10 “‘Nwoke ya na nwunye onye ọzọ kwara iko, ee, nwoke ya na nwunye mmadụ ibe ya kwara iko,+ a ghaghị igbu ya, a ga-egbu nwoke ahụ kwara iko, gbuokwa nwaanyị ahụ kwara iko.+
6 ka onye ọ bụla ghara iru n’ókè nke imebi ihe na ịmanye aka n’ihe ndị ruuru nwanna ya n’okwu a,+ n’ihi na ọ bụ Jehova na-enye ntaramahụhụ maka ihe ndị a niile,+ dị nnọọ ka anyị gwara unu na mbụ, gbaakwara unu àmà nke ọma.+
4 Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ,+ n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.+