Ọpụpụ 23:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 M ga-eji nke nta nke nta chụpụ ha n’ihu gị, ruo mgbe ị mụrụ ọmụmụ wee bichie ala ahụ.+ Ọpụpụ 33:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 M ga-ezipụkwa mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ+ wee chụpụ ndị Kenan, ndị Amọraịt, na ndị Het na ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs;+ Ọpụpụ 34:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 “Ma gị onwe gị, debe ihe m na-enye gị n’iwu taa.+ Lee, m na-achụpụ ndị Amọraịt na ndị Kenan na ndị Het na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt na ndị Jibọs n’ihu gị.+ Diuterọnọmi 11:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Jehova ga-achụpụkwa mba ndị a niile n’ihi unu,+ unu ga-anapụkwa mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa unu ala ha.+
2 M ga-ezipụkwa mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ+ wee chụpụ ndị Kenan, ndị Amọraịt, na ndị Het na ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs;+
11 “Ma gị onwe gị, debe ihe m na-enye gị n’iwu taa.+ Lee, m na-achụpụ ndị Amọraịt na ndị Kenan na ndị Het na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt na ndị Jibọs n’ihu gị.+
23 Jehova ga-achụpụkwa mba ndị a niile n’ihi unu,+ unu ga-anapụkwa mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa unu ala ha.+