Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Izu A
Julaị 28–Ọgọst 3
Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025 | Julaị

JULAỊ 28–ỌGỌST 3

ILU 24

Abụ nke 38 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike Maka Oge Nsogbu

(Nkeji 10)

Na-amụtakwu ihe ka ị marakwuo ihe (Ilu 24:5; it-2 610 ¶8)

Ọ bụrụgodị na obi dara gị mbà, akwụsịla ime ihe ndị ị na-emebu n’ofufe Jehova (Ilu 24:10; w09 12/15 18 ¶12-13)

Otú anyị si hụ Jehova n’anya na okwukwe anyị nwere na-eme ka anyị na-emeri nsogbu ndị na-abịara anyị (Ilu 24:16; w20.12 15)

Ebe otu nwanna nwaanyị ọrịa ji aka ọjọọ na enyi ya ji obi ụtọ na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. O ji tablet ya na-egosi otu nwaanyị ihe n’ọnụ ụzọ ụlọ ya.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 24:27​—Gịnị ka ilu a na-akụziri anyị? (w09 10/15 12)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ilu 24:1-20 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ụka gị na ya na-akparịta biri tupu gị enwee ike izi ya ozi ọma. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)

6. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl, nyekwa ya kaadị maka ọmụmụ Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)

7. Okwu

(Nkeji 3) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 11​—Isiokwu: Chineke Si na Baịbụl Na-agwa Anyị Okwu. (th ihe ọmụmụ nke 6)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 99

8. Na-enyerenụ Ibe Unu Aka n’Oge Nsogbu

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ọrịa na-efe efe, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọgba aghara, agha, ma ọ bụ mkpagbu nwere ike ịmalite na mberede. N’oge nsogbu, Ndị Kraịst nọ n’ebe e nwere nsogbu na-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka ma na-agba ibe ha ume. Ma, ọ bụrụgodị na nsogbu emetụtaghị anyị, ahụhụ ụmụnna anyị na-ata na-ewute anyị, anyị na-emekwa ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nyere ha aka.​—1 Kọr. 12:25, 26.

Foto ndị na-egosi: Ebe ụmụnna si n’ụzọ dị iche iche na-enyere ụmụnna ibe ha aka. 1. Ụmụnna na-arụghachi Ụlọ Nzukọ Alaeze ọdachi na-emere onwe ya mebisịrị. 2. Ụmụnna ji obi ụtọ na-anabata otu nwanna nwaanyị na nwa ya nwaanyị gbatara ọsọ ndụ. 3. Otu nwanna nwaanyị na-etinye onyinye n’igbe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. 4. Ụmụnna buteere ụmụnna ibe ha gbatara ọsọ ndụ ihe ndị dị ha mkpa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. 5. Ụmụnna ndị wepụtara onwe ha butere mmiri ọṅụṅụ. 6. Otu nwanna na-ekpe ekpere.

Gụọ 1 Ndị Eze 13:6 na Jems 5:16b. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere ekpere ndị ohu Chineke na-ekpe maka ndị ọzọ ji akpa ezigbo ike?

Gụọ Mak 12:42-44 na 2 Ndị Kọrịnt 8:1-4. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enye ihe ọ bụla anyị nwere ike inye, ọ bụrụgodị na anyị enweghị ike inye ego buru ibu maka ọrụ zuru ụwa ọnụ ka e jiri nyere ụmụnna ndị nọ ná mkpa aka?

Kpọnye VIDIO Bụ́ Otú E Si Na-agba Ụmụnna Anyị Ume Mgbe A Machibidoro Ọrụ Anyị Iwu. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Gịnị na gịnị ka ụmụnna anyị mere iji nyere ụmụnna ha aka mgbe a machibidoro ọrụ anyị iwu n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop?

  • N’oge ahụ a machibidoro ọrụ anyị iwu, olee otú ụmụnna anyị si nọgide na-erube isi n’iwu e nyere Ndị Kraịst ka ha na-ezukọ ma na-agbarịta ibe ha ume?​—Hib. 10:24, 25

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 4-5

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 112 na Ekpere

Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2025 | Mee

Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 21: Julaị 28, 2025 ruo Ọgọst 3, 2025

14 Na-achọ Obodo nke Na-adịgide Adịgide

Isiokwu Ndị Ọzọ

Isiokwu niile dị na magazin a

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya