Ndịàmà Jehova Ndị Nwere Obi Ike n’Agbanyeghị Ihe Ize Ndụ nke Ndị Nazi
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA GERMANY
A MAARA Ndịàmà Jehova nke ọma maka nrapagidesi ike ha n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Nke a na-achọkarị obi ike, n’ezie ọ na-emetụtakwa ndụ ha na mmekọrịta ha na ndị ọzọ.
Dị ka ihe atụ, Ndịàmà nwere nkwanye ùgwù miri emi maka ndị si n’agbụrụ na ọdịbendị nile. Ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya. (Matiu 22:35-40) N’ezie, ha na-ekwenyere Pita onyeozi n’ụzọ zuru ezu, bụ́ onye sịrị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
A makwaara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile maka nkwanye ùgwù ha nwere maka iwu, ịdị n’usoro, na ikike gọọmenti. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụ ha kpaliri inupụrụ ọchịchị isi, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-abụ. Nke a bụ eziokwu ọbụna mgbe a na-akpagbu ha n’ala ụfọdụ n’ihi ha iwere nguzo nke ndị ozi bụ́: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29; Matiu 24:9) N’otu mgbe ahụ, Ndịàmà na-amata ikike ndị ọzọ nwere ife ofufe n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi nke akọ na uche ha.
Nguzo obi ike ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova nọ na Germany na n’ala ndị ọzọ Adolf Hitler chịrị dị n’ihe ndekọ. Otu ihe dị ịrịba ama mere na Berlin, Germany, na 1933 na-egosi obi ike ha, ịhụnanya ha maka Chineke na ndị agbata obi ha, na nkwanye ùgwù ha maka iwu, ịdị n’usoro, na nnwere onwe okpukpe.
Ekwenyeghịrị Hitler
Ọ bụ ihe karịrị afọ 50 gara aga ka ọchịchị ọjọọ nke Hitler nke dịruru afọ 12 nke ịkpa ókè agbụrụ na igbu ọchụ bịara ná njedebe. Ma, ọchịchị ndị Nazi kpatara mmerụ ahụ ndị na-ewute ihe a kpọrọ mmadụ ruo taa.
Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ bụ nanị ìgwè ole na ole ji obi ike guzogide ma kwuo okwu megide mmenye ụjọ nke ndị Nazi. Ndịàmà Jehova so n’ime ha, bụ́ ndị a kọwara dị ka “ntakịrị àgwàetiti nke nguzogide [ziri ezi] na-adịghị ada ada n’etiti mba e menyere ụjọ.” Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme a na-akwanyere ùgwù dekọrọ nnọọ banyere nguzo obi ike ha.
Otú ọ dị, ndị nkatọ ole na ole gụnyere ụfọdụ ndị sobu Ndịàmà Jehova na-emekọ ihe, na-ebo Ndịàmà ebubo na ha nwara ikwenyere ọchịchị Hitler ná mmalite. Ha na-azọrọ na ndị nnọchiteanya nke Watch Tower Society gbalịrị n’ụzọ kụrụ afọ n’ala inweta ihu ọma nke gọọmenti ọhụrụ ahụ nakwa na, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ, ha kwadoro nchepụta ịkpa ókè agbụrụ nke ndị Nazi, bụ́ nke mesịrị duje n’ogbugbu nke nde ndị Juu isii.
Ebubo ndị a siri ike bụ ụgha kpam kpam. Ihe na-esonụ bụ nnyocha a na-ezoghị ihe ọ bụla na ya nke ihe ndị ahụ merenụ, dabere n’ihe ndekọ na akụkọ gbara ya gburugburu e nwere.
Ileghachi Anya Azụ
Ndịàmà Jehova anọwo na-arụsi ọrụ ike na Germany ruo ihe karịrị afọ 100. Ka ọ na-erule 1933, e nwere ihe dị ka Ndịàmà 25,000 na-efe Jehova Chineke ofufe ma na-ekesa akwụkwọ e ji amụ Bible na Germany nile.
N’agbanyeghị nnwere onwe ndị ụkpụrụ iwu Germany nyere ohere ha n’oge ahụ, Ndịàmà Jehova bụ ndị a na-elekwasịkarị anya ná mkpọsa nkatọ dị iche iche, ndị ọ bụ ndị iro okpukpe na-akpatakarị. Laarị azụ na 1921, e boro Ndịàmà, ndị a na-akpọ n’oge ahụ Ernste Bibelforscher (Ndị Mmụta Bible Dị Uchu), ebubo ịbụ ndị ha na ndị Juu jikọrọ aka n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ ịkwatu ọchịchị. A kpọrọ Ndị Mmụta Bible ahụ “ikpuru ndị Juu” dị ize ndụ nke ọchịchị Kọmunist, ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe àmà e wepụtara mgbe ọ bụla iji kwadoo ebubo ndị ahụ. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Switzerland bụ́ Karl Barth mesịrị dee, sị: “Ebubo bụ́ na Ndịàmà Jehova na ndị Kọmunist jikọrọ aka pụrụ ịbụ nanị n’ihi nghọtahie na-esighị ha n’obi ma ọ bụ ọbụna nke e leziri anya mee.”
Magazin nke otu chọọchị na Germany boro ebubo na Ndịàmà na ndị Juu gbakọrọ aka n’ịgba izu mgbanwe. Ná nzaghachi, The Golden Age (obu ụzọ nke Teta!) nke April 15, 1930, mbipụta nke Germany, kwuru, sị: “Anyị enweghị ihe ọ bụla mere anyị ga-eji were ebubo ụgha a dị ka mkparị—ebe anyị kwenyesiri ike na onye Juu baruru uru ma ọ dịghị ihe ọzọ dị ka onye Kraịst mmezu iwu; ma anyị na-ajụ okwu ụgha ahụ dị n’elu nke dị n’akwụkwọ akụkọ chọọchị n’ihi na e zubere iji ya katọọ ọrụ anyị, dị ka a ga-asị na a na-arụ ya ọ bụghị maka Oziọma ahụ kama maka ndị Juu.”
N’ihi ya, prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme bụ́ John Weiss dere, sị: “Ndịàmà esoghị n’ịkpa ókè agbụrụ n’ihi ịhụ mba n’anya nke ndị Germany, ha enweghịkwa mwute kemgbe ọtụtụ narị afọ n’ihi na a tọghataghị ndị Juu. Ndịàmà ka rapagidesiri ike na, ọ masị gị kpọọ ya inye nkwado, nkwenkwe mbụ nke ndị Kraịst nke mkpa ọ dị ime ka ndị nile a pụrụ ịtọghata kwenyere Kraịst.”
Gịnị Mere Mgbe Hitler Batara n’Ọchịchị?
Na January 30, 1933, a họpụtara Adolf Hitler ịbụ onyeisi ala ọhụrụ nke Germany. Ná mmalite, ọchịchị Hitler gbalịrị ikpuchi ọdịdị ya nke ime ihe ike na inwe echiche gabigara ókè. N’ihi ya, Ndịàmà tinyere ọtụtụ nde ndị Germany ndị ọzọ ná mmalite 1933, weere òtù National Socialist Party dị ka ọchịchị iwu kwadoro n’oge ahụ. Ndịàmà tụrụ anya na ọchịchị National Socialist (ndị Nazi) ga-achọpụta na òtù ndị Kraịst a na-adị n’udo, na-erube isi n’iwu abụghị ihe iyi egwu maka ịkwatu Ọchịchị ahụ. Nke a apụtaghị na ha ga-emebi ụkpụrụ Bible. Dị ka ọ dị n’ala ndị ọzọ, Ndịàmà chọrọ ime ka gọọmenti mata ezi ọdịdị nke etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke okpukpe ha.
N’oge na-adịghị anya ọ pụtara ìhè na Ndịàmà Jehova gaje iso ná ndị mbụ ndị Nazi ga-emekpọ ọnụ n’ụzọ obi ọjọọ. Ọzọkwa, e kwuru na Ndịàmà so n’ịgba izu mmegide nke ndị Kọmunist na ndị Juu. Mkpagbu malitere.
N’ihi gịnị ka ọchịchị ọhụrụ ahụ ga-eji wesoo ìgwè okpukpe dị nta otú a iwe? Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Brian Dunn na-eme ka a mata ihe atọ bụ́ isi: (1) Ndịàmà ịnọ ná mba nile, (2) mmegide ha na-emegide ịkpa ókè agbụrụ, na (3) ọnọdụ nnọpụiche ha n’ebe Ọchịchị dị. N’ihi echiche ha ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, Ndịàmà nọ na Germany jụrụ ikele ekele e ji eto Hitler, ịkwado òtù National Socialist Party, ma ọ bụ imesịa kere òkè n’ọrụ agha nke ndị Nazi.—Ọpụpụ 20:4, 5; Aịsaịa 2:4; Jọn 17:16.
N’ihi ya, Ndịàmà diri iyi egwu, ịgba ajụjụ ọnụ, nnyocha ụlọ, na mmaja ndị ọzọ site n’aka ndị uwe ojii na ndị SA (Sturmabteilung nke Hitler, ndị agha nzuzo nke ndị Nazi, ma ọ bụ ndị Afe Nchara Nchara). N’April 24, 1933, ndị isi jichiri ma mechie ụlọ ọrụ Watch Tower dị na Magdeburg, Germany. Mgbe nnyocha e leziri anya mee na-arụpụtaghị ihe àmà ọ bụla nke ime mpụ, n’ịbụkwa ndị nọ ná nrụgide site n’aka Ngalaba Gọọmenti Na-ahụ Maka Okwu Metụtara Mba Ọzọ nke United States, ndị uwe ojii nyeghachiri ha ụlọ ahụ. Otú ọ dị, ka ọ na-erule May 1933, a machibidoro Ndịàmà iwu n’ọtụtụ steeti ndị nọ n’okpuru Germany.
Ndịàmà Emee Ihe n’Obi Ike
N’oge mbụ a, Hitler ji nlezianya mee ka ọha na eze were ya dị ka onye na-akwado Iso Ụzọ Kraịst. O kwupụtara njikere ọ dị ịkwado nnwere onwe okpukpe, na-ekwe nkwa imeso òtù okpukpe dị iche iche nke ndị Kraịst “n’ikpe ziri ezi nke ezi uche dị na ya.” Iji meziwanye otú e si ele ya anya, onyeisi ala ọhụrụ ahụ gara na chọọchị dị iche iche. Nke a bụ n’oge mgbe ọtụtụ ndị nọ ná mba ndị ha na Germany ga-emesịa lụọ agha nọ na-ekwupụta mmasị ha n’ihe ndị Hitler rụzuru.
N’inwe nchegbu banyere ahụ erughị ala na-arị elu na Germany, Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, tinyere manija alaka ụlọ ọrụ dị na Germany, bụ́ Paul Balzereit, kpebiri inwe otu mkpọsa iji mee ka Chancellor Hitler, ndị ọrụ gọọmenti, na ọha na eze mata na Ndịàmà Jehova abụghị ihe iyi egwu nye ndị Germany na Ọchịchị. Dị ka ihe àmà gosiri Rutherford kwenyere na Hitler amaghị banyere mwakpo a na-awakpo Ndịàmà Jehova ma ọ bụ na ndị okpukpe agwawo ya ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Ndịàmà.
Ya mere, ụlọ ọrụ Magdeburg haziri otu mgbakọ iji jiri ikike ụmụ amaala Germany nwere ime mkpesa mee ihe. N’ime mkpirikpi oge, a kpọrọ Ndịàmà Jehova nọ ebe nile na Germany òkù ịbịa na Wilmersdorfer Tennishallen dị na Berlin na June 25, 1933. A tụrụ anya ihe dị ka mmadụ 5,000. N’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ dịnụ, ihe karịrị 7,000 ji obi ike gaa. Ndị ahụ gara nakweere nkwupụta a kpọrọ “Nkwupụta nke Ihe Ndị Bụ Eziokwu.” Ihe odide a mere mkpesa megide ihe mgbochi ndị e tinyeworo n’ọrụ Ndịàmà. O kwuru ihe doro anya banyere nguzo ha ma mee ngọpụ n’ebubo nke iso ụdị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla jikọọ aka ịkpasu inupụrụ ọchịchị isi. O kwuru, sị:
“A na-ebo anyị ebubo n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihu ndị na-achị achị nke gọọmenti a . . . Anyị ji nkwanye ùgwù na-arịọ ndị na-achị mba a na ndị obodo ka ha jiri ikpe ziri ezi na eleghị mmadụ anya n’ihu tụlee nkwupụta e mere n’ebe a nke ihe ndị bụ eziokwu.”
“Anyị na onye ọ bụla ma ọ bụ ndị nkụzi okpukpe enweghị esemokwu, kama anyị aghaghị ịdọrọ uche gaa n’eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụkarị ndị ahụ na-azọrọ na ha na-anọchite anya Chineke na Kraịst Jisọs bụ n’ezie ndị na-akpagbu anyị na ndị na-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere anyị n’ihu gọọmenti.”
Mgbakọ Obi Ike Ka Ọ̀ Bụ nke Imebi Okwukwe?
Ụfọdụ na-ekwu ugbu a na mgbakọ Berlin ahụ nke 1933 na “Nkwupụta nke Ihe Ndị Bụ Eziokwu” ahụ bụ mgbalị nke Ndịàmà a ma ama mere igosi nkwado maka ọchịchị ndị Nazi na ịkpọasị ọ kpọrọ ndị Juu. Ma ihe ndị ha kwuru abụghị eziokwu. Ha sitere n’amaghị ihe merenụ na nghọtahie nke ihe ndị bụ eziokwu.
Dị ka ihe atụ, ndị nkatọ na-ekwu na Ndịàmà ji ọkọlọtọ swastika chọọ Wilmersdorfer Tennishallen mma. Foto ndị e sere ná mgbakọ 1933 ahụ na-egosi n’ụzọ doro anya na ha etinyeghị swastika n’ụlọ nzukọ ahụ. Ndị hụrụ ihe merenụ kwadoro na ọ dịghị ọkọlọtọ dị n’ime ụlọ.
Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na e nwere ọkọlọtọ n’èzí nke ụlọ ahụ. Ndị agha Nazi jiri ụlọ nzukọ ahụ mee ihe na June 21, bụ́ Wednesday bu ụzọ tupu mgbakọ ahụ. Mgbe ahụ, kpọmkwem na chi fotere ụbọchị mgbakọ ahụ, ìgwè ndị na-eto eto na ìgwè ndị SS (Schutzstaffel, ndị bụbu ndị Afe Ojii na-eche Hitler nche), SA, na ndị ọzọ, mere ememe etiti oge okpomọkụ na nso nso ebe ahụ. Ya mere Ndịàmà na-abịa mgbakọ Sunday ahụ pụrụ ịhụworị ụlọ e ji ọkọlọtọ swastika chọọ mma.
A sị na e nwere ọkọlọtọ swastika e ji chọọ èzí, paseej, ma ọ bụ ọbụna ime ụlọ nzukọ ahụ mma, Ndịàmà gaara ahapụ ha. Ọbụna taa, mgbe Ndịàmà Jehova gbaziiri ihe owuwu ọha na eze maka nzukọ na mgbakọ, ha adịghị ewepụ ihe nnọchianya mba. Ma e nweghị ihe àmà gosiri na Ndịàmà ahụ ji aka ha konye ọkọlọtọ ọ bụla ma ọ bụ na ha kelere ha.
Ndị nkatọ na-ekwukwa na Ndịàmà ahụ ji ukwe ito mba nke Germany malite mgbakọ ahụ. N’ezie, mgbakọ ahụ ji “Olileanya Dị Ebube nke Zaịọn,” Abụ nke 64 n’akwụkwọ abụ okpukpe nke Ndịàmà malite. E tinyere okwu abụ a n’egwú nke Joseph Haydn rọrọ na 1797. Abụ nke 64 dịbu adị n’akwụkwọ abụ nke Ndị Mmụta Bible ma ọ dịghị ihe ọzọ kemgbe 1905. Na 1922 gọọmenti mba Germany nakweere uri olu ụtọ Haydn nke nwere okwu ndị Hoffmann von Fallersleben dere dị ka ukwe ito mba ha. Ka o sina dị, Ndị Mmụta Bible nọ na Germany ka na-abụ Abụ nke 64 ha mgbe ụfọdụ, dị ka Ndị Mmụta Bible ná mba ndị ọzọ na-emekwa.
Ọ dịghị otú a ga-esi were ịbụ abụ banyere Zaịọn dị ka mgbalị ime ka obi jụrụ ndị Nazi. N’okpuru nrụgide sitere n’aka ndị Nazi na-emegide ndị Juu, chọọchị ndị ọzọ wepụrụ okwu Hibru ndị dị ka “Juda,” “Jehova,” na “Zaịọn” n’ukwe na n’ememe okpukpe ha. Ndịàmà Jehova ewepụghị ha. N’ezie ndị haziri mgbakọ ahụ, atụghị anya, mgbe ahụ, inweta ihu ọma gọọmenti site n’ịbụ abụ na-eto Zaịọn. Ikekwe, ọ pụrụ ịbụworị na o sighị ụfọdụ ndị garanụ n’obi ịbụ “Olileanya Dị Ebube nke Zaịọn,” ebe uri olu ụtọ nke egwú a Haydn rọrọ na ukwe ito mba ahụ bụ otu ihe ahụ.
Nkwupụta nke Ebumnobi
Ebe a na-agbanwe gọọmenti, mba ahụ nọrọkwa n’oké ọgba aghara, Ndịàmà chọrọ ime nkwupụta doro anya banyere nguzo ha. Site ná “Nkwupụta” ahụ, Ndịàmà gọpụrụ kpam kpam n’ebubo nile e boro ha bụ na ha na ndị Juu na-enwe mmekọrịta ego ma ọ bụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihi ya, ihe odide ahụ kwuru, sị:
“Ndị iro anyị na-ebo anyị ebubo ụgha na anyị enwetawo nkwado ego maka ọrụ anyị site n’aka ndị Juu. Nke a bụ ọkpụrụkpụ ụgha. Ruo ugbu a ọ dịbeghị iberibe ego ndị Juu tụnyere n’ọrụ anyị.”
Ebe e kwuworo okwu ego, “Nkwupụta” ahụ gara n’ihu ịkatọ omume ndị na-ezighị ezi nke oké achụmnta ego. O kwuru, sị: “Ọ bụrụwo ndị Juu na-achụ nta ego n’alaeze ukwu Britain na America bụ ndị wuliteworo ma na-etinye aka n’Oké Azụmahịa dị ka ụzọ isi rigbuo ma megbuo ndị nke ọtụtụ mba.”
N’ụzọ doro anya okwu a ezoghị aka n’ebe ndị Juu nọ n’ozuzu ha, ọ dịkwa mwute ma ọ bụrụ na a ghọtahiewo ya, na ọ kpatawokwa mkpasu iwe ọ bụla. Ụfọdụ ekwuwo na Ndịàmà Jehova so kere òkè n’ibu iro e busoro ndị Juu bụ́ nke a kụziri na chọọchị ndị dị na Germany n’oge ahụ. Nke a abụghị eziokwu ma ọlị. Site n’akwụkwọ na n’àgwà ha n’oge ndị Nazi, Ndịàmà jụrụ echiche imegide ndị Juu ma katọọ mmeso ọjọọ ndị Nazi na-emeso ndị Juu. N’ezie, obiọma ha gosiri ndị Juu bụ́ ndị otu ihe ahụ dakwasịrị ha na ha n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche bụ ngọpụ siri ike n’ebubo ụgha a.
“Nkwupụta” ahụ kọwara ọrụ Ndịàmà dị ka nke okpukpe, na-ekwu, sị: “Nzukọ anyị adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụzọ ọ bụla. Anyị na-anọsi ike nanị n’ịkụziri ndị mmadụ Okwu Jehova Chineke.”
“Nkwupụta” ahụ chetakwaara gọọmenti nkwa ya. Ndịàmà kwadoro ụkpụrụ ụfọdụ ndị dị elu, ọ dabakwara na ndị a bụ ndị gọọmenti mba Germany kwadokwara n’ihu ọha. Ụkpụrụ ezinụlọ na nnwere onwe okpukpe so n’ime ndị a.
Banyere nke a, “Nkwupụta” ahụ gbakwụnyere, sị: “Nnyocha a kpachapụrụ anya mee n’akwụkwọ anyị ga-ekpughe eziokwu bụ́ na ụkpụrụ ndị ahụ dị elu gọọmenti na-achị mba ugbu a nwere ma tụpụta bụ ndị e depụtara ma kwadoo ma mesie ike ná mbipụta anyị dị iche iche, ọ na-egosikwa na Jehova Chineke ga-ahụ na mmadụ nile hụrụ ezi omume n’anya ga-eru ụkpụrụ ndị a dị elu mgbe oge ha ruru.”
N’ihi ya, ọ dịghị mgbe Ndịàmà kwupụtara nkwado maka òtù bụ́ Nazi Party. Ọzọkwa, n’iji nnwere onwe okpukpe ha mee ihe, ha ezubeghị ịkwụsị nkwusa ihu ọha ha.—Matiu 24:14; 28:19, 20.
Dị ka ihe ndekọ dị na 1974 Yearbook of Jehovah’s Witnesses si kwuo, ụfọdụ Ndịàmà bụ́ ndị Germany nwere ndakpọ olileanya na “Nkwupụta” ahụ agbapeghị ọnụ karị. Manija alaka ụlọ ọrụ, bụ́ Paul Balzereit, ò belatara ịdị ike nke ihe dị n’ihe odide ahụ? Ee e, n’ihi na iji ihe odide nke German tụnyere nke Bekee na-egosi na nke a abụghị ihe merenụ. Dị ka ihe àmà gosiri, echiche dị iche na nke ahụ dabeere n’ihe ndị ụfọdụ na-esoghị kpọmkwem ná nkwadebe nke “Nkwupụta” ahụ chere na ha hụrụ. Nkwubi okwu ha pụkwara ịbụ n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na Balzereit jụrụ okwukwe ya nanị afọ abụọ ka e mesịrị.
A maara ugbu a na a machibidoro Ndịàmà Jehova nọ na Germany iwu na Saturday, June 24, 1933, kpọmkwem ụbọchị bu ụzọ tupu mgbakọ Berlin ahụ. Ndị dokwara ka e nwee mgbakọ ahụ na ndị uwe ojii nụrụ maka mmachibido iwu a ụbọchị ole na ole ka e mesịrị. N’ihi ọnọdụ ahụ erughị ala na ibu iro doro anya nke ndị isi ndị Nazi, ọ dị ịrịba ama na e nwedịrị mgbakọ ahụ enwe. Ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ikwu na Ndịàmà 7,000 ji obi ike tinye nnwere onwe ha n’ihe ize ndụ site n’ịga mgbakọta ahụ.
Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, Ndịàmà kesara nde 2.1 nke “Nkwupụta” ahụ. A nwụchiri ụfọdụ Ndịàmà ozugbo ma ziga ha n’ogige ọrụ mmanye. Otú a, ọchịchị Nazi kpughere n’ụzọ zuru ezu ọdịdị mmegbu, nke ime ihe ike ya, n’oge na-adịghịkwa anya wakwasị ìgwè ndị Kraịst a dị nta n’eleghị anya n’azụ.
Prọfesọ Christine King dere, sị: “Ike obi ọjọọ apụghị ịbịada Ndịàmà, ndị Nazi ga-achọpụta ya.” Ọ bụ dị ka “Nkwupụta” ahụ kwuru: “Ike Jehova Chineke kasị, ọ dịghịkwa ike pụrụ iguzogide ya.”a
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ohere ekweghị anyị depụtazuo akụkọ a mere eme. Otú ọ dị, a pụrụ inweta ndepụta nke izo aka zuru ezu ma a rịọ maka ya site n’aka ndị bipụtara ya. Ị pụkwara ịhụ ya dị ka ihe na-enye ihe ọmụma ikiri ntụle na-enye ihe ọmụma nke kaseti vidio a kpọrọ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault.
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Foto ndị e sere kpọmkwem ná mgbakọ ahụ Ndịàmà Jehova jere na 1933 na Tennishallen