17 N’ihi ya, m na-asị, M ga-akpọpụta unu ná mmekpa ahụ́+ ndị Ijipt na-emekpa unu wee kpọga unu n’ala ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt+ na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt na ndị Jibọs,+ n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”’+
5 Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova kpọbatara gị n’ala ndị Kenan na nke ndị Het na nke ndị Amọraịt na nke ndị Haịvaịt na nke ndị Jibọs,+ bụ́ nke ọ ṅụụrụ nna nna gị hà iyi inye gị,+ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ mgbe ahụ ị ga-eme ememme a n’ọnwa a.
2 “Gaa jiri oké olu gwa Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Echetara m nke ọma obiọma* i nwere n’oge ị bụ nwa agbọghọ+ na ịhụnanya i nwere n’oge m kwere nkwa ịlụ gị,+ na otú i si na-eso m n’ala ịkpa, n’ala a na-aghaghị mkpụrụ ọ bụla.+