Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Okooko Lili.+ Abụ ọma Devid.
69 Chineke, biko zọpụta m, n’ihi na mmiri na-achọ iri mkpụrụ obi m.+
2 Emikpuwo m n’ime apịtị miri emi, n’ebe ala m ga-azọkwasị ụkwụ na-adịghị.+
Abawo m n’ime ogbu mmiri,
Mmiri na-asọ asọ eburuwo m.+
3 Etigidela m mkpu, ike gwụ m;+
Olu agụwo m.
Anya m adịkwaghị ahụ ụzọ ebe m nọ na-echere Chineke m.+
4 Ndị kpọrọ m asị na nkịtị adịwo ọtụtụ ọbụna karịa ntutu isi m.+
Ndị chọrọ igbu m, ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha, adịwo ọtụtụ.+
M wee nye ha ihe m na-apụnaraghị apụnara.
5 Chineke, gị onwe gị maara nzuzu m,
E zonahụghị gị ikpe ọmụma m.+
6 Ekwela ka ihere m mee ndị nwere olileanya n’ebe ị nọ,+
Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
Chineke Izrel,+
Ekwela ka e menye ndị na-achọ gị ihere n’ihi m.+
7 N’ihi na a na-akọcha m n’ihi gị,+
Ihere ejuwo m ihu.+
8 Aghọwo m onye e kewapụrụ n’ebe ụmụnne m nọ,+
Aghọwokwa m onye mba ọzọ nye ndị nne ji mụ na ha.+
9 N’ihi na ekworo maka ụlọ gị eripịawo m,+
Eburuwo m nkọcha nke ndị mmadụ na-akọcha gị.+
10 M wee kwaa ákwá, mee ka mkpụrụ obi m buo ọnụ,+
Ma ọ ghọrọ ihe a ga-eji kọchaa m.+
11 Mgbe m ji ákwà iru uju mere uwe,
M wee ghọọrọ ha ihe e ji atụ ilu.+
12 Ndị nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá malitere ikwu banyere m,+
Abụkwa m onye ndị aṅụrụma ji agụ egwú.+
13 Ma ọ bụ gị, Jehova, ka m kpekuru ekpere, +
N’oge ị pụrụ ịnụrụ ya, Chineke.+
Za m n’ihi obiọma gị dị ukwuu, wee gosi na ị bụ onye nzọpụta n’eziokwu.+
14 Dọpụta m n’apịtị, ka m wee ghara imikpu.+
Biko, napụta m n’aka ndị kpọrọ m asị,+ dọpụtakwa m na mmiri dị ogbu.+
15 Ekwela ka iyi na-asọ asọ buru m,+
Ma ọ bụ, ka mmiri dị ogbu rie m,
Ma ọ bụ, ka olulu loo m.+
16 Jehova, biko, za m, n’ihi na obiọma gị dị mma.+
Chee ihu n’ebe m nọ dị ka ebere gị si dị ukwuu,+
17 Ewepụla ihu gị n’ebe ohu gị nọ.+
Za m ngwa ngwa n’ihi na m nọ n’oké ihe isi ike.+
18 Bịaruo mkpụrụ obi m nso, napụta ya;+
Napụta m n’ihi ndị iro m.+
19 Gị onwe gị maara nkọcha m na ihere m nakwa mweda n’ala m.+
Ndị niile na-ebuso m iro nọ n’ihu gị.+
20 Nkọcha etiwaala m obi, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta.+
Anọ m na-atụ anya ka mmadụ meere m ebere, ma ọ dịghị onye meere m ebere;+
Na-atụkwa anya ndị nkasi obi, ma o nweghị onye m hụrụ.+
21 Kama ha nyere m ahịhịa na-egbu mmadụ ka m taa,+
Ha nwakwara ime ka m ṅụọ mmanya gbara ụka mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ.+
22 Ka tebụl nke dị n’ihu ha ghọọ ọnyà,+
Ka ihe ọ bụla bụ́ maka ọdịmma ha ghọọkwa ọnyà.+
23 Ka anya gbaa ha ọchịchịrị ka ha ghara ịhụ ụzọ;+
Meekwa ka úkwù na-ama ha jijiji mgbe niile.+
24 Wụkwasị ha oké iwe gị,+
Ka iwe gị nke dị ọkụ bịakwasịkwa ha.+
25 Ka ebe ha mara ụlọikwuu nke nwere mgbidi tọgbọrọ n’efu;+
Ka onye ọ bụla ghara ibi n’ụlọikwuu ha.+
26 N’ihi na ha na-achụ onye gị onwe gị tiri ihe otiti ọsọ,+
Ha na-akọkwa akụkọ ihe mgbu nke ndị ị mapuru ahụ́.
27 Tụkwasị njehie ná njehie ha,+
Ka ha gharakwa ịbata n’ezi omume gị.+
28 Ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndị dị ndụ,+
Ka a gharakwa ide aha ha n’ebe e dere aha ndị ezi omume.+
29 Ma anọ m n’ahụhụ, ahụ́ dum na-egbukwa m mgbu.+
Chineke, biko, ka nzọpụta gị chebe m.+
30 M ga-eji abụ too aha Chineke,+
M ga-ejikwa ekele too ya.+
31 Nke a ga-atọ Jehova ụtọ karịa oké ehi,+
Karịa nwa oké ehi nwere mpi, nke ụkwụ ya wara njakpa.+
32 Ndị dị umeala n’obi ga-ahụ ya; ha ga-aṅụrị ọṅụ.+
Unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu dị ndụ.+
33 N’ihi na Jehova na-ege ndị ogbenye ntị,+
Ọ gaghịkwa eleghara ndị ya nọ n’ụlọ mkpọrọ anya.+
34 Ka eluigwe na ụwa too ya,+
Ka oké osimiri na ihe niile na-agagharị n’ime ya+ too ya.
35 N’ihi na ọ bụ Chineke ga-azọpụta Zayọn,+
Wuokwa obodo dị iche iche nke Juda;+
Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ, o wee ghọọ nke ha.+
36 Ọ bụkwa ụmụ ndị ohu ya ga-eketa ya,+
Ọ bụkwa ndị hụrụ aha ya n’anya ga-ebi n’ime ya.+