31 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ndọba oriọna. Ị ga-akpụ ihe ndọba oriọna ahụ akpụ.+ Ụkwụ ya, alaka ya, iko ya, isi ya nakwa ifuru ya ga-esi n’ahụ́ ya pụta.
2 N’ihi na a rụrụ nkebi mbụ dị n’ụlọikwuu ahụ,+ bụ́ ebe e nwere ihe ndọba oriọna+ na tebụl+ na achịcha+ e chere n’ihu Chineke; a na-akpọkwa ya “Ebe Nsọ.”+