26 Jọshụa wee kwupụta ọbụbụ ọnụ n’oge ahụ, sị: “Ka onye ga-ebili wuo obodo a, bụ́ Jeriko, bụrụ onye a bụrụ ọnụ n’ihu Jehova. Ka ịtọ ntọala ya rie isi ọkpara ya, ka itinye ibo ụzọ ya riekwa isi ọdụdụ nwa ya.”+
24 Ihe taara ndị Izrel akpụ n’ụbọchị ahụ, n’agbanyeghịkwa nke ahụ, Sọl mere ka ha ṅụọ iyi,+ sị: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ga-eri ihe tupu anyasị bụ, ruokwa mgbe m ga-abọworị ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro m!” Ọ dịghịkwa onye ọ bụla detụrụ nri ire.+
31 “Mgbe mmadụ mehiere mmadụ ibe ya,+ onye ahụ e mehiere ewee mee ka ọ ṅụọ iyi ka iyi ọ ṅụrụ ree n’ahụ́ ya,+ o wee buru iyi ahụ e mere ka ọ ṅụọ bịa n’ihu ebe ịchụàjà gị dị n’ụlọ a,