Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma nke ụmụ Kora.+ Abụ olu ụtọ.
49 Nụrụnụ, unu ndị niile.
Ṅaanụ ntị, unu ndị niile bi n’usoro ihe a,+
2 Unu ihe niile a kpọrọ mmadụ nakwa unu ụmụ mmadụ,
Ma ọgaranya ma ogbenye.+
5 Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’ụbọchị ihe ọjọọ,+
Mgbe njehie nke ndị chọrọ ka m daa gbara m gburugburu?+
6 Ndị na-atụkwasị obi n’ihe onwunwe ha,+
Ndị na-anyakwa isi n’ihi na akụnụba ha dị ukwuu,+
7 Ọ dịghị otu n’ime ha pụrụ ịnapụta nwanne ya ma ọlị,+
Ọ dịghịkwa nke pụrụ inye Chineke ihe mgbapụta maka ya;
8 (Ihe mgbapụta a ga-akwụ maka mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ+
Nke na ọ dịghị adị ruo mgbe ebighị ebi)
9 Ka o wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ghara ịbanye n’olulu.+
10 N’ihi na ọ na-ahụ na ọbụna ndị maara ihe na-anwụ,+
Ma onye nzuzu ma onye na-adịghị eche echiche na-ala n’iyi,+
Ha ga-ahapụkwara ndị ọzọ akụ̀ ha.+
11 Ihe ha chọrọ bụ ka ụlọ ha dịruo mgbe ebighị ebi,+
Ka ụlọikwuu ha dịgidekwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
Ha agụwo ala ha aha ha.+
12 Ma mmadụ apụghị ịnọgide na-adị ndụ n’agbanyeghị na a na-asọpụrụ ya;+
O yiri nnọọ anụ ọhịa ndị e gburu egbu.+
13 Nke a bụ ihe na-eme ndị dara iberiibe,+
Na ndị na-eṅomi ha, bụ́ ndị ọnụ ha na-etu na-atọ ụtọ. Sila.
14 Ha ga-aga Shiol dị ka atụrụ e du edu;+
Ọnwụ ga-edu ha dị ka atụrụ;+
Ndị ziri ezi ga-achị ha n’ụtụtụ,+
Ha ga-aka nká;+
Onye nke ọ bụla ga-aga Shiol, kama ịga n’ebe obibi dị elu.+