7 Unu esikwala n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ ka unu ghara ịnwụ,+ n’ihi na e tere unu mmanụ Jehova ji ete mmadụ mmanụ n’isi.”+ Ha wee mee ihe Mozis kwuru.
38 ya bụ, Jizọs onye Nazaret, otú Chineke si jiri mmụọ nsọ+ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ;+ n’ihi na Chineke nọnyeere ya.+
27 Ma mmanụ ahụ o tere+ unu onwe unu dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe;+ ma mmanụ ahụ o tere unu bụ eziokwu,+ ọ bụghị okwu ụgha, ọ na-akụzikwara unu ihe niile.+ Dị ka ọ kụziiri unu, unu na ya dịrị n’otu.+