Ọpụpụ 1:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ha wee mee ka ndị isi ọrụ mmanye bụrụ ndị isi ha iji na-emegbu ha n’ibu arọ ha na-ebu;+ ha wee na-ewugasị obodo ịbụrụ Fero ebe nkwakọba ihe, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+ Diuterọnọmi 4:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Kama ọ bụ unu ka Jehova kpọọrọ ka ọ kpọpụta unu n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ n’Ijipt, ka unu bụrụ otu ndị ọ bụ naanị ya nwe+ dị ka ọ dị taa.
11 Ha wee mee ka ndị isi ọrụ mmanye bụrụ ndị isi ha iji na-emegbu ha n’ibu arọ ha na-ebu;+ ha wee na-ewugasị obodo ịbụrụ Fero ebe nkwakọba ihe, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+
20 Kama ọ bụ unu ka Jehova kpọọrọ ka ọ kpọpụta unu n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ n’Ijipt, ka unu bụrụ otu ndị ọ bụ naanị ya nwe+ dị ka ọ dị taa.