38 Otú ọ dị, ọ sịrị: “Nwa m agaghị eso unu gaa, n’ihi na nwanne ya nwoke anwụwo, ọ fọdụkwara naanị ya.+ Ọ bụrụ na ọ nwụọ n’ihe mberede n’ụzọ, unu ga-eme ka m jiri mwute gbadaruo Shiol+ n’isi awọ́ m.”
20 Anyị wee sị nna m ukwu, ‘Anyị nwere nna meworo agadi na nwa ọ mụrụ n’agadi ya, bụ́ ọdụdụ nwa+ ya. Ma nwanne ya anwụwo, o wee fọdụ naanị ya n’ime ndị nne ya mụrụ,+ nna ya hụkwara ya n’anya.’