1 Ihe E Mere
6 Ụmụ Livaị+ bụ Geshọn,+ Kohat+ na Meraraị.+ 2 Ụmụ Kohat bụ Amram+ na Izha+ na Hibrọn+ nakwa Ọziel.+ 3 Ụmụ Amram+ bụ Erọn+ na Mozis,+ nakwa Miriam.+ Ụmụ Erọn bụ Nedab+ na Abaịhu+ na Elieza+ nakwa Ịtama.+ 4 Ma Elieza+ mụrụ Finihas.+ Finihas amụọ Abishua.+ 5 Abishua amụọ Bọkaị; Bọkaị amụọ Ọzaị.+ 6 Ọzaị amụọ Zerahaya; Zerahaya amụọ Mereyọt.+ 7 Mereyọt amụọ Amaraya; Amaraya amụọ Ahaịtọb.+ 8 Ahaịtọb amụọ Zedọk;+ Zedọk amụọ Ahimaz.+ 9 Ahimaz amụọ Azaraya. Azaraya amụọ Johenan. 10 Johenan amụọ Azaraya.+ Ọ bụ ya rụrụ ọrụ dị ka onye nchụàjà n’ụlọ ahụ Sọlọmọn wuru na Jeruselem.
11 Azaraya wee mụọ Amaraya.+ Amaraya wee mụọ Ahaịtọb.+ 12 Ahaịtọb amụọ Zedọk.+ Zedọk amụọ Shalọm. 13 Shalọm amụọ Hilkaya.+ Hilkaya amụọ Azaraya. 14 Azaraya amụọ Seraya.+ Seraya amụọ Jehọzadak.+ 15 A dọọrọ Jehọzadak n’agha mgbe Jehova mere ka Nebukadneza dọrọ Juda na Jeruselem n’agha.
16 Ụmụ Livaị+ bụ Geshọm, Kohat na Meraraị. 17 Ndị a bụ aha ụmụ Geshọm: Libnaị+ na Shimiaị.+ 18 Ụmụ Kohat+ bụ Amram+ na Izha na Hibrọn na Ọziel.+ 19 Ụmụ Meraraị bụ Malaị na Mushaị.+
Ndị a bụ ezinụlọ dị iche iche nke ndị Livaị dị ka ụlọ ndị nna nna ha si dị:+ 20 N’ezinụlọ Geshọm, Libnaị+ nwa ya mụrụ Jehat, Jehat amụọ Zima, 21 Zima amụọ Joa,+ Joa amụọ Ido, Ido amụọ Zira, Zira amụọ Jeateraị. 22 Kohat mụrụ Aminadab, Aminadab amụọ Kora,+ Kora amụọ Asia nwa ya, 23 Elkena nwa ya na Ebayasaf+ nwa ya, Ebayasaf amụọ Asia; 24 Asịa amụọ Tehat, Tehat amụọ Yurayel, Yurayel amụọ Ọzaya, Ọzaya amụọ Sheọl. 25 Ụmụ Elkena+ bụ Amesaị na Ahaịmọt. 26 Ma ụmụ Elkena bụ Zofaị+ nwa ya na Nehat nwa ya, 27 Nehat amụọ Elayab,+ Elayab amụọ Jeroham, Jeroham amụọ Elkena.+ 28 Ụmụ Samuel+ bụ Joel bụ́ ọkpara ya na Abaịja+ nwa ya nke abụọ. 29 Meraraị mụrụ Malaị,+ Malaị amụọ Libnaị, Libnaị amụọ Shimiaị, Shimiaị amụọ Ọza, 30 Ọza amụọ Shimia, Shimia amụọ Hagaya, Hagaya amụọ Asaya.
31 Ndị a bụ ndị Devid+ nyere ọrụ ka ha na-eduzi ịbụ abụ n’ụlọ Jehova mgbe e debesịrị Igbe ahụ n’ebe ọ ga na-adị.+ 32 Ha wee bụrụ ndị na-eje ozi,+ bụ́ ndị na-abụ abụ+ n’ihu ụlọikwuu, ya bụ, ụlọikwuu nzute, ruo mgbe Sọlọmọn wuru ụlọ Jehova na Jeruselem;+ ha wee na-eje ozi ha dị ka ọrụ e nyere ha si dị.+ 33 Ọ bụ ndị a bụ ndị na-eje ozi, ha na ụmụ ha: Site n’ụmụ Kohat, Himan+ onye ọbụ abụ, nwa Joel,+ nwa Samuel,+ 34 nwa Elkena,+ nwa Jeroham, nwa Iliel,+ nwa Toa, 35 nwa Zọf,+ nwa Elkena, nwa Mehat, nwa Amesaị, 36 nwa Elkena, nwa Joel, nwa Azaraya, nwa Zefanaya, 37 nwa Tehat, nwa Asia, nwa Ebayasaf,+ nwa Kora,+ 38 nwa Izha,+ nwa Kohat, nwa Livaị, nwa Izrel.
39 Ma nwanne ya bụ́ Esaf+ na-eje ozi n’aka nri ya. Esaf bụ nwa Berekaya,+ nwa Shimia, 40 nwa Maịkel, nwa Baasiya, nwa Malkaịja, 41 nwa Etnaị, nwa Zira, nwa Adaya, 42 nwa Itan, nwa Zima, nwa Shimiaị, 43 nwa Jehat,+ nwa Geshọm,+ nwa Livaị.
44 Ma ụmụ Meraraị,+ bụ́ ụmụnne ha ndị na-anọ n’aka ekpe, bụ Itan+ nwa Kishaị,+ nwa Abdaị, nwa Malọk, 45 nwa Hashabaya, nwa Amazaya, nwa Hilkaya, 46 nwa Amzaị, nwa Benaị, nwa Shima, 47 nwa Malaị, nwa Mushaị,+ nwa Meraraị,+ nwa Livaị.
48 Ụmụnne ha bụ́ ndị Livaị+ bụ ndị e nyere maka ozi+ niile a na-eje n’ụlọikwuu, ya bụ, n’ụlọ ezi Chineke. 49 Erọn+ na ụmụ ya na-esure ihe nsure ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ+ nakwa n’elu ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ iji na-arụ ọrụ niile metụtara ihe ndị kasị nsọ nakwa iji na-ekpuchiri+ Izrel mmehie ha,+ dị ka ihe niile Mozis bụ́ ohu Chineke nyere n’iwu si dị. 50 Ndị a bụ ụmụ Erọn:+ Ọ mụrụ Elieza,+ Elieza amụọ Finihas,+ Finihas amụọ Abishua,+ 51 Abishua amụọ Bọkaị, Bọkaị amụọ Ọzaị, Ọzaị amụọ Zerahaya,+ 52 Zerahaya amụọ Mereyọt,+ Mereyọt amụọ Amaraya, Amaraya amụọ Ahaịtọb,+ 53 Ahaịtọb amụọ Zedọk,+ Zedọk amụọ Ahimaz.+
54 Ọ bụ n’ebe ndị a ka ha bi, n’ebe dị iche iche ha mara ụlọikwuu ndị e ji mgbidi gbaa gburugburu n’ókèala ha,+ ndị e nyere ụmụ Erọn bụ́ ndị si n’ezinụlọ Kohat,+ n’ihi na ọ bụ ha ka nza daara. 55 E wee nye ha Hibrọn+ nke dị n’ala Juda na ala ịta ahịhịa niile gbara ya gburugburu. 56 E nyekwara Keleb+ nwa Jefọne+ ala ubi obodo ahụ na obodo nta ya dị iche iche.+ 57 E nyekwara ụmụ Erọn obodo mgbaba dị iche iche,+ bụ́ Hibrọn,+ nakwa Libna+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Jatia+ na Eshtemoa+ na ala ịta ahịhịa ya, 58 na Haịlen+ na ala ịta ahịhịa ya, Diba+ na ala ịta ahịhịa ya, 59 na Eshan+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Bet-shimesh+ na ala ịta ahịhịa ya; 60 site n’ebo Benjamin, e nyekwara ha Giba+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Alemet+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Anatọt+ na ala ịta ahịhịa ya. Obodo ha niile bụ́ ndị e nyere ezinụlọ ha dị iche iche dị iri na atọ.+
61 E si n’ezinụlọ nke ebo ọzọ, sikwa n’ọkara ebo ahụ, bụ́ ọkara ebo Manase, nye ụmụ Kohat fọdụrụnụ obodo iri+ site n’ife nza.
62 E si n’ebo Ịsaka+ nakwa n’ebo Asha+ nakwa n’ebo Naftalaị+ nakwa n’ebo Manase+ nke nọ na Beshan nye ụmụ Geshọm+ obodo iri na atọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
63 E si n’ebo Ruben+ nakwa n’ebo Gad+ nakwa n’ebo Zebulọn+ nye ụmụ Meraraị+ obodo iri na abụọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ site n’ife nza.
64 Ụmụ Izrel wee si otú a nye ndị Livaị+ obodo dị iche iche na ala ịta ahịhịa ha.+ 65 Sitekwa n’ife nza, ha si n’ebo ụmụ Juda+ nakwa n’ebo ụmụ Simiọn+ nakwa n’ebo ụmụ Benjamin+ nye ha obodo ndị a, bụ́ ndị ha kpọkwara aha.
66 Ụfọdụ n’ime ezinụlọ ụmụ Kohat wee nweta obodo ndị dị n’ókèala ha site n’ebo Ifrem.+ 67 Ha wee nye ha obodo mgbaba dị iche iche, bụ́ Shikem+ na ala ịta ahịhịa ya nke dị n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, nakwa Giza+ na ala ịta ahịhịa ya, 68 na Jọkmiam+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Bet-horọn+ na ala ịta ahịhịa ya, 69 nakwa Aịjalọn+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Gat-rimọn+ na ala ịta ahịhịa ya; 70 e sikwa n’ọkara ebo Manase nye ezinụlọ ụmụ Kohat fọdụrụnụ+ Ena+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Biliem+ na ala ịta ahịhịa ya.
71 Ha si n’ezinụlọ ọkara nke ebo Manase nye ụmụ Geshọm+ Golan+ nke dị na Beshan na ala ịta ahịhịa ya nakwa Ashtarọt+ na ala ịta ahịhịa ya; 72 ha sikwa n’ebo Ịsaka nye ha Kidesh+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Daberat+ na ala ịta ahịhịa ya, 73 nakwa Remọt+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Enem+ na ala ịta ahịhịa ya; 74 ha sikwa n’ebo Asha nye ha Meshal na ala ịta ahịhịa ya nakwa Abdọn+ na ala ịta ahịhịa ya, 75 nakwa Hukọk+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Rihọb+ na ala ịta ahịhịa ya; 76 ha sikwa n’ebo Naftalaị+ nye ha Kidesh+ nke dị na Galili+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Hamọn na ala ịta ahịhịa ya nakwa Kiriateyim+ na ala ịta ahịhịa ya.
77 Ha si n’ebo Zebulọn+ nye ụmụ Meraraị fọdụrụnụ Rimọno+ na ala ịta ahịhịa ya, Tebọ na ala ịta ahịhịa ya, 78 ha sikwa n’ebo Ruben,+ n’ógbè Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan, nye ha Biza+ nke dị n’ala ịkpa, ya na ala ịta ahịhịa ya, nakwa Jehaz+ na ala ịta ahịhịa ya, 79 nakwa Kedemọt+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Mefat,+ ya na ala ịta ahịhịa ya; 80 ha sikwa n’ebo Gad+ nye ha Remọt+ nke dị na Gilied, ya na ala ịta ahịhịa ya, nakwa Mahaneyim+ na ala ịta ahịhịa ya, 81 nakwa Heshbọn+ na ala ịta ahịhịa ya nakwa Jeza+ na ala ịta ahịhịa ya.