35 Ụmụ ya ndị ikom niile na ụmụ ya ndị inyom niile wee na-ebili ịkasi ya obi,+ ma ọ nabataghị obi a na-akasi ya, na-asị:+ “N’ihi na m ga-eruwere nwa m uju ruo Shiol!” Nna ya wee na-akwara ya ákwá.
38 Otú ọ dị, ọ sịrị: “Nwa m agaghị eso unu gaa, n’ihi na nwanne ya nwoke anwụwo, ọ fọdụkwara naanị ya.+ Ọ bụrụ na ọ nwụọ n’ihe mberede n’ụzọ, unu ga-eme ka m jiri mwute gbadaruo Shiol+ n’isi awọ́ m.”
10 Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum+ mee ha, n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma+ ma ọ bụ amamihe+ adịghị na Shiol,+ ebe ị na-aga.+
14 “M ga-agbapụta ha n’aka Shiol;+ m ga-agbapụta ha n’aka ọnwụ.+ Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?+ Shiol,+ olee ebe mbibi ị na-eweta dị? A ga-ezopụ ọmịiko n’anya m.+
23 Gị onwe gị kwa, Kapaniọm,+ à ga-ebuli gị elu ruo n’eluigwe? Ị ga-agbadaru+ Hedis;+ n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ na Sọdọm ka a rụrụ ọrụ dị ike ndị a rụrụ n’ime gị, ọ gaara adịgide ruo taa.
13 Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ+ nọ n’ime ha, e kpekwara ha ikpe n’otu n’otu dị ka omume ha si dị.+