9 “Naanị lezie anya, cheekwa mkpụrụ obi gị nche nke ọma,+ ka i wee ghara ichefu ihe ndị anya gị hụworo,+ ka ha gharakwa ịpụ n’obi gị n’ụbọchị niile nke ndụ gị;+ meekwa ka ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị mara ha,+
11 O wee ruo na ka ha si n’ihu Izrel na-agba ọsọ ma nọrọ ná mkpọda obodo Bet-horọn, Jehova mere ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé+ si n’eluigwe na-adagbu ha ruo Azika. Ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ gburu dị ọtụtụ karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha gbuo.
13 Anyanwụ wee guzo otu ebe, ọnwa akwụrụkwa otu ebe, ruo mgbe mba ahụ bọrọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya.+ Ọ̀ bụ na e deghị ya n’akwụkwọ Jesha?+ Anyanwụ wee kwụrụ otu ebe n’etiti eluigwe, ọ daghịkwa ngwa ngwa ruo ihe dị ka otu ụbọchị zuru ezu.+
40 Jọshụa wee bibie ala dum dị n’ógbè bụ́ ugwu ugwu,+ bibiekwa Negeb+ na Shefila+ na ebe ndị dị ná mkpọda+ nakwa eze ha niile. Ọ hapụghị onye ọ bụla ndụ, ihe niile na-eku ume+ ka o bibiri,+ dị ka Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere n’iwu.+
17 malite n’Ugwu Helak,+ nke dị ruo Sia,+ ruokwa Bel-gad+ nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, n’ala ala Ugwu Hemọn,+ ọ nwụdekwara ndị eze ha niile, gbuo ha.+