3“‘Ọ bụrụ na àjà ya bụ àjà udo,+ ọ bụrụkwa na ọ ga-eweta ya site n’ìgwè ehi, ma ọ̀ bụ oké ma ọ bụ nne, ọ bụ nke ahụ́ dị mma+ ka ọ ga-eweta n’ihu Jehova.
39 “‘Ihe ndị a ka unu ga na-achụrụ Jehova n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu n’oge a kara aka,+ ma e wezụga onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu ga na-achụ n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ+ unu na àjà ọka+ unu na àjà ihe ọṅụṅụ+ unu na àjà udo unu.’”+