6 “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Abụ m Jehova, m ga-akpọpụta unu n’ibu arọ ndị Ijipt, napụtakwa unu n’ohu unu na-agbara ha,+ n’ezie, m ga-eji ogwe aka a gbatịrị agbatị na oké ikpe gbapụta unu.+
34 Ka Chineke ọ̀ nwara iji ihe nnwapụta,+ ihe ịrịba ama+ na ọrụ ebube+ na agha+ na aka dị ike+ na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ si n’etiti mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, dị ka ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu si dị?