Ndị Ikpe
8 Ndị Ifrem wee sị ya: “Gịnị bụ ihe a i mere anyị, ị kpọghị anyị mgbe ị gara ibuso Midian agha?”+ Ha wee gbalịsie ike isesa ya okwu.+ 2 N’ikpeazụ, ọ sịrị ha: “Ihe a m mere ọ̀ haruru ka ihe unu mere?+ Ọ̀ bụ na mkpụrụ Ifrem ghọfọrọ aghọfọ+ adịghị mma karịa mkpụrụ vaịn Abi-iza+ ghọtara n’ubi? 3 Ọ bụ n’aka unu ka Chineke nyefere ndị isi Midian bụ́ Oreb na Zieb,+ ihe m mere ọ̀ haruru ka ihe unu mere?” Ọ bụ mgbe o kwuru ihe a ka mmụọ ha dajụrụ.+
4 E mesịa, Gidiọn bịarutere Jọdan, gafee ya, ya na narị ndị ikom atọ so ya, ike gwụrụ ha ma ha nọ na-achụ ndị iro ha. 5 O wee sị ndị Sọkọt:+ “Biko, nyenụ ndị a so m+ achịcha, n’ihi na ike gwụrụ ha, m na-achụkwa Ziba+ na Zalmọna,+ bụ́ ndị eze Midian.” 6 Ma ndị isi Sọkọt sịrị ya: “Ì jidewo Ziba na Zalmọna, nke mere anyị ga-eji nye ndị agha gị achịcha?”+ 7 Gidiọn wee sị ha: “N’ihi ya, mgbe Jehova nyefere Ziba na Zalmọna n’aka m, m ga-eji ogwu ala ịkpa na ụ̀gà tirụsịa unu ahụ́.”+ 8 O wee si n’ebe ahụ garuo Penuel+ ma gwa ha otu ihe ahụ, ma ndị Penuel zara ya dị ka ndị Sọkọt zara. 9 N’ihi ya, ọ gwara ndị Penuel, sị: “Mgbe m lọtara n’udo, m ga-akwatu ụlọ elu a.”+
10 Ma Ziba na Zalmọna+ nọ na Kakọ, ha na ndị agha ha, ihe dị ka puku mmadụ iri na ise, bụ́ ndị fọdụrụ n’ime ndị agha niile si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ;+ ndị e gburula egbu dị narị puku ndị ikom na iri puku abụọ bụ́ ndị na-ebu mma agha.+ 11 Gidiọn sooro ụzọ ndị bi n’ụlọikwuu na-esikarị wee gawa n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Noba na Jọg-beha+, o wee malite ibuso ndị agha ahụ agha mgbe ndị agha ahụ na-anọghị na nche.+ 12 Mgbe Ziba na Zalmọna gbawara ọsọ, ọ chụwara ha ozugbo wee nwụde ndị eze Midian abụọ ahụ, bụ́ Ziba na Zalmọna;+ o wee mee ka oké ụjọ jide ndị agha ahụ niile.
13 Gidiọn nwa Joash wee si n’ụzọ gara Hires na-alọta n’agha ahụ. 14 Mgbe ọ na-alọta, o jidere otu nwa okorobịa onye Sọkọt+ wee jụọ ya ajụjụ.+ O wee depụtara ya aha ndị isi nke Sọkọt+ na ndị okenye ya, ndị ikom iri asaa na asaa. 15 O wee gakwuru ndị Sọkọt, sị: “Leenụ Ziba na Zalmọna ndị unu ji maka ha kwaa m emo, sị, ‘Ì jidewo Ziba na Zalmọna nke mere anyị ga-eji nye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’”+ 16 O wee kpọrọ ndị okenye obodo ahụ, were ogwu nke si n’ala ịkpa na ụ̀gà mesie ndị Sọkọt ike.+ 17 Ọ kwatukwara+ ụlọ elu ahụ dị na Penuel,+ wee gbuo ndị obodo ahụ.
18 O wee sị Ziba na Zalmọna:+ “Olee otú ndị ahụ unu gburu na Tebọ+ dị?” Ha wee sị ya: “Otú a ị dị ka onye ọ bụla n’ime ha dị, ha yiri ụmụ eze.” 19 O wee sị ha: “Ha bụ ụmụnne m, nne ji mụ na ha. Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, a sị na unu hapụrụ ha ndụ, m garaghị egbu unu.”+ 20 O wee gwa Jita ọkpara ya, sị: “Bilie, gbuo ha.” Ma nwa okoro ahụ amịpụtaghị mma agha ya, n’ihi na egwu na-atụ ya, n’ihi na ọ ka bụ nwata.+ 21 Ziba na Zalmọna wee sị: “Bilie n’onwe gị gbuo anyị, n’ihi na otú nwoke hà ka ike ya+ hà.” Gidiọn wee bilie gbuo+ Ziba na Zalmọna, werekwa ihe ịchọ mma yiri ọnwa nke dị n’olu kamel ha.
22 Mgbe e mesịrị, ndị Izrel sịrị Gidiọn: “Chịwa anyị,+ gị na nwa gị na nwa nwa gị, n’ihi na ị zọpụtawo anyị n’aka Midian.”+ 23 Ma Gidiọn sịrị ha: “Mụ onwe m agaghị achị unu, nwa m agaghịkwa achị unu.+ Ọ bụ Jehova ga-achị unu.”+ 24 Gidiọn wee sị ha: “Ka m rịọ unu otu ihe: Onye ọ bụla n’ime unu nye m ọla imi+ ọ lụtara n’agha.” (N’ihi na ha nwere ọla imi e ji ọlaedo mee, n’ihi na ha bụ ndị Ishmel.)+ 25 Ha wee sị ya: “Anyị ga-enye gị ya.” Ha wee gbasaa ákwà mgbokwasị, onye ọ bụla wee na-atụnye ọla imi ọ lụtara n’agha n’ime ya. 26 Ọla imi ọlaedo ọ rịọtara dị otu puku shekel ọlaedo na narị asaa n’ịdị arọ, n’agụnyeghị ihe ịchọ mma ahụ yiri ọnwa+ na iyeri ntị na ákwà e ji ajị anụ e sijiri odo odo+ mee, nke ndị eze Midian yi, n’agụnyeghị ihe olu kamel ha nya.+
27 Gidiọn wee jiri ya mee efọd,+ debekwa ya n’ihu ọha n’obodo ya bụ́ Ọfra;+ Izrel dum wee malite iso ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ n’ebe ahụ,+ o wee ghọọrọ Gidiọn na ezinụlọ ya ọnyà.+
28 Otú a ka e si merie ndị Midian+ n’ihu ụmụ Izrel, ha eseliteghịkwa isi ha ọzọ; ala ahụ enweghịkwa nsogbu ọzọ ruo afọ iri anọ n’ụbọchị Gidiọn.+
29 Jerọbel+ nwa Joash wee laa ma biri n’ụlọ ya.
30 Gidiọn wee mụọ ụmụ ndị ikom iri asaa,+ ndị si n’úkwù ya pụta, n’ihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom. 31 Ma iko ya nwaanyị nke bi na Shikem mụụrụ ya otu nwa nwoke. O wee gụọ ya Abimelek.+ 32 E mesịa, Gidiọn nwa Joash nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, e wee lie ya n’ebe e liri Joash nna ya n’Ọfra nke ndị Abi-iza.+
33 O wee ruo na ozugbo ọ nwụrụ, ụmụ Izrel na Bel malitekwara inwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ ha wee jiri Bel-birịt mere chi ha.+ 34 Ụmụ Izrel echetaghị Jehova Chineke ha,+ onye napụtara ha n’aka ndị iro gbara ha gburugburu;+ 35 ha egosighịkwa ezinụlọ Jerọbel, bụ́ Gidiọn, obiọma*+ iji kwụọ ya ụgwọ ihe ọma niile o meere Izrel.+