40 N’ihi na nke a bụ uche Nna m, na onye ọ bụla nke na-ahụ Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya ga-enwe ndụ ebighị ebi,+ m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”+
17 n’ihi na ọ bụ na ya ka a na-ekpughe ezi omume nke Chineke+ n’ihi okwukwe+ mmadụ nwere, nke na-eme ka o nwekwuo okwukwe, dị nnọọ ka e dere, sị: “Ma onye ezi omume ga-esi n’okwukwe dị ndụ.”+