12 N’ụbọchị mbụ nke ememme achịcha na-ekoghị eko,+ mgbe ha na-achụ anụ e ji eme ememme ngabiga n’àjà dị ka omenala ha si dị, ndị na-eso ụzọ ya+ sịrị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị gaa kwadebe ka ị nọrọ rie nri ememme ngabiga?”+
7 Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+