23 Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama anyị onwe anyị kwa bụ́ ndị nwere mkpụrụ mbụ+ ahụ, ya bụ, mmụọ ahụ, ee, anyị onwe anyị na-asụ ude+ n’ime onwe anyị, ebe anyị na-echeresi ike ka e doo anyị dị ka ụmụ,+ ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ anyị.
4 Ndị a bụ ndị na-ejighị ụmụ nwaanyị merụọ onwe ha;+ n’eziokwu, ha bụ ndị na-amaghị nwaanyị.+ Ndị a bụ ndị na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.+ E si n’etiti ụmụ mmadụ zụta+ ha dị ka mkpụrụ mbụ+ a zụtaara Chineke na Nwa Atụrụ ahụ,