20 Mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute, ha ga-eji mmiri ahụ saa aka na ụkwụ ha ka ha ghara ịnwụ, ma ọ bụ mgbe ha gara nso n’ebe ịchụàjà ahụ ije ozi iji sureere Jehova àjà a na-esure n’ọkụ.+
9 Ụlọikwuu a bụ ihe atụ+ maka oge a kara aka nke ruworo ugbu a,+ a ka na-enye onyinye ma na-achụ àjà otú ahụ.+ Otú ọ dị, ihe ndị a enweghị ike ime ka onye na-eje ozi dị nsọ nwee akọ na uche+ zuru okè,+
22 ka anyị jiri ezi obi na-abịaru nso, nwee obi ike zuru ezu na okwukwe, ebe e fesaworo mmiri dị ọcha n’obi anyị ka ọ ghara inwe ajọ akọ na uche,+ jirikwa ya sachaa ahụ́ anyị.+