6 Jehova bụ́ Chineke gị ga-ebikwa obi+ gị na obi ụmụ gị úgwù,+ ka i wee jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya maka ndụ gị.+
4 Bienụ onwe unu úgwù maka Jehova, biekwanụ obi unu úgwù,+ unu ndị Juda na ndị bi na Jeruselem; ka ọnụma m ghara inwuru dị ka ọkụ, o wee ree unu, n’enweghị onye ga-emenyụ ya, n’ihi omume ọjọọ unu.”+
29 Kama, ọ bụ onye bụ́ onye Juu n’obi bụ onye Juu,+ úgwù e biri ya bụkwa n’obi+ site na mmụọ, ọ bụghị site n’iwu e dere ede.+ Otuto+ onye ahụ na-abịa, ọ bụghị site n’aka mmadụ, kama site n’aka Chineke.+
3 N’ihi na ọ bụ anyị bụ ndị nwere ezi ibi úgwù,+ ndị na-eje ozi dị nsọ site na mmụọ Chineke,+ anyị jikwa Kraịst Jizọs anya isi,+ anyị enweghịkwa obi ike n’anụ ahụ́,+