya.”

Oké Mbili ahụ Megide Rom

Nanị 33 afọ mgbe Jisọs busịrị amụma ya banyere Jerusalem na ụlọ nsọ ya, mmezu ya malitere ịpụta ìhè. Òtù ndị Juu bụ́ ndị na-achọ mgbanwe na Jerusalem kpebisiri ike ịgbajipụ yoke nke Rom. Na 66 O.A., akụkọ nke a kpaliri nchịkọta na nzipụ nke òtù agha Rom n’okpuru gọvanọ bụ́ onye Siria bụ́ Cestius Gallus. Ọrụ e nyere ha bụ ịbịada nnupụisi ahụ na ịta ndị dara iwu ahụhụ. Mgbe ha mebisịrị ihe n’obodo ndị dị n’akụkụ Jerusalem, ndị ikom Cestius mara ụlọikwuu gburugburu obodo ahụ e ji mgbidi gbaa gburugburu. Na-eji usoro a kpọrọ nchịkọta ọta eme ihe, ndị Rom nwere ihe ịga nke ọma ịchịkọta ọta ha dị ka azụ mbe maka nchebe megide ndị iro. N’ịgba akaebe maka ịga nke ọma nke usoro a, Josephus na-ekwu, sị: “Akụ̀ ndị a tụrụ dara ma gbụchapụ n’emerụghị ha ahụ ọ bụla; ya mere ndị agha ahụ mere ka ike gwụ mgbidi ájá ahụ, kwadosiekwa ihe nile maka ịgba ọnụ ụzọ ámá nke ụlọ nsọ ahụ ọkụ.”

“O meziri,” ka Josephus na-ekwu, “na Cestius . . . kpọghachiri ndị agha ya site n’ebe ahụ . . . O si n’obodo ahụ wezụga onwe ha, n’enweghị nnọọ ihe kpatara ya.” Ihe àmà na-egosi na ọ bụghị iji too Ọkpara Chineke, ma Josephus dekọrọ kpọmkwem ihe omume ndị Kraịst na Jerusalem nọworo na-eche. Ọ bụ mmezu nke amụma Jisọs Kraịst! Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Ọkpara Chineke adọwo aka ná ntị, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya. N’ihi na ndị a bụ ụbọchị mkpepụta, ka ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ wee mezuo.” (Luk 21:​20-⁠22) Dị ka Jisọs nyere ntụziaka ya, ndị na-eso ụzọ ya na-ekwesị ntụkwasị obi gbapụrụ ngwa ngwa n’obodo ahụ, nọpụ anọpụ, e chebekwara ha pụọ ná nhụsianya mesịrị dakwasị ya.

Mgbe ndị agha Rom laghachitere na 70 O.A., Josephus dekọrọ ihe ndị si na ya pụta n’ụzọ doro nnọọ anya. Ọkpara Vespasian, Ọchịagha Titus, bịara merie Jerusalem, ya na ụlọ nsọ ya dị ebube. N’ime obodo ahụ, òtù ndị na-eburịta agha nwara iweghara ọchịchị. Ha malitere ime ihe ndị gabigara ókè, a wụfukwara ọbara dị ukwuu. Ụfọdụ “nọ n’oké ihe isi ike n’ihi ọdachi ndị ha na-enwe site n’obodo ha nke na ha rịọrọ ka ndị Rom bịa,” na-atụ anya “mgbapụta site ná nhụjuanya ha n’ime obodo ha,” ka Josephus na-ekwu. Ọ kpọrọ ndị nnupụisi ahụ “ndị ohi” nọ n’ọrụ ibibisị ngwongwo ndị ọgaranya na igbu ndị a ma ama​—⁠ndị a na-enyo enyo na ha dị njikere ikwenyere ndị Rom.

Ka agha obodo na-aga n’ihu, ọnọdụ ibi ndụ na Jerusalem dakpọrọ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-echetụbeghị n’echiche, a nakwaghị eli ndị nwụrụ anwụ eli. Ndị nkewa ahụ n’onwe ha “lụsara onwe ha ọgụ, ebe ha na-azọ ozu ndị nwụrụ anwụ ụkwụ ka ha na-atụkwasị ndị e kpokọtara ọnụ n’elu ibe ha.” Ha zuru ìgwè mmadụ ohi, gbuo ndị mmadụ maka nri na akụ̀ na ụba. Mkpu ákwá nke ndị a na-emekpa ahụ nọgidere na-aga n’ihu.

Titus gbara ndị Juu ume ka ha nyefee obodo ahụ wee si otú a zọpụta onwe ha. O “zigara Josephus ka ọ gwa ha okwu n’asụsụ nke ha; n’ihi na o lere anya na ha pụrụ ịnakwere nrụgide nke nwa amaala ha.” Ma ha kwara Josephus emo. Ihe ọzọ Titus mere bụ iwu mgbidi nke ékpè na ị̀gá gburugburu obodo ahụ dum. (Luk 19:43) Ebe e mechiworo olileanya nile maka mgbapụ, a kpaakwara ngagharị ókè, ụnwụ nri “ripịara ndị ahụ n’èzí na n’ezinụlọ dum.” Agha ahụ nọgidere na-aga n’ihu tinyekwuru ihe n’ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ. N’amaghị ama na-emezu amụma Bible, Titus meriri Jerusalem. E mesịa, mgbe o lere mgbidi ya na ụlọ nche ya ndị e wusiri ike anya, o tiri mkpu, sị: “Ọ dịghị onye ọzọ ma ọ bụ Chineke bụ onye chụpụrụ ndị Juu n’ebe ndị a e wusiri ike.” Ihe karịrị otu nde ndị Juu lara n’iyi.​—⁠Luk 21:​5, 6, 23, 24.

Mgbe Agha ahụ Gasịrị

Mgbe agha ahụ gasịrị Josephus gara Rom. N’inwe nkwado nke ezinụlọ Flavius, o biri ndụ dị ka nwa amaala Rom n’obì ukwu Vespasian ma nata ụgwọ ezumike nká nke alaeze ukwu na ọtụtụ onyinye site n’aka Titus. Josephus rụziri ọrụ nkà idepụta akwụkwọ.

Ọ na-akpali mmasị ịrịba ama na ihe àmà na-egosi na ọ bụ Josephus wepụtara okwu ahụ bụ́ “Ọchịchị Chineke.” N’ihe banyere mba Juu, o dere: “A pụrụ ịkpọ gọọmenti anyị . . . Ọchịchị Chineke, site n’ikwu na ikike na ike ya bụ nke Chineke.”

Ọ dịghị mgbe Josephus zọọrọ na ya bụ onye Kraịst. O deghị ihe n’okpuru mmụọ nsọ Chineke. Ma, e nwere abamuru na-enye nghọta nke akụkọ ihe mere eme n’ihe ndekọ nile na-akpali mmasị nke Josephus.

[Foto dị na peeji nke 31]

Josephus ná mgbidi Jerusalem

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya