35 Ma mmụọ ozi Jehova sịrị Belam: “Soro ndị ikom ahụ gawa;+ ma ekwula ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga ihe m ga-agwa gị.”+ Belam wee soro ndị Belak mere ndị isi gawa.
5 Bikonụ, ndị m, chetanụ+ nkata Belak eze Moab kpara,+ nakwa ihe Belam nwa Biọ zara ya.+ Ọ bụ malite na Shitim+ ruo na Gilgal+ ka ihe a mere, ka e wee mara ọrụ ezi omume niile nke Jehova.”+