5 Ibu ọnụ nke m chọrọ ò kwesịrị ịdị otú a, ya bụ, ụbọchị mmadụ na-emekpa mkpụrụ obi ya ahụ́,+ ụbọchị mmadụ na-ehulata isi ya dị ka ahịhịa amị, gbasaa ákwà iru uju, kposaakwa ntụ ka ha bụrụ ihe ndina ya?+ Ọ̀ bụ ihe a ka unu na-akpọ ibu ọnụ na ụbọchị dị Jehova mma?+
10 N’ihi na inwe mwute dị ka uche Chineke si dị na-eme ka e nwee nchegharị nke na-eduga ná nzọpụta nke a na-agaghị akwara ụta;+ ma mwute nke ụwa na-arụpụta ọnwụ.+