-
Inọk—Atụghị Egwu n’Ihu Nsogbu NileỤlọ Nche—1997 | Jenụwarị 15
-
-
Chineke Kuuru Inọk Laa —N’ụzọ Dị Aṅaa?
Jehova ekweghị ka Setan ma ọ bụ ndị na-ejere ya ozi n’elu ala gbuo Inọk. Kama nke ahụ, ihe ndekọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Chineke kuuru ya laa.” (Jenesis 5:24) Pọl onyeozi na-akọwa okwu ahụ otú a: “Okwukwe ka e ji bubiga Inọk ka ọ ghara ịhụ ọnwụ; a hụghịkwa ya, n’ihi na Chineke bubigara ya rịị: n’ihi na mgbe a ka ebubigaghị ya a gbaworo ya àmà na ihe ọ na-emerị na-atọ Chineke ezi ụtọ.”—Ndị Hibru 11:5.
Olee otú e si “bubiga Inọk ka ọ ghara ịhụ ọnwụ”? Ma ọ bụ dị ka e si dee ya ná nsụgharị R. A. Knox mere, olee otú e si ‘wepụ Inọk ọ ghara inwe ahụmahụ nke ọnwụ’? Chineke ji ụzọ udo kwụsị ndụ Inọk, na-egbochiri ya ihe mgbu nke ọnwụ site n’ọrịa ma ọ bụ ime ihe ike n’aka ndị iro ya. Ee, Jehova gbubiri ndụ Inọk n’afọ ndụ nke 365—ọ bụ nnọọ nwa okoro ma e were ya tụnyere ndị ọgbọ ya.
Olee otú Inọk si bụrụ onye ‘a gbawooro àmà na ihe ọ na-emerị na-atọ Chineke ezi ụtọ’? Olee ihe àmà o nwere? Dị ka o yiri, Chineke tinyere Inọk n’ọnọdụ ọhụụ, ọbụna dị ka e “weliri,” ma ọ bụ e bufere, Pọl onyeozi, na-enweta ọhụụ nke Paradaịs ime mmụọ dị n’ihu nke ọgbakọ ndị Kraịst dị ka ihe àmà na-egosi. (2 Ndị Kọrint 12:3, 4) Àmà, ma ọ bụ akaebe, na Inọk anọwo na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ pụrụ ịgụnyeworị nhụpere n’ọhụụ nke paradaịs elu ala ahụ dị n’ihu ebe ndị nile dị ndụ ga-akwado ọbụbụeze Chineke. Ikekwe ọ bụ ka Inọk si otú a na-ahụ ọhụụ na-akpali mmụọ ka Chineke kuuru ya laa n’ọnwụ na-adịghị afụ ụfụ ihi ụra ruo ụbọchị mbilite n’ọnwụ ya. O yiri ka, dị ka n’ọnọdụ Mosis, Jehova ò wepụru anụ ahụ Inọk, n’ihi na “a hụghịkwa ya.”—Ndị Hibru 11:5; Deuterọnọmi 34:5, 6; Jud 9.
-
-
Inọk—Atụghị Egwu n’Ihu Nsogbu NileỤlọ Nche—1997 | Jenụwarị 15
-
-
Inọk Ọ̀ Gara Eluigwe?
“Okwukwe ka e ji bubiga Inọk ka ọ ghara ịhụ ọnwụ.” Ná nsụgharị ha nke akụkụ a nke Ndị Hibru 11:5, nsụgharị Bible ụfọdụ na-egosi na Inọk anwụghị n’ezie. Dị ka ihe atụ, A New Translation of the Bible, nke James Moffatt, na-asị: “Ọ bụ n’okwukwe ka a kpọọrọ Inọk gaa eluigwe nke mere na ọ nwụghị ma ọlị.”
Ma, ihe dị ka afọ 3,000 ka ụbọchị Inọk gasịrị, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgoworo n’eluigwe, ma ọ bụghị Onye siri n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” (Jọn 3:13) The New English Bible na-agụ, sị: “Ọ dịbeghị onye ọ bụla jeworo eluigwe, ma ọ bụghị onye ahụ si n’eluigwe bịa, bụ́ Nwa nke Mmadụ.” Mgbe Jisọs kwuru okwu ahụ, ọbụna ya onwe ya arịgobeghị eluigwe.—Tụlee Luk 7:28.
Pọl onyeozi na-ekwu na Inọk na ndị ọzọ mejupụtara oké ìgwè ndị àmà ahụ tupu oge ndị Kraịst ‘nwụchara,’ “ha anataghị nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 11:13, 39) N’ihi gịnị? N’ihi na mmadụ nile, tinyere Inọk, eketawo mmehie site n’aka Adam. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Ụzọ nzọpụta e nwere nanị ya bụ site n’àjà mgbapụta Kraịst Jisọs. (Ọrụ 4:12; 1 Jọn 2:1, 2) N’ụbọchị Inọk a kwụbeghị ụgwọ mgbapụta ahụ. Ya mere, Inọk agaghị eluigwe, kama ọ nọ n’ụra ọnwụ na-echere mbilite n’ọnwụ n’ụwa.—Jọn 5:28, 29.
-