Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 1 p. 14-15
  • A Ga-enweli Ụwa Nchegbu Na-adịghị na Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Ga-enweli Ụwa Nchegbu Na-adịghị na Ya
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2020
  • “Udo Ga-adị Ebe Niile” n’Alaeze Chineke
    Teta!—2019
  • Nrụgide Dị Mma, Nrụgide Dị Njọ
    Teta!—1998
  • Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị
    Teta!—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 1 p. 14-15
Ebe otu nwata nwoke na nna ya na-egwu egwu n’ime mmiri, nne ya na ụmụnne ya ndị nwaanyị ana-ele ha, na-achị.

IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU

A Ga-enweli Ụwa Nchegbu Na-adịghị na Ya

Ndụmọdụ dị na Baịbụl ga-enyere anyị aka izere nchegbu na-enweghị isi na ọdụ. Anyị agaghị ewepụli nchegbu anyị niile n’onwe anyị. Ma, Onye kere anyị ga-emeli ya. Ọ họpụtadịla Jizọs Kraịst ka ọ gbatara anyị ọsọ enyemaka. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-arụ ọrụ ebube n’ụwa niile karịadị otú ahụ ọ rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Dị ka ihe atụ:

JIZỌS GA-AGWỌ NDỊ ỌRỊA DỊ KA O MERE N’OGE MBỤ.

“Ha wee kpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa . . . o wee gwọọ ha.”​—MATIU 4:24.

JIZỌS GA-EME KA ONYE Ọ BỤLA NWEE ỤLỌ NA IHE ORIRI.

“Ha [ya bụ, ndị Kraịst ga-achị] ga-arụ ụlọ, birikwa na ha. Ha ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya. Ha agaghị arụ ụlọ, onye ọzọ ebichie ya, ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ihe si na ya.” ​—AỊZAYA 65:21, 22.

ỌCHỊCHỊ JIZỌS GA-EME KA UDO DỊ N’ỤWA NIILE.

“N’oge ọchịchị ya, ihe ga na-agaziri onye ezi omume, udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agaghịzi adị. Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị malite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri, malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ. . . . Ndị iro ya ga-arachakwa ájá.”​—ABỤ ỌMA 72:7-9.

JIZỌS GA-EME KA MMEGBU KWỤSỊ.

“Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere, ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—ABỤ ỌMA 72:13, 14.

JIZỌS GA-EME KA AHỤHỤ NA ỌNWỤ KWỤSỊ.

“Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”​—MKPUGHE 21:4.

‘OGE OKÉ ECHICHE’

“Nchegbu, inwe mwute na ihe mgbu juru ebe niile n’ụwa taa karịa ka anyị hụtụrụla ya mbụ.”​—Mohamed S. Younis, onye nchịkọta akụkọ n’ụlọ ọrụ a na-akpọ Gallup.

Gịnị mere nchegbu ji ju ebe niile? Baịbụl gwara anyị ihe kpatara ya na 2 Timoti 3:1. Ebe ahụ sịrị: “N’ụbọchị ikpeazụ, a ga-enwe oge oke echiche.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Baịbụl kwukwara ihe oge a ga-eji dị otú a. O kwuru àgwà ọjọọ ndị mmadụ ga na-akpa. Ụfọdụ n’ime ha bụ anyaukwu, mpako, ndị okpukpe ime ihu abụọ, tigbuo zọgbuo, enweghị obi mmadụ, na mmadụ ejidelighị onwe ya. (2 Timoti 3:2-5) Oge ikpeazụ ga-agwụ mgbe Jizọs Kraịst ga-achịwa ụwa niile dị ka Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe.​—Daniel 2:44.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya