Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi Nihilọt. Abụ olu ụtọ Devid.
2 Eze m+ na Chineke m, biko, ṅaa ntị ná mkpu enyemaka m na-eti,+
n’ihi na ọ bụ gị ka m na-ekpeku ekpere.+
5 Ndị na-etu ọnụ agaghị eguzo n’ihu gị.+
Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị;+
6 Ị ga-ebibi ndị na-ekwu okwu ụgha.+
Jehova kpọrọ onye na-awụfu ọbara+ na onye na-aghọ aghụghọ+ asị.
7 Ma mụ onwe m, n’ihi obiọma* gị dị ukwuu,+
M ga-abata n’ụlọ gị,+
M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala n’ihi egwu m na-atụ gị.+
8 Jehova, biko, duo m n’ezi omume+ gị n’ihi na ndị iro gbara m gburugburu;+
Mee ka ụzọ gị dị larịị n’ihu m.+
9 N’ihi na ọ dịghị ihe si ha n’ọnụ a pụrụ ịtụkwasị obi;+
Ime afọ ha bụ nnọọ ahụhụ.+
Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;+
Ire ụtọ ka ha ji ekwu okwu.+
Atụmatụ ha ga-eme ka ha daa.+
Ka a chụsaa ha n’ihi na mmebi iwu ha dị ukwuu,+
N’ihi na ha nupụụrụ gị isi.+