11 Jehova ga na-edu+ gị mgbe niile,+ na-enyejukwa mkpụrụ obi gị afọ ọbụna n’ala kpọrọ nkụ,+ ọ ga-emekwa ka ọkpụkpụ gị dị ike;+ ị ga-adịzi ka ubi nke mmiri na-ede nke ọma,+ dịkwa ka isi mmiri, nke mmiri ya na-adịghị ata ata.
12 Ha ga-abịa tie mkpu ọṅụ n’ebe dị elu na Zayọn,+ ihu ha ga na-egbuke egbuke n’ihi ịdị mma Jehova,+ n’ihi ọka* na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ na ụmụ ehi.+ Mkpụrụ obi ha ga-adịkwa ka ubi mmiri na-ede nke ọma,+ ha agakwaghị ahụsi anya ọzọ.”+