40 Debe ụkpụrụ ya+ na iwu ya nke m na-enye gị taa, ka ihe wee gaziere gị+ na ụmụ gị ndị ga-anọchi gị, nakwa ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị,+ mgbe niile.”
6“Ndị a bụ ihe e nyere n’iwu, ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị Jehova bụ́ Chineke unu nyere iwu ka a kụziere unu,+ ka unu wee debe ha n’ala ahụ unu na-agafe ebe ahụ ịga nweta;