24 Akpọrọla chi ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, emekwala ihe ọ bụla ga-eyi ihe niile ha rụrụ,+ kama ị ghaghị ịkwatu ha, ị ghaghịkwa ịkụtu ogidi+ nsọ ha.
3 Unu ga-akwatukwa ebe ịchụàjà+ ha ma kụrisịa ogidi nsọ ha,+ unu ga-akpọkwa ogwe osisi ha dị nsọ ọkụ+ ma kwatusịa ihe oyiyi a pịrị apị+ nke chi ha, unu ga-ekpochapụkwa aha ha n’ebe ahụ.+
25 O wee ruo n’abalị ahụ na Jehova gara n’ihu ịsị ya: “Were nwa oké ehi, bụ́ nwa oké ehi nna gị, ya bụ, nwa oké ehi nke abụọ dị afọ asaa, kwatuokwa ebe ịchụàjà Bel+ nke nna gị, gbutuokwa ogwe osisi dị nsọ nke dị ya n’akụkụ.+
4 Ọ bụ ya wepụrụ ebe ndị dị elu,+ kụrisịa ogidi nsọ+ ma gbutuo ogwe osisi dị nsọ,+ gwerisịakwa agwọ ọla kọpa ahụ+ Mozis mere;+ n’ihi na ruo n’oge ahụ, ụmụ Izrel nọ na-esurere ya ihe nsure ọkụ,+ a nọkwa na-akpọ ya arụsị agwọ ọla kọpa.+