17 aghaghị m ịgọzi gị, aghaghịkwa m ime ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri;+ mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá ndị iro ya.+
4 ‘M ga-eme ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe, m ga-enyekwa mkpụrụ gị ala a niile;+ ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha,’+
11 Chineke wee gwakwa ya, sị: “Abụ m Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba. Mba dị iche iche na ìgwè mba dị iche iche ga-esikwa na gị pụta, ndị eze ga-esikwa n’úkwù gị pụta.+