15 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’ilezi anya debe iwu ya niile na ụkpụrụ ya ndị m na-enye gị taa, nkọcha a niile ga-abịakwasị gị ma chụkwute gị:+
10 N’ihi na ndị niile na-adabere n’ọrụ nke iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ; n’ihi na e dere, sị: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ọ bụla bụ, nke na-anọgideghị n’ihe niile e dere n’akwụkwọ mpịakọta nke Iwu ahụ ka o wee na-edebe ha.”+