23 N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ, n’ezie, ọ ga-akpọbata gị n’ala ndị Amọraịt na nke ndị Het na nke ndị Perizaịt na nke ndị Kenan, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs, m ga-ekpochapụkwa ha.+
9“Nụrụ, Izrel, ị na-agafe Jọdan+ taa ka ị banye wee napụ mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa gị ala ha,+ bụ́ nnukwu obodo ndị e wusiri ike ruo n’eluigwe,+